Sheba Nupụ Isi Megide Eze
Sheba fụrụ opi, ebo ndị dị n'ugwu wee pụọ. Joab ji mma agha zoro ezo gbuo Amasa n'okporo ụzọ, wee nọchibido Ebel. Otu nwanyị maara ihe kpọrọ oku n'elu mgbidi, jụọ ihe mere ọ ga-eji loo ihe nketa Nna anyị, wee kwekọrịta ka e were otu isi kama otu obodo.
20 1Otu nwoke na-abaghị uru aha ya bụ Sheba nwa Bikri, onye Benjamin, nọ nʼebe ahụ. Ọ fụrụ opi ike ma tie mkpu sị, “Anyị enweghị oke nʼime Devid, anyị enweghịkwa ihe nketa nʼime nwa Jesi! Onye ọbụla laa nʼụlọikwuu ya, unu Izrel!”
2Ya mere, ndị ikom Izrel niile hapụrụ Devid soro Sheba nwa Bikri; ma ndị ikom Juda rapaara eze ha nʼahụ, site na Jọdan ruo Jerusalem.
3Devid lọtara nʼụlọ ya dị na Jerusalem, eze ahụ wee kpọrọ iko nwanyị iri ndị ọ hapụrụ ka ha lekọta ụlọ ahụ, tinye ha nʼokpuru nche. Ọ na-azụ ha ma ya na ha edinakọghị. Ha nọgidere na mkpọrọ ruo mgbe ha nwụrụ, na-ebi ndụ dịka ụmụ nwanyị di ha nwụrụ.
4Eze ahụ gwara Amasa sị, “Kpọkọtaara m ndị ikom Juda nʼime ụbọchị atọ, gị onwe gịkwa nọrọ nʼebe a.”
5Amasa gara ịkpọkọta Juda, ma ọ nọọrọ ogologo oge karịa oge ahụ eze kara ya. 6Devid gwara Abishai sị, “Sheba nwa Bikri ga-emerụ anyị ahụ ugbu a karịa Absalọm. Kpọrọ ndị ikom onyenwe gị chụọ ya ọsọ, ma ọ bụghị ya, ọ ga-eru obodo ndị e wusiri ike gbanarịkwa anyị.”
7Ya mere, ndị ikom Joab, ndị Keret, ndị Pelet, na ndị dike niile si na Jerusalem pụọ soro ya ịchụ Sheba nwa Bikri ọsọ. 8Mgbe ha rutere nʼoke nkume dị na Gibiọn, Amasa zutere ha. Joab yi uwe agha ya, kekwaa mma agha nʼime obo ya nʼúkwù ya; ka ọ na-aga nʼihu, mma ahụ dapụrụ. 9Joab sịrị Amasa, “Ọ dị gị mma, nwanne m?” Joab jiri aka nri ya jide afọ ọnụ Amasa ka o susuo ya ọnụ. 10Amasa ahụghị mma ahụ dị nʼaka Joab. Joab were ya maa ya nʼafọ, mee ka eriri afọ ya wụsịa nʼala. Ọ kụghị ya ụkụ nke abụọ, Amasa anwụọ. Mgbe ahụ, Joab na nwanne ya Abishai chụrụ Sheba nwa Bikri ọsọ. 11Otu nʼime ụmụ okorobịa Joab guzoro nʼakụkụ Amasa sị, “Onye ọbụla hụrụ Joab nʼanya, onye ọbụla nọnyeere Devid—soro Joab!” 12Amasa tọgbọrọ na-atụrụ onwe ya nʼọbara ya nʼetiti ụzọ. Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ndị agha niile na-akwụsị nʼebe ahụ, ọ dọkpụụrụ Amasa site nʼụzọ baa nʼọhịa ma tụkwasị uwe nʼelu ya, nʼihi na onye ọbụla na-agafe na-akwụsị. 13Mgbe e wepụrụ ya nʼụzọ, ndị ikom niile soro Joab ịchụ Sheba nwa Bikri ọsọ. 14Sheba gafere nʼebo niile nke Izrel ruo Ebel nke Bet-Maaka; ndị Bikri niile zukọrọ sorokwa ya. 15Ha bịara gbaa ya gburugburu nʼEbel nke Bet-Maaka. Ha wuru mkpọrọ agha megide obodo ahụ, nke guzoro megide mgbidi dị nʼezi, ebe ndị agha Joab niile na-eti mgbidi ahụ ka ọ daa.
16Mgbe ahụ, otu nwanyị maara ihe sitere nʼobodo ahụ tie mkpu sị, “Geenụ ntị! Geenụ ntị! Gwanụ Joab sị, ‘Bịa nʼebe a, ka mụ na gị kwuo okwu.’” 17Ka ọ na-abịaru nso, nwanyị ahụ jụrụ sị, “Ị bụ Joab?” Ọ sịrị, “Ọ bụ m.” Ọ sịrị, “Nụrụ okwu ohu gị.” Ọ sịrị, “Ana m ege ntị.”
18Ọ sịrị, “Nʼoge ochie, ha na-ekwukarị sị, ‘Naanị jụọ ndụmọdụ nʼEbel,’ nke ahụ wee dozie okwu ahụ. 19Mụ onwe m so nʼetiti ndị udo na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼIzrel. Ị na-achọ ibibi otu obodo, bụ nne nʼIzrel. Gịnị mere i ji achọ iloda ihe nketa Nna anyị?” a a v19 “Obodo nne” bụ isi obodo dị ukwuu nʼógbè nke obodo ndị nta na-adabere na ya maka ndụmọdụ na nchebe.
20Joab zara sị, “Mba, mba, agaghị m eloda ma ọ bụ bibie ihe ọbụla! 21Ọ bụghị otú ahụ. Kama Sheba nwa Bikri, onye si nʼugwu Ifrem, enupụla isi megide eze, megide Devid. Nyefee naanị otu nwoke a, m ga-esikwa nʼobodo ahụ laghachi azụ.” Nwanyị ahụ gwara Joab sị, “A ga-atụfere gị isi ya site nʼelu mgbidi.”
22Nwanyị ahụ ji atụmatụ ya nke amamihe gakwuru ndị niile. Ha wee bee isi Sheba nwa Bikri tụfere ya Joab. Ọ fụrụ opi ike, ha wee gbasasịa site nʼobodo ahụ, onye ọbụla laa nʼụlọ ya. Joab laghachikwuru eze na Jerusalem.
23Joab bụ onyeisi ndị agha Izrel niile; Benaya nwa Jehoiada bụ onyeisi ndị Keret na ndị Pelet. 24Adoram bụ onye na-elekọta ọrụ mmanye; Jehoshafat nwa Ahilud bụ onye ndekọ; 25Sheva bụ odeakwụkwọ; Zadọk na Abịata bụkwa ndị nchụaja; 26Ira onye Jaịa bụkwara onye nchụaja Devid.