Achịcha nʼelu Mmiri
Zipụ achịcha gị nʼelu mmiri, kesaakwa òkè gị nʼebe dị anya, nʼihi na ị maghị ihe ọjọọ na-abịa. Onye na-ele ifufe anya agaghị akụ mkpụrụ. Kụọ mkpụrụ nʼụtụtụ na nʼanyasị, ṅụrịa ọṅụ nʼìhè, cheta ụbọchị ọchịchịrị dị nʼihu, marakwa na Chineke ga-eweta ntorobịa nʼikpe.
11 1Tụba achịcha gị nʼelu mmiri, nʼihi na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, ị ga-achọtakwa ya ọzọ. 2Nye mmadụ asaa oke, ọbụladị asatọ, nʼihi na ị maghị ihe ọjọọ nke pụrụ ịbịakwasị ala. 3Ọ bụrụ na igwe ojii juputara, ha na-awụsa mmiri ozuzo nʼelu ụwa; ọ bụrụkwa na osisi adaa nʼụzọ ndịda maọbụ nʼụzọ ugwu, nʼebe ọ dara, nʼebe ahụ ka ọ ga-edina. 4Onye ọbụla na-ele ikuku anya agaghị akụ mkpụrụ, onye ọbụla na-enyocha igwe ojii agaghịkwa ewe ihe ubi.
5Dịka ị na-amaghị ụzọ ikuku si aga, maọbụ otú e si akpụ ọkpụkpụ nʼime afọ nke nwanyị dị ime, otú ahụ kwa ị pụghị ịmata ọrụ Chineke, onye na-eke ihe niile.
6Kụọ mkpụrụ gị nʼụtụtụ, ma nʼanyasị ekwela ka aka gị zuru ike, nʼihi na ị maghị nke ga-eme nke ọma—nke a maọbụ nke ahụ—maọbụ ma ha abụọ ọ ga-ema nke ọma.
Ìhè Na-atọ Ụtọ
7Ìhè na-atọ ụtọ, ọ na-atọkwa anya ụtọ ịhụ anyanwụ.
8Ya mere, ọ bụrụ na mmadụ adị ndụ ọtụtụ afọ, ya ṅụrịa ọṅụ nʼime ha niile; ma ya cheta ụbọchị ọchịchịrị, nʼihi na ha ga-adị ọtụtụ. Ihe niile na-abịa bụ ihe na-agafe agafe.
9Ṅụrịa ọṅụ, gị nwa okorobịa, nʼoge okorobịa gị, ka obi gị nye gị obi ụtọ nʼụbọchị okorobịa gị. Jee ije nʼụzọ niile nke obi gị nakwa nʼihe anya gị na-ahụ; ma mara na nʼihi ihe ndị a niile Chineke ga-akpọ gị ikpe.
10Ya mere, chụpụ nchegbu site nʼobi gị, wepụkwa mgbu site nʼahụ gị, nʼihi na okorobịa na mmalite ndụ bụ ihe na-agafe agafe.