Nkasiobi Site nʼỌbịbịa Taịtọs
Taịtọs rutere Masedonia were ozi, egwu Pọl wee kwụsị. Akwụkwọ ozi ya nke na-ewute obi ewutela ha, o wee nwee ntakịrị ụta na o zitere ya, ma iru ụjụ ahụ mere ka ha chigharịa. Iru ụjụ nke Nna anyị bu nʼobi na-eduba na nchegharị nke onye ọbụla na-adịghị akwa ụta ya. Ọ na-ekwu nʼụzọ doro anya na ọ tụkwasịrị ha obi ọzọ.
7 1Ya mere, ndị m hụrụ nʼanya, ebe anyị nwere nkwa ndị a, ka anyị mee onwe anyị ka ọ dị ọcha site nʼadịghị ọcha niile nke anụ ahụ na nke mmụọ, na-emezu ịdị nsọ nʼegwu Nna anyị.
2Meeenụ ka anyị nwee ohere nʼobi unu. O nweghị onye anyị mejọrọ, o nweghị onye anyị mebiri emebi, o nweghị onye anyị ghọgburu. 3Anaghị m ekwu nke a iji maa unu ikpe. Ekwuru m na mbụ sị: unu nọ nʼobi anyị, ịnwụ na ịdị ndụ ọnụ. 4Enwere m nnukwu ntụkwasị obi nʼebe unu nọ, enwekwara m nnukwu ịfụli elu nʼihi unu. Nkasiobi jupụtara nʼime m, ọṅụ na-ejupụtakwa nʼobi m nʼime nsogbu anyị niile.
5Ọbụladị mgbe anyị rutere Masedonia, anụ ahụ anyị enweghị izuike—a na-enye anyị nsogbu nʼakụkụ niile, esemokwu nʼezi, egwu nʼime obi. 6Ma Nna anyị, onye na-akasi ndị obi dara mba obi, kasiri anyị obi site nʼọbịbịa Taịtọs. 7Ọ bụghị naanị site nʼọbịbịa ya, kama sitekwara na nkasiobi ọ natara nʼihi unu—ọ gwara anyị maka agụụ unu, iru uju unu, na ịnụ ọkụ nʼobi unu nʼihi m—nke a mere m ji ṅụrịa ọṅụ karịa.
8Ọ bụ ezie na akwụkwọ ozi m wetaara unu iru uju, anaghị m akwa ụta ya—ọ bụ ezie na m kwara ụta na mbụ, ebe m hụrụ na akwụkwọ ozi ahụ wetaara unu iru uju, ọ bụrụgodị naanị nwa oge. 9Ugbu a, ana m aṅụrị ọṅụ—ọ bụghị na unu nwere iru uju, kama na iru uju unu wetara nchegharị. Unu nwere iru uju dịka Nna anyị si chọọ, ya mere unu enweghị mfu ọbụla site nʼaka anyị. 10Nʼihi na iru uju dịka uche Nna anyị si dị na-eweta nchegharị nke na-eduga na nzọpụta, nke na-adịghị ewetara mmadụ ụta; ma iru uju nke ụwa na-eweta ọnwụ. 11Leenụ ihe iru uju a dịka uche Nna anyị si dị wetara nʼime unu: ịgbasi mbọ ike, ọchịchọ iji kpochapụ onwe unu, iwe, egwu, agụụ, ịnụ ọkụ nʼobi, na ịdị njikere maka ikpe ziri ezi! Nʼihe niile, unu egosila na unu bụ ndị aka ha dị ọcha nʼokwu a. 12Ọ bụ ezie na m deere unu akwụkwọ, ọ bụghị nʼihi onye ahụ mere ihe ọjọọ, maọbụ nʼihi onye ahụ e mejọrọ, kama ka izi ezi nke obi unu nʼebe anyị nọ pụta ìhè nye unu nʼihu Nna anyị. 13Ọ bụ nke a mere e ji kasie anyị obi. Ewezuga nkasiobi nke anyị, anyị ṅụrịkwara ọṅụ karịa nʼihi ọṅụ Taịtọs, nʼihi na unu niile mere ka mmụọ ya nwee ume ọhụrụ. 14Ihe ọbụla m jiri unu tuo ọnụ nʼebe ọ nọ emenyeghị m ihere. Dịka ihe niile anyị gwara unu si bụrụ eziokwu, otu a kwa, ịtụ ọnụ anyị nʼihu Taịtọs bụ eziokwu. 15Obi ya nʼebe unu nọ na-abawanyekwu, mgbe ọ na-echeta otu unu niile si rube isi, na-anabata ya nʼegwu na ịma jijiji. 16Ana m aṅụrị ọṅụ, nʼihi na nʼihe niile enwere m ntụkwasị obi zuru oke nʼebe unu nọ.