Nna anyị na-anwale obi mmadụ
Ezinaụlọ ndị nọ nʼnrụgide: esemokwu nke ka mma ịhapụ karịa imeri, ohu nwere uche karịrị nwa nwoke na-eweta ihere, ụmụ ụmụ dịka okpueze nke agadi. Ọ na-ahụ ihe ịba mba na-eme, na-abanye nʼime onye nwere nghọta karịa otu narị ihe otiti nʼime onye nzuzu, ọ na-ejikwa enyi na-anọgide anọgide kpọrọ ihe.
17 1Ọ ka mma iri iberibe achịcha kpọrọ nkụ nʼudo karịa ụlọ jupụtara nʼoriri nke esemokwu dị na ya. 2Ohu nwere uche ga-achị nwa na-eweta ihere, ọ ga-ekekwa ihe nketa nʼetiti ụmụnne. 3Ite mgbaze bụ maka ọlaọcha, ebe a na-akpọ ọkụ bụ maka ọlaedo, ma Nna anyị na-anwale obi. 4Onye na-eme ihe ọjọọ na-ege ntị nʼegbugbere ọnụ ajọ omume; onye ụgha na-ege ntị nʼire na-ebibi ihe. 5Onye ọbụla na-akwa ogbenye emo na-akparị Onye kere ya; onye ọbụla na-aṅụrị ọṅụ maka ọdachi agaghị ahapụ ịta ya ahụhụ. 6Ụmụ ụmụ bụ okpueze nke ndị okenye, ebube ụmụaka bụ ndị mụrụ ha. 7Okwu mara mma ekwesịghị onye nzuzu—nke ka nke, egbugbere ọnụ ụgha ekwesịghị onyeisi a na-asọpụrụ. 8Ngarị dị ka ọgwụ dị ịtụnanya nʼanya onye na-enye ya; ebe ọbụla ọ chịgharịrị, ọ na-eche na ọ ga-enwe ihe ịga nke ọma. 9Onye na-ekpuchi njọ na-achọ ịhụnanya, ma onye na-ekwughachikarị ya na-ekewa ezigbo ndị enyi. 10Ịbara mba na-emetụ onye nwere nghọta nʼime karịa otu narị ihe otiti nye onye nzuzu. 11Nwoke nnupụisi na-achọ naanị ihe ọjọọ, a ga-ezitekwa onye ozi obi ọjọọ imegide ya. 12Ọ ka mma izute anụ ọhịa bea a napụrụ ụmụ ya karịa izute onye nzuzu nʼime enweghị uche ya. 13Ọ bụrụ na onye ọbụla eji ihe ọjọọ kwụọ ihe ọma, ihe ọjọọ agaghị ahapụ ụlọ ya ma ọlị. 14Ịmalite esemokwu dị ka imeghe ebe mmiri gbara, ya mere hapụ okwu ndọrọndọrọ tupu ọ gbawaa. 15Onye na-asị na onye ajọ omume bụ onye ezi omume, na onye na-ama onye ezi omume ikpe—ha abụọ niile bụ ihe arụ nʼanya Nna anyị. 16Gịnị mere onye nzuzu ga-eji nwee ego nʼaka iji zụta amamihe, ebe ọ na-enweghị obi ịmụta ihe? 17Enyi na-ahụ nʼanya mgbe niile, a mụkwara nwanne maka oge nsogbu. 18Onye na-enweghị uche na-ejide aka kwee nkwa, ọ na-etinyekwa onwe ya ka ọ bụrụ ihe mgbaama maka onye agbataobi ya. 19Onye hụrụ njehie nʼanya hụrụ esemokwu nʼanya; onye na-ewuli ọnụ ụzọ ama ya elu na-akpọ mbibi oku. 20Obi gbagọrọ agbagọ adịghị achọta ihe ọma, ire na-eme aghụghọ na-adaba na nsogbu. 21Onye mụrụ onye nzuzu na-ewetara onwe ya iru ụjụ; nna onye nzuzu na-adịghị enwe ọṅụ. 22Obi ọṅụ bụ ọgwụ dị mma, ma mmụọ e gwepịara agwepị na-eme ka ọkpụkpụ kpọnwụọ. 23Onye ajọ omume na-anara ngarị na nzuzo iji gbagọọ ụzọ ikpe ziri ezi. 24Onye nwere nghọta na-eche amamihe nʼihu ya, ma anya onye nzuzu na-akpagharị ruo nsọtụ ụwa. 25Nwa nzuzu bụ iru ụjụ nye nna ya, bụrụkwa ihe ilu nye nne mụrụ ya. 26Ịta onye ezi omume ahụhụ adịghị mma, ịpịa ndị a na-asọpụrụ ihe nʼihi izuoke ha adịghịkwa mma. 27Onye na-ejide okwu ya nwere ihe ọmụma, onye nwere mmụọ dị jụụ bụ onye nwere nghọta. 28Ọbụna onye nzuzu na-agba nkịtị ka a na-ewere dị ka onye maara ihe; mgbe o mechiri egbugbere ọnụ ya, ọ na-adị ka onye nwere nghọta.