Agbụrụ Ịso
Ụmụ ụmụ Ịso nwetara ndekọ zuru ezu nke aka ha: ndị nwunye, ndị isi, na ndị eze chịrị nʼEdọm tupu Izrel enwe eze ọ bụla. Ehichapụghị nwanne ahụ a gafere; ọ ghọrọ mba dị nso nwere akụkọ ihe mere eme guzosiri ike.
36 1Ndị a bụ usoro ọmụmụ Ịso (ya bụ Edọm). 2Ịso lụrụ ndị nwunye ya site nʼụmụ ndị inyom Kenan: Eda nwa Ịlọn onye Het, na Oholibama nwa Ana, nwa nwa Zibiọn onye Hiv, 3na Basemat nwa Ishmel, nwanne Nebaiọt. 4Eda mụụrụ Ịso Elifaz, Basemat mụọ Reuel, 5Oholibama mụrụ Jeush, Jalam, na Kora—ụmụ ndị ikom Ịso, ndị a mụụrụ ya nʼala Kenan. 6Ịso kpọọrọ ndị nwunye ya, ụmụ ya ndị ikom, ụmụ ya ndị inyom, ndị niile nọ nʼezinụlọ ya, anụ ụlọ ya, anụmanụ ya niile, na akụ niile o nwetara na Kenan, kwaga nʼala dị anya site nʼebe nwanne ya Jekọb nọ. 7Akụ ha dị ukwuu nke na ha enweghị ike ibikọ ọnụ; ala ebe ha nọ apụghị ịkwado ha abụọ nʼihi igwe anụ ụlọ ha. 8Ya mere Ịso biri nʼala ugwu Sia. (Ịso bụ Edọm.).
9Ndị a bụ usoro ọmụmụ Ịso, bụ nna ndị Edọm, nʼala ugwu Sia. 10Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Ịso: Elifaz nwa Eda, nwunye Ịso; Reuel nwa Basemat, nwunye Ịso. 11Ụmụ ndị ikom Elifaz bụ Teman, Oma, Zefo, Gatam, na Kenaz. 12Timna, iko nwanyị Elifaz nwa Ịso, mụụrụ ya Amalek. Ndị a bụ ụmụ Eda nwunye Ịso. 13Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Reuel: Nahat, Zera, Shama, Miza. Ndị a bụ ụmụ Basemat nwunye Ịso. 14Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Oholibama nwunye Ịso, nwa Ana, nwa Zibiọn: ọ mụụrụ Ịso Jeush, Jalam, na Kora.
15Ndị a bụ ndịisi nʼetiti ụmụ ndị ikom Ịso. Ụmụ ndị ikom Elifaz, ọkpara Ịso: onyeisi Teman, onyeisi Oma, onyeisi Zefo, onyeisi Kenaz. 16Onyeisi Kora, onyeisi Gatam, onyeisi Amalek—ndị a bụ ndịisi sitere nʼElifaz nʼala Edọm; ndị a bụ ụmụ Eda. 17Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Reuel, nwa Ịso: onyeisi Nahat, onyeisi Zera, onyeisi Shama, onyeisi Miza. Ndị a bụ ndịisi sitere nʼReuel nʼala Edọm. Ndị a bụ ụmụ Basemat nwunye Ịso. 18Ụmụ ndị ikom Oholibama nwunye Ịso: onyeisi Jeush, onyeisi Jalam, onyeisi Kora. Ndị a bụ ndịisi sitere nʼOholibama nwunye Ịso, nwa Ana. 19Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Ịso (ya bụ Edọm), ndị a bụkwa ndịisi ha.
20Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Sia onye Hor, bụ ndị bi nʼala ahụ: Lotan, Shobal, Zibiọn, Ana, 21Dishọn, Eza, na Dishan—ndịisi ndị Hor, ụmụ Sia, nʼala Edọm. 22Ụmụ ndị ikom Lotan bụ Hori na Hemam, nwanne nwanyị Lotan bụ Timna. 23Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Shobal: Alvan, Manahat, Ebal, Shefo, na Onam. 24Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Zibiọn: Aịa na Ana. Ọ bụ Ana a chọtara isi mmiri na-ekpo ọkụ nʼọzara mgbe ọ na-azụ ịnyịnya ibu nke nna ya Zibiọn. 25Ndị a bụ ụmụ Ana: Dishọn, na Oholibama nwa nwanyị Ana. 26Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Dishọn: Hemdan, Eshban, Itran, na Keran. 27Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Eza: Bilhan, Zavan, na Akan. 28Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Dishan: Uz na Aran. 29Ndị a bụ ndịisi ndị Hor: onyeisi Lotan, onyeisi Shobal, onyeisi Zibiọn, onyeisi Ana, 30onyeisi Dishọn, onyeisi Eza, onyeisi Dishan—ndịisi ndị Hor, agbụrụ nʼagbụrụ, nʼala Sia.
Ndị Eze Tupu Ndị Eze Izrel
31Ndị a bụ ndị eze chịrị nʼala Edọm tupu eze ọbụla achịa ụmụ Izrel: 32Bela nwa Beọ chịrị nʼEdọm, aha obodo ya bụ Dinhaba. 33Mgbe Bela nwụrụ, Jobab nwa Zera onye si Bozra nọchiri ya chịa. 34Mgbe Jobab nwụrụ, Husham onye si nʼala ndị Teman nọchiri ya chịa. 35Husham nwụrụ; Hadad nwa Bedad, onye meriri Midian nʼala Moab, nọchiri ya chịa. A kpọrọ obodo ya Avit. 36Mgbe Hadad nwụrụ, Samla onye si Masreka nọchiri ya chịa. 37Mgbe Samla nwụrụ, Shaul onye si Rehobot nke dị nʼakụkụ osimiri Yufretis nọchiri ya chịa. 38Mgbe Shaul nwụrụ, Baal-hanan nwa Akboa nọchiri ya chịa. 39Mgbe Baal-hanan nwa Akboa nwụrụ, Hada nọchiri ya chịa; aha obodo ya bụ Pau, aha nwunye ya bụ Mehetabel, nwa Matred, nwa Mezahab.
40Ndị a bụ ndịisi sitere nʼIso, dịka agbụrụ ha, dịka ebe ha, dịka aha ha: onyeisi Timna, onyeisi Alva, onyeisi Jetet. 41Onyeisi Oholibama, onyeisi Ela, onyeisi Pinon, 42onyeisi Kenaz, onyeisi Teman, onyeisi Mibza, 43onyeisi Magdiel, na onyeisi Iram. Ndị a bụ ndịisi Edọm, dịka ebe obibi ha nʼala ha nwere. Ịso bụ nna ndị Edọm.