Onyeisi Nchụaja Anyị, Onye Nọdụrụ Ala
Otu ahịrịokwu bu ya: onye isi nchụàjà anyị anọdụla ala. Ihe ọ na-ejere ozi abụghị oyiyi kama ezi ebe nsọ ahụ, ọgbụgba ndụ ọ na-ebutekwa bụ nke Jeremaya kwere na nkwa, ebe e dere iwu nʼuche na nʼobi, nke a na-agaghị echeta mmehie ọzọ, nke onye ọ bụla ga-amarakwa Nna anyị.
8 1Isi ihe nke a bụ nke a: anyị nwere onyeisi nchụaja dị otú ahụ, onye nọdụrụ ala nʼaka nri nke ocheeze nke Onye Dị Ebube nʼeluigwe. 2Onye na-eje ozi nʼebe nsọ ndị ahụ na nʼụlọ ikwu ahụ bụ ezie, nke Nna wuru, ọ bụghị mmadụ. 3A na-ahọpụta onyeisi nchụaja ọbụla ka o nye onyinye ma chụọ àjà; nʼihi ya, onye a kwesịkwara inwe ihe ọ ga-enye. 4Ọ bụrụ na ọ nọ nʼụwa, ọ garaghị abụ ọbụna onye nchụaja, ebe ndị ọzọ na-enye onyinye ahụ nʼokpuru iwu.
5Ha na-eje ozi nke bụ ihe nṅomi na onyinyo nke ihe eluigwe, dịka a dọrọ Mosis aka na ntị mgbe ọ chọrọ iwucha ụlọ ikwu ahụ, sị: “Lee,” o kwuru, “mee ihe niile dịka ụkpụrụ ahụ e gosiri gị nʼelu ugwu.”
6Ma ugbu a, Jisọs enwetala ozi dị elu karịa, ebe ọgbụgba ndụ nke ọ bụ onye ogbugbo ya ka mma, nke e guzobere nʼelu nkwa ndị karịrị mma. 7Nʼihi na ọ bụrụ na ọgbụgba ndụ mbụ ahụ enweghị ntụpọ, ọ garaghị adị mkpa ịchọ nke abụọ.
8Nʼihi na mgbe ọ chọpụtara mmejọ ha, ọ na-asị: “Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, ka Nna anyị kwuru, mgbe mụ na ụlọ Izrel na ụlọ Juda ga-agba ọgbụgba ndụ ọhụrụ. 9Ọ bụghị dịka ọgbụgba ndụ mụ na nna nna ha gbara nʼụbọchị m jidere ha nʼaka iji dupụta ha site nʼala Ijipt. Nʼihi na ha anọgideghị nʼọgbụgba ndụ m, nʼihi ya, m leghaara ha anya, ka Nna anyị kwuru. 10Nʼihi na nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị, ka Nna anyị kwuru: Aga m etinye iwu m nʼuche ha ma dee ha nʼobi ha, mụ onwe m ga-abụkwara ha Nna, ha ga-abụkwa ụmụ m. 11Onye ọbụla agaghịzikwa akụziri onye agbata obi ya, maọbụ onye ọbụla nwanne ya, na-asị, ‘Mara Nna anyị,’ nʼihi na ha niile ga-amara m, site nʼonye kacha nta nʼetiti ha ruo nʼonye kacha ukwu. 12Nʼihi na aga m emere ajọ omume ha ebere, agaghị m echetakwa mmehie ha ọzọ.”
13Mgbe o kwuru banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ, o meela ka nke mbụ bụrụ ihe mere ochie. Ihe meworo ochie ma na-aka nká dị nso ịla nʼiyi.