Ọnwụ na Ndụ Dị nʼIre
Okwu na ịnọpụ iche. Okwu bụ mmiri dị omimi na-ebu ọnwụ maọbụ ndụ, ọnụ onye nzuzu bụ ọnya nke ya, ịza ọsịsa tupu ige ntị bụkwa ihere. Ọ na-ahụ na onye bu ụzọ kọwaa okwu ya na-adị ka onye ziri ezi ruo mgbe a jụrụ ya ajụjụ, na nwanne e mejọrọ siri ike nwetaghachi.
18 1Onye na-ekewapụ onwe ya na-achụso ọchịchọ nke aka ya; ọ na-emegide amamihe niile zuru oke. 2Onye nzuzu adịghị enwe mmasị na nghọta, kama naanị nʼikwupụta echiche nke aka ya. 3Mgbe ajọ omume bịara, nleda anya na-abịakwa, ihere na-ewetakwa nkọcha. 4Okwu si nʼọnụ mmadụ bụ mmiri miri emi; isi iyi nke amamihe bụ iyi na-asọ asọ. 5Ọ dịghị mma ile mmadụ anya nʼihu, nye onye ajọ omume, na-agọnarị onye ezi omume ikpe ziri ezi. 6Egbugbere ọnụ onye nzuzu na-eweta esemokwu, ọnụ ya na-akpọkwa ihe otiti. 7Ọnụ onye nzuzu bụ ịla nʼiyi ya, egbugbere ọnụ ya bụkwa ọnyà nye mkpụrụ obi ya. 8Okwu onye asịrị dị ka iberibe nri a họọrọ ahọ; ha na-arịda ruo nʼime ime mmadụ. 9Onye na-ada mbà nʼọrụ ya bụ nwanne onye na-ebibi ihe. 10Aha Nna anyị bụ ụlọ elu siri ike; onye ezi omume na-agbaba nʼime ya, a na-echekwakwa ya. 11Akụ̀ ọgaranya bụ obodo e wusiri ike nke ya; nʼechiche ya ọ dị ka mgbidi dị elu. 12Tupu mbibi, obi mmadụ na-afụlị elu, ma ịdị umeala nʼobi na-ebu nsọpụrụ ụzọ. 13Ọ bụrụ na mmadụ aza okwu tupu ya ege ntị, ọ bụ enweghị uche ya na ihere ya. 14Mmụọ mmadụ pụrụ ịkwado ya nʼoge ọrịa, ma mmụọ e gwepịara agwepị—onye pụrụ ịnagide ya? 15Obi nwere nghọta na-enweta ihe ọmụma, ntị onye maara ihe na-achọsikwa ya ike. 16Onyinye mmadụ na-emeghere ya ụzọ, na-edubatakwa ya nʼihu ndị a ma ama. 17Onye mbụ kwuru okwu ikpe ya na-adị ka onye ziri ezi, ruo mgbe onye ọzọ ga-abịa nyochaa ya. 18Ife nza na-akwụsị esemokwu, na-ekewakwa ndị iro siri ike. 19Nwanne e kpasuru iwe siri ike idọta karịa obodo e wusiri ike, esemokwu dịkwa ka mkpọrọ igwe nke ebe e wusiri ike. 20Site na mkpụrụ si nʼọnụ mmadụ, afọ ya na-eju; site na mkpụrụ egbugbere ọnụ ya ka afọ na-eju ya. 21Ọnwụ na ndụ dị nʼike ire, ndị hụrụ ya nʼanya ga-erikwa mkpụrụ ya. 22Onye chọtara nwunye chọtara ihe ọma, na-anatakwa ihuọma site nʼaka Nna anyị. 23Onye ogbenye na-arịọ arịrịọ ebere, ma ọgaranya na-eji obi ike aza okwu. 24Nwoke nwere ọtụtụ ndị enyi pụrụ ịla nʼiyi, ma e nwere enyi nke na-arapara nso karịa nwanne.