Bildad Onye Shua Zara
Bildad kwuru okwu nʼenweghị mgbagha: Chineke anaghị agbagọ ikpe ziri ezi, ya mere ụmụ Job ga-anatarịrị ihe mmehie ha kwesịrị. Chọọ Chineke, dị ọcha, ọgwụgwụ gị ga-akakwa mmalite gị. Ihe atụ ya banyere ndị na-amaghị Chineke, papịrọs na-enweghị apịtị, ụdọ ududo, ka o ji gbaa Job nʼanya.
8 1Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zara sị: 2“Ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide na-ekwu ụdị ihe ndị a? Okwu si nʼọnụ gị pụta bụ naanị ikuku na-ebigbọ ebigbọ. 3Chineke ọ na-agbagọ ikpe ziri ezi? Onye pụrụ ime ihe niile ọ na-agbagọ ihe ziri ezi? 4Ọ bụrụ na ụmụ gị mehiere megide ya, o nyefere ha nʼaka ọghọm nke nnupụisi ha. 5Ma ọ bụrụ na ị ga-eji obi gị niile chọọ Chineke, rịọkwa Onye pụrụ ime ihe niile ka o meere gị ebere, 6ọ bụrụ na ị dị ọcha, bụrụkwa onye ziri ezi, nʼezie, ugbu a, ọ ga-ebiliri gị, weghachikwa gị nʼọnọdụ ruuru gị. 7Ọ bụ ezie na mmalite gị pere mpe, afọ gị ndị dịrị nʼihu ga-aba ụba karịa ihe a ga-atụ atụ. 8Jụọ ọgbọ ndị gara aga ogologo oge, tụleekwa ihe nna ha chọpụtara. 9Nʼihi na a mụrụ anyị naanị ụnyaahụ, anyị amaghịkwa ihe ọbụla; ụbọchị anyị nʼụwa dị naanị ka onyinyo. 10Ọ bụ na ha agaghị akụziri gị ihe, gwakwa gị okwu, si na nghọta ha wepụta okwu? 11Ahịhịa papịrọs ọ pụrụ eto ogologo nʼebe apịtị na-adịghị? Achara ọ pụrụ eto eto ma e wezụga mmiri? 12Mgbe ọ ka dị ndụ, mgbe a na-egbutubeghị ya, ọ na-akpọnwụ ngwa ngwa karịa ahịhịa ọbụla. 13Otu a ka ọ ga-adịrị ndị niile na-echefu Chineke; otu a ka olileanya nke ndị na-amaghị Chineke si ala nʼiyi. 14Ntụkwasị obi ya na-etipị etipị, ihe o tụkwasịrị obi ya bụ akwụ udide. 15Ọ na-adabere nʼụlọ ya, ma ọ naghị eguzo; ọ na-ejidesi ya ike, ma ọ naghị adịgide. 16Ọ dị ka osisi e nyere mmiri nke ọma nʼoge anwụ na-acha, nke na-agbasa alaka ya nʼelu ubi. 17Mgịrịga ya na-ekechi ikpo nkume, na-achọkwa ebe ọ ga-ejide nʼetiti nkume ndị ahụ. 18Ma mgbe a hopuru ya site nʼọnọdụ ya, ọ na-agọnarị ya, na-asị, ‘Ahụtụbeghị m gị mgbe ọbụla.’ 19Otu a ka ọṅụ nke ụzọ ya si dị— ndị ọzọ ga-esite nʼaja pupụta nʼọnọdụ ya. 20Chineke agaghị ajụ nwoke na-enweghị ịta ụta, ọ gaghịkwa enyere ndị na-eme ihe ọjọọ aka. 21Ọ ga-emekwa ka ọnụ gị jupụta nʼọchị, meekwa ka egbugbere ọnụ gị jupụta nʼiti mkpu ọṅụ. 22A ga-eyikwasị ndị kpọrọ gị asị ihere dị ka uwe, ụlọ ikwuu nke ndị ajọ omume agaghịkwa adị ọzọ.”