Ndụmọdụ Nna anyị na-eguzosi ike
Ịda ogbenye na ọbụbụenyi, a kọrọ na-enweghị mmetụta obi efu: akụ na-amụba ndị enyi, ebe ọbụna ụmụnne onye ogbenye na-ezere ya. Nʼakụkụ nke ahụ bụ njide onwe, nʼihi na ezi uche na-eme ka mmadụ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ, a na-akpọkwa ileghara mmejọ anya ebube ya. Inye onye ogbenye ihe bụ ịgbazinye Nna anyị.
19 1Ogbenye na-eje ije nʼizuoke ya dị mma karịa onye okwu ya gbagọrọ agbagọ, bụrụkwa onye nzuzu. 2Ọzọkwa, ọchịchọ na-enweghị ihe ọmụma adịghị mma, onye na-eme ihe ngwangwa na-efu ụzọ. 3Enweghị uche nke mmadụ na-emebi ụzọ ya, ma obi ya na-ewe iwe megide Nna anyị. 4Akụ na-eweta ọtụtụ enyi, ma ekewapụrụ ogbenye site nʼebe enyi ya nọ. 5A gaghị ahapụ onye akaebe ụgha ka ọ ghara ịta ahụhụ, onye na-ekwu okwu ụgha agaghịkwa agbanarị ya. 6Ọtụtụ mmadụ na-achọ ihuọma onye mmesapụ aka, onye ọbụla bụkwa enyi onye na-enye onyinye. 7Ụmụnne ogbenye niile na-akpọ ya asị; ọ ka njọ na ndị enyi ya na-anọpụ ya anọpụ! Ọ na-akpọ ha oku, ma ha apụọla. 8Onye na-enweta amamihe hụrụ mkpụrụobi ya nʼanya; onye na-echekwa nghọta ga-achọta ihe ọma. 9A gaghị ahapụ onye akaebe ụgha ka ọ ghara ịta ahụhụ, onye na-ekwu okwu ụgha ga-alakwa nʼiyi. 10Ndụ okomoko ekwesịghị onye nzuzu—ọ ka adịghị mma na ohu ga-achị ụmụ eze. 11Uche ọma nke mmadụ na-eme ka ọ na-adị nwayọọ iwe iwe, ọ bụkwa ebube ya ileghara njehie anya. 12Oke iwe eze dị ka mkpu ọdụm, ma ihuọma ya dị ka igirigi nʼelu ahịhịa. 13Nwa nzuzu bụ mbibi nye nna ya, esemokwu nwunye dịkwa ka mmiri na-atụsị atụsị mgbe niile. 14Ụlọ na akụ bụ ihe nketa sitere nʼaka nna nna mmadụ, ma nwunye maara ihe si nʼaka Nna anyị. 15Umengwụ na-eme ka mmadụ daa nʼoke ụra, onye na-anọ nkịtị ga-agụkwa agụụ. 16Onye na-edebe iwu na-echekwa ndụ ya; onye na-eleda ụzọ ya anya ga-anwụ. 17Onye na-emesapụ aka nye ogbenye na-agbazinye Nna anyị ihe, Nna anyị ga-akwụghachikwa ya ụgwọ nʼihi omume ya. 18Dọọ nwa gị aka na ntị mgbe olileanya dị, etinyekwala obi gị nʼibibi ya. 19Onye na-ewe oke iwe aghaghị ịta ahụhụ; nʼihi na ọ bụrụ na ị napụta ya, ị ga-emeghachi ya ọzọ. 20Gee ntị na ndụmọdụ, nabatakwa ịdọ aka na ntị, ka ị wee nweta amamihe nʼụbọchị ndị na-abịa. 21Ọtụtụ ka atụmatụ dị nʼobi mmadụ, ma ọ bụ ndụmọdụ Nna anyị ga-eguzosi ike. 22Ihe a na-achọsi ike nʼime mmadụ bụ ịhụnanya ọgbụgba ndụ, ogbenye dịkwa mma karịa onye ụgha. 23Ịtụ egwu Nna anyị na-eduba na ndụ, onye nwere ya na-ezukwa ike nʼafọ ojuju, ihe ọjọọ agaghị emetụ ya. 24Onye umengwụ na-amịnye aka ya nʼime efere, ọ gaghịkwa ebughachi ya nʼọnụ ya. 25Tie onye na-akwa emo ihe, onye na-enweghị uche ga-amụta ịkpachara anya; baara onye nwere nghọta mba, ọ ga-enwetakwa ihe ọmụma. 26Onye na-emegbu nna ya ma na-achụpụ nne ya bụ nwa na-eweta ihere na nkọcha. 27Kwụsị ige ntị na ntụziaka, nwa m, ị ga-akpafukwa site nʼokwu ihe ọmụma. 28Onye akaebe na-abaghị uru na-akwa ikpe ziri ezi emo, ọnụ ndị ajọ omume na-elokwa ajọ ihe. 29A kwadebere ntaramahụhụ nye ndị na-akwa emo, na ihe otiti nye azụ ndị nzuzu.