Enyi m onwe ya raara m nye
Nye onyeisi ndị ọbụ abụ: jiri ụbọ eriri. Abụ amamihe nke Devid.
Egwu na ịma jijiji; onye ọbụ abụ na-achọ nku nduru ka o feba nʼọzara. Ihe kacha egbu ya mgbu abụghị ime ihe ike juru obodo, kama ọ bụ onye ha ha nhata, enyi nke ya na ya sooro gaa nʼụlọ Nna anyị, onye mebiri okwukwe.
55 1Nụrụ ekpere m, Nna m, ezonarịla onwe gị site nʼarịrịọ ebere m. 2Gee m ntị ma zaa m; enweghị m izu ike nʼime mkpesa m, ana m asụkwa ude, 3nʼihi olu onye iro, nʼihi mmegbu nke ndị ajọ omume. Nʼihi na ha na-ewetara m nsogbu, ha na-ejikwa iwe na-ebu m iro nʼobi. 4Obi m na-emegharị nʼime m; egwu ọnwụ adakwasịla m. 5Egwu na ịma jijiji abịakwasịla m, oke ụjọ ekpuchiekwala m. 6Ma asịrị m, “Ewoo, a sị na m nwere nku dịka nduru! M gaara efefu ma nweta izuike.
7Ee, m gaara awagharị gaa nʼebe dị anya; m gaara ezo nʼọzara. a a v7 Sela: okwu egwu maọbụ nke ofufe nke nkọwa ya edoghị anya, o yikarịrị ịbụ nkwụsịtụ maka ntụgharị uche maọbụ nkwụsịtụ egwu. 8M gaara eme ngwa gaa nʼebe mgbaba m, pụọ site nʼifufe na-efesi ike na oke ifufe mmiri.” 9Mee ka ihe gbagwojuo ha anya, Nna, Onye na-achị achị; kewaa asụsụ ha, nʼihi na ahụrụ m ime ihe ike na esemokwu nʼime obodo ahụ. 10Ehihie na abalị ka ha na-agagharị nʼelu mgbidi ya; ajọ omume na nsogbu dị nʼime ya. 11Mbibi dị nʼetiti ya; mmegbu na aghụghọ anaghị ahapụ okporo ụzọ ya. 12Nʼihi na ọ bụghị onye iro na-akwa m emo— nke m gaara anagide; ọ bụghị onye kpọrọ m asị na-ebuli onwe ya elu megide m— nʼebe ọ nọ ka m gaara ezo onwe m. 13Ma ọ bụ gị, nwoke nha m, onye ibe m na ezigbo enyi m. 14Anyị bụ ndị nwekọrọ mmekọrịta dị ụtọ ọnụ, ndị soro ìgwè mmadụ jee nʼụlọ Nna anyị. 15Ka ọnwụ bịakwasị ha; ka ha jiri ndụ rịdaa nʼili, nʼihi na ihe ọjọọ dị nʼebe obibi ha, nʼetiti ha nʼonwe ha. 16Ma mụ onwe m na-akpọ Nna m òkù, Nna m ga-azọpụtakwa m. 17Nʼuhuruchi na nʼụtụtụ na nʼehihie ka m na-eti mkpu na-asụ ude, ọ na-anụkwa olu m. 18O gbapụtala mkpụrụ obi m nʼudo site nʼagha a na-ebuso m, ọ bụ ezie na ọtụtụ guzogidere m.
19Nna anyị ga-anụ ma weda ha ala—Onye nọ nʼocheeze site na mgbe ochie. Nʼihi na ha anaghị agbanwe, ha adịghị atụ egwu Nna anyị. 20Onye nrara nye eweliela aka ya megide ndị ya na ha nọ nʼudo; o mebiela ọgbụgba ndụ ya. 21Okwu ọnụ ya dị nro karịa bọta, ma agha dị nʼobi ya; okwu ya dị nro karịa mmanụ, ma ha bụ mma agha a mịpụtara. 22Tụkwasị Nna anyị ibu arọ gị, ọ ga-akwagidekwa gị; ọ gaghị ekwe ka onye ezi omume maa jijiji. 23Ma gị, Nna m, ga-eweda ha ala baa nʼolulu mbibi; ndị na-awụfu ọbara na ndị aghụghọ agaghị ebi ọ bụladị ọkara ụbọchị ha. Ma mụ onwe m ga-atụkwasị gị obi.