Emeghere M Ụzọ, Ma Ọ Lawaala
Ọ na-asị na ya abatala n'ubi ya. Mgbe ahụ nwaanyị ahụ kọrọ maka otu abalị o kwụsịrị n'ọnụ ụzọ ma meghee ya oge agaala, chọpụta na ọ pụọla. Ka ọ na-achọ, ndị nche tiri ya ihe. Mgbe a jụrụ ya ihe mere o ji dị iche, ọ kọwara ya site n'isi ruo n'ụkwụ.
5 1Abịala m nʼime ogige m, nwanne m nwanyị, nwunye m; achịkọtala m máá m tinyere ụda m, erila m ụbụrụ aṅụ m na mmanụ aṅụ m, aṅụọla m mmanya m na mmiri ara m. Rienụ, ndị enyi; ṅụọnụ, ṅụọkwanụ nke ukwuu, ndị na-ahụ nʼanya!
2Arahụrụ m ụra, ma obi m nọ na-amụ anya. Otu olu—onye m hụrụ nʼanya na-akụ aka: “Meghere m ụzọ, nwanne m nwanyị, ihe m hụrụ nʼanya, nduru m, onye m zuru oke, nʼihi na isi m jupụtara na igirigi, ntutu isi m jupụtakwa na ntakịrị mmiri nke abalị.” 3Eyipụla m uwe m—olee otu m ga-esi yikwaa ya ọzọ? Asaala m ụkwụ m—olee otu m ga-esi mee ka ha ruo unyi? 4Onye m hụrụ nʼanya tinyere aka ya nʼihe mkpọchi ụzọ, obi m wee jupụta nʼọṅụ nʼime m. 5Ebiliri m imeghere onye m hụrụ nʼanya ụzọ, máá wee na-asọ site nʼaka m, máá mmiri mmiri sikwa na mkpịsị aka m, nʼelu ihe njide mkpọchi ụzọ ahụ. 6Emeghere m onye m hụrụ nʼanya ụzọ, ma onye m hụrụ nʼanya atụgharịala laa. Mkpụrụ obi m dara mba mgbe o kwuru okwu. Achọrọ m ya, ma ahụghị m ya; akpọrọ m ya, ma ọ zaghị. 7Ndị nche hụrụ m ka ha na-agagharị nʼobodo; ha tiri m ihe, ha merụrụ m ahụ; ha napụrụ akwa mkpuchi m nʼaka m, bụ ndị nche mgbidi ahụ. 8Ana m adụ unu ọdụ, ụmụ ada Jerusalem, ọ bụrụ na unu ahụ onye m hụrụ nʼanya, gwanụ ya na ịhụnanya na-arịa m ọrịa. 9Gịnị ka onye ị hụrụ nʼanya ji karịa onye ọzọ a hụrụ nʼanya, gị onye kachasị mma nʼetiti ụmụ nwanyị? Gịnị ka onye ị hụrụ nʼanya ji karịa onye ọzọ a hụrụ nʼanya, nke mere i ji adụ anyị ọdụ otu a?
10Onye m hụrụ nʼanya na-enwu enwu ma na-acha uhie uhie, onye pụrụ iche nʼetiti puku mmadụ iri. 11Isi ya bụ ọlaedo kachasị mma; ntutu isi ya na-efegharị efegharị, na-eji nji dịka ugolọma. 12Anya ya dị ka nduru nke nọ nʼakụkụ iyi mmiri, nke a sachara na mmiri ara, nke a doziri dịka nkume ọla nʼọnọdụ ha. 13Agba ya dị ka mbara a kụrụ ụda na-esi ísì ụtọ, ụlọ elu nke ahịhịa na-esi ísì ụtọ. Egbugbere ọnụ ya bụ okoko lili, nke máá mmiri mmiri si na ya na-asọ. 14Ogwe aka ya bụ mkpara ọlaedo, nke e ji nkume ọla chọọ mma. Ahụ ya bụ ọdụ enyí e hichara nke ọma, nke e ji nkume safaia chọọ mma. 15Ụkwụ ya bụ ogidi nkume alabasta, nke a tọrọ nʼelu ntọala ọlaedo dị mma. Ọdịdị ya dị ka Lebanọn, mara mma dịka osisi sida. 16Ọnụ ya bụ ụtọ nʼonwe ya, ọ bụkwa onye a na-achọsi ike nʼụzọ niile. Onye a bụ onye m hụrụ nʼanya, onye a bụkwa enyi m, ụmụ ada Jerusalem.