Ugbu a Bụ Ụbọchị Nzọpụta
Pọl na-egosi ihe ndị na-akwado ozi ya, ha bụkwa ihe otiti, ụlọ mkpọrọ, abalị ụra na-anaghị ya anya, na nkwutọ. Mgbe ahụ ọ hapụrụ arụmụka ahụ, rịọ ha nanị: obi ya ghere oghe nke ọma, ma obi nke ha mechiri emechi. Ọ rịọrọ ha ka ha si nʼetiti arụsị pụta, biri dịka ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom nke Nna nʼonwe ya.
6 1Dịka ndị ya na ya na-arụkọ ọrụ, anyị na-arịọ unu ka unu ghara ịnara amara Nna anyị nʼefu.
2Nʼihi na ọ na-asị, “Nʼoge kwesịrị ekwesị, anụrụ m gị; nʼụbọchị nzọpụta, enyere m gị aka.” Lee, ugbu a bụ oge kwesịrị ekwesị; lee, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.
3Anyị anaghị etinye ihe mgbochi ọbụla nʼụzọ onye ọbụla, ka a ghara ịchọta ntụpọ ọbụla nʼozi anyị. 4Kama, anyị na-egosi onwe anyị nʼihe niile dịka ndị ohu Nna anyị: site nʼntachi obi dị ukwuu, nʼime ahụhụ, nʼime ihe isiike, nʼime mkpagbu, 5nʼime ịpịa ihe, nʼime mkpọrọ, nʼime ọgba aghara, nʼime ịdọgbu onwe nʼọrụ, nʼime abalị enweghị ụra, nʼime agụụ; 6site nʼịdị ọcha, site nʼihe ọmụma, site na ndidi, site nʼobiọma, site na Mmụọ Nsọ, site nʼezi ịhụnanya, 7site nʼokwu eziokwu, site nʼike Nna anyị, jiri ngwa agha nke ezi omume nʼaka nri na nʼaka ekpe, 8site na nsọpụrụ na nlelị, site na nkọcha na otuto. A na-emeso anyị dịka ndị aghụghọ, ma anyị bụ ndị eziokwu; 9dịka ndị a na-amaghị, ma ndị a maara nke ọma; dịka ndị na-anwụ anwụ, ma lee, anyị dị ndụ; dịka ndị a na-ata ahụhụ, ma ndị a na-egbughị egbu; 10dịka ndị na-eru ụjụ, ma ndị na-aṅụrị ọṅụ mgbe niile; dịka ndị ogbenye, ma ndị na-eme ka ọtụtụ baa ọgaranya; dịka ndị na-enweghị ihe ọbụla, ma ndị nwere ihe niile.
11Anyị agwala unu okwu nʼezoghị ezo, unu ndị Kọrịnt; obi anyị meghere oghe nye unu. 12Anyị adịghị egbochi unu, kama ọ bụ nʼobi nke unu ka a na-egbochi unu. 13Nʼọnọdụ nke a—ana m agwa unu okwu dịka m na-agwa ụmụ m—megheekwanụ obi unu oghe.
Lọtanụ nʼEzinụlọ Nna
14Unu na ndị na-ekweghị ekwe ejikọtala onwe unu nʼotu. Nʼihi na gịnị ka ezi omume na enweghị iwu nwekọrọ? Maọbụ olee mkpakọrịta ìhè na ọchịchịrị nwekọrọ? 15Olee nkwekọ dị nʼetiti Kraịst na ekwensu? Gịnị ka onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwekọrọ?
16Olee nkekọ ụlọnsọ Nna anyị na arụsị nwere? Nʼihi na anyị bụ ụlọnsọ Nna ahụ dị ndụ, dịka o kwuru, sị: “Aga m ebi nʼetiti ha, jegharịakwa nʼetiti ha; aga m abụ Nna ha, ha ga-abụkwa ụmụ m.” 17Ya mere, “Sitenụ nʼetiti ha pụta, dịpụkwanụ iche, ka Nna anyị na-ekwu, unu emetụkwala ihe ọbụla na-adịghị ọcha aka; mgbe ahụ ka m ga-anabata unu, 18aga m abụkwara unu Nna, unu ga-abụkwara m ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, ka Nna anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu.” a a v18 Nkwa ahụ Nna anyị kwere nwa eze Devid nʼoge gara aga ka o meghere nʼebe a nye onye kwere ekwe ọbụla — ọ na-aghọ Nna nye ndị niile na-abịakwute ya, anyị na-aghọkwa ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom.