Ikpe Ekpere Maka Mmadụ Niile
Pọl na-ebu ụzọ rịọ ka e kpeere mmadụ niile ekpere, tinyere ndị eze, ebe Nna anyị chọrọ ka a zọpụta mmadụ niile, otu onye ogbugbo, bụ Kraịst Jisọs, werekwa onwe ya nye nʼihi mmadụ niile. Mgbe ahụ, ndị ikom ga-ekpe ekpere na-enweghị iwe, ndị inyom ga-eyikwa uwe nʼụzọ kwesịrị ekwesị, mụta ihe nʼịdị jụụ, gharakwa izi ihe.
2 1Nke mbụ, ya mere, ana m arịọ ka a na-arịọ arịrịọ, na-ekpe ekpere, na-arịọ maka ndị ọzọ, ma na-enye ekele maka mmadụ niile, 2maka ndị eze na ndị niile nwere ikike, ka anyị wee bie ndụ udo na ndụ dị jụụ nʼịsọpụrụ Chineke zuru oke na nkwanye ùgwù. 3Nke a dị mma, na-atọkwa Nna anyị, Onye Nzọpụta anyị, ụtọ, 4onye chọrọ ka a zọpụta mmadụ niile, ka ha bịakwa mara eziokwu. 5Nʼihi na e nwere otu Nna, na otu onye ogbugbo nʼetiti Nna na ụmụ mmadụ, bụ nwoke ahụ Kraịst Jisọs, 6onye nyere onwe ya dịka ihe mgbapụta maka mmadụ niile—nke bụ àmà e nyere nʼoge kwesịrị ekwesị. 7Nʼihi nke a ka e mere m onye nkwusa na onye ozi—ana m ekwu eziokwu, anaghị m agha ụgha—onye nkuzi nke mba niile nʼokwukwe na nʼeziokwu. 8Achọrọ m ka ụmụ nwoke nọ nʼebe niile na-ekpe ekpere, na-eweli aka dị nsọ elu, nʼenweghị iwe maọbụ esemokwu.
9Nʼotu aka ahụ, ụmụ nwanyị kwesịrị iyi uwe nke ọma, jiri obi umeala na njide onwe, ọ bụghị site nʼịkpa isi, maọbụ ọlaedo, maọbụ pearl, maọbụ uwe dị ọnụ ahịa, 10kama jiri ọrụ ọma, dịka o kwesịrị ụmụ nwanyị na-ekwupụta nsọpụrụ ha nye Nna anyị. 11Nwanyị kwesịrị iji ịdị jụụ na-amụ ihe, nʼirubere isi nke zuru oke. 12Anaghị m ekwe ka nwanyị zie ihe maọbụ chịa nwoke; kama, ọ kwesịrị ịnọ jụụ. 13Nʼihi na e bu ụzọ kpụọ Adam, emesịa Iv. 14Ọ bụghịkwa Adam ka a ghọgburu, kama nwanyị ahụ ka a ghọgburu, ọ ghọọ onye mmebi iwu. 15Ma a ga-azọpụta ya site nʼịmụ nwa, ma ọ bụrụ na ha anọgide nʼokwukwe, na ịhụnanya, na ịdị nsọ, jiri njide onwe. a a v15 Nnọchiaha ahụ si nʼ“ya” gbanwee gaa “ha”—dịka o si dị nʼihe mbụ—ikekwe na-ezo aka nʼụmụ nwanyị nʼozuzu ha ndị na-anọgide nʼomume ọma ndị a.