Nwa nke Mmadụ Na-agbaghara Mmehie Ma Na-agwọ Ọrịa
Ịgbaghara mmehie nwoke ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ wutere ndị odeakwụkwọ; iri nri na tebụl Matiu wutere ndị Farisii. Otu nwatakịrị nwanyị na-anwụ anwụ na otu nwanyị na-agba ọbara ka a gwọrọ n'otu njem. Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ dị ka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha rịọ Nna ka o zite ndị ọrụ n'owuwe ihe ubi.
9 1Jisọs banyere nʼụgbọ mmiri, gafee, bịaruo nʼobodo nke aka ya.
2Ụfọdụ ndị bulatere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ, onye dina nʼute. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, ọ gwara nwoke ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ sị, “Nwee obi ike, nwa m; agbagharala gị mmehie gị.”
3Nʼihi nke a, ụfọdụ nʼime ndị ozizi iwu kwuru nʼobi ha sị, “Nwoke a na-ekwulu Chineke.”
4Ebe Jisọs maara echiche ha, ọ sịrị, “Gịnị mere unu ji na-edebe ihe ọjọọ nʼobi unu? 5Kedụ nke dị mfe: ịsị, ‘Agbagharala gị mmehie gị,’ ka ọ bụ ịsị, ‘Bilie jee ije’? 6Ma ka unu wee mara na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie”—mgbe ahụ ọ gwara nwoke ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ sị, “Bilie, chịrị ute gị, laa nʼụlọ gị.”
7Nwoke ahụ wee bilie laa nʼụlọ ya. 8Mgbe ìgwè mmadụ ahụ hụrụ nke a, egwu tụrụ ha, ha wee too Nna anyị, onye nyere ụmụ mmadụ ụdị ikike ahụ.
Jisọs Kpọrọ Matiu
9Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-aga, ọ hụrụ otu nwoke aha ya bụ Matiu ka ọ nọ ọdụ nʼebe a na-anakọta ụtụ. Ọ sịrị ya, “Soro m.” Matiu wee bilie soro ya.
10Mgbe Jisọs nọ na-eri nri nʼụlọ Matiu, ọtụtụ ndị ọna ụtụ na ndị mmehie bịara soro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ nʼoche nri. 11Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere onye ozizi unu ji na ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-eso erikọ nri?”
12Mgbe Jisọs nụrụ nke a, ọ sịrị, “Ọ bụghị ndị ahụ dị mma na-achọ dọkịta, kama ọ bụ ndị na-arịa ọrịa. 13Ma gaa mụta ihe nke a pụtara: ‘Achọrọ m ebere, ọ bụghị àjà.’ Nʼihi na abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama ndị mmehie.”
Mmanya Ọhụrụ Na-achọ Karama Akpụkpọ Ọhụrụ
14Mgbe ahụ, ndị na-eso ụzọ Jọn bịara jụọ ya sị, “Gịnị mere anyị na ndị Farisii ji na-ebu ọnụ ọtụtụ mgbe, ma ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebu ọnụ?”
15Jisọs zara sị, “Ndị enyi nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ ọ ga-eru uju mgbe ya na ha nọ? Ma ụbọchị na-abịa mgbe a ga-anapụ ha nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ ahụ—mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.” 16Ọ dịghị onye na-adụkwasị mpempe ákwà ọhụrụ na-agbakọbeghị agbakọ nʼuwe ochie; nʼihi na mpempe ákwà ahụ ga-adọpụ onwe ya site nʼuwe ahụ, mee ka oghere ya saa mbara karịa. 17“Ụmụ mmadụ anaghị awụnye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ochie; ma ọ bụrụ otú ahụ, karama akpụkpọ ndị ahụ ga-agbawa, mmanya awụsịa, ha abụrụ ihe lara nʼiyi. Kama, a na-awụnye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ, ka e wee chekwaa ha abụọ.”
Arịrịọ nke otu nna na Mmetụ Aka nke Otu Nwanyị
18Mgbe ọ ka na-ekwu okwu, otu onyeisi ụlọ nzukọ bịara, gbuo ikpere nʼala nʼihu ya, sị, “Ada m nwụrụ anwụ kịtị a. Ma bịa, bikwasị ya aka gị, ọ ga-adịkwa ndụ.”
19Jisọs biliere soro ya gaa, ya na ndị na-eso ụzọ ya. 20Nʼoge ahụ kpọmkwem, otu nwanyị ọbara na-agba afọ iri na abụọ bịara nʼazụ ya metụ ọnụ uwe ya aka. 21Ọ nọ na-asị nʼobi ya, “Ọ bụrụ naanị na m metụ uwe ya aka, a ga-agwọ m.”
22Jisọs tụgharịrị, hụ ya. Ọ sịrị, “Nwee obi ike, ada m, okwukwe gị emeela ka ị dị mma.” A gwọrọ nwanyị ahụ nʼotu oge ahụ.
23Mgbe Jisọs banyere nʼụlọ onyeisi ụlọ nzukọ ahụ, hụ ndị na-egbu ọjà na ìgwè mmadụ na-eme mkpọtụ,
24ọ sịrị, “Pụọnụ. Nwa agbọghọ a anwụghị anwụ, kama ọ na-arahụ ụra.” Ma ha chịrị ya ọchị.
25Mgbe a chụpụchara ìgwè mmadụ ahụ, ọ banyere, jide ya aka, nwa agbọghọ ahụ wee bilie. 26Akụkọ banyere nke a gbasara nʼakụkụ ala ahụ niile.
Ndị Ìsì Na-ahụ Ụzọ, Ndị Ogbi Na-ekwu Okwu
27Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-apụ, ụmụ nwoke ìsì abụọ sooro ya, na-eti mkpu, “Mere anyị ebere, Nwa Devid!”
28Mgbe ọ banyere nʼụlọ, ndị ìsì ahụ bịakwutere ya. Ọ jụrụ ha, “Unu kwere na m pụrụ ime nke a?” Ha sịrị, “Ee, Onyenwe anyị.”
29Mgbe ahụ, o metụrụ anya ha aka sị, “Ka e meere unu dịka okwukwe unu si dị”. 30Anya ha meghere. Jisọs dọrọ ha aka ná ntị ike sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara ịmara banyere nke a.”
31Ma ha pụrụ gbasaa akụkọ banyere ya nʼakụkụ ala ahụ niile.
32Ka ha na-apụ, e kpọtaara Jisọs otu nwoke ogbi, onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya. 33Ozugbo a chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, nwoke ogbi ahụ kwuru okwu. Ìgwè mmadụ ahụ tụrụ nʼanya sị, “Ọ dịtụbeghị mgbe ụdị ihe dị otú a pụtara nʼIzrel.”
34Ma ndị Farisii sịrị, “Ọ na-achụpụ mmụọ ọjọọ site nʼike onyeisi ndị mmụọ ọjọọ.”
Nna Na-akpọ Ndị Ọrụ Owuwe Ihe Ubi
35Jisọs gagharịrị nʼobodo ukwu na obodo nta niile, na-ezi ihe nʼụlọ nzukọ ha, na-ekwusa oziọma nke alaeze Nna anyị, na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile. 36Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, o nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, nʼihi na ha nọ na nsogbu, enweghịkwa onye inyeaka, dịka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ.
37Mgbe ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Owuwe ihe ubi dị ukwuu, ma ndị ọrụ dị ole na ole. 38Ya mere, rịọnụ Nna nke owuwe ihe ubi ka o zipụ ndị ọrụ banye nʼubi owuwe ihe ya.” a a v38 Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha rịọ onye nwe owuwe ihe ubi — bụ Nna anyị — ka o zipụ ndị ọrụ. Owuwe ihe nke ụmụ mmadụ na-alọta nʼụlọ bụ nke Nna, ọ bụkwa ya na-ezipụ ndị ọrụ banye nʼubi ya.