Ekele nye ndị Tesalonaịka
Akwụkwọ ozi nke abụọ na-eme ka otu nzukọ mgbagwojuru anya gbasara ụbọchị Onyenwe anyị guzosie ike, ma na-akpọ ha ka ha guzosie ike.
1 1Pọl, Saịlivanọs, na Timoti, na-edegara nzukọ ndị Tesalonaịka nke nọ nʼime Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst akwụkwọ: 2Ka amara na udo nke sitere nʼaka Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
Ekele maka okwukwe unu nke na-eto eto
3Anyị aghaghị ikele Nna anyị mgbe niile nʼihi unu, ụmụnna—nke a bụ ihe ziri ezi—nʼihi na okwukwe unu na-eto eto karịa na mbụ, onye ọbụla nʼime unu na-etokwa nʼịhụnanya o nwere nye ibe ya. 4Ya mere, anyị onwe anyị na-anya isi nʼihi unu nʼetiti nzukọ niile nke Nna anyị, nʼihi ntachi obi na okwukwe unu nʼime mkpagbu na ahụhụ niile unu na-anagide.
5Nke a bụ ihe akaebe nke ikpe ziri ezi nke Nna anyị, na a gụrụ unu dị ka ndị kwesịrị ekwesị ịba nʼalaeze Nna anyị, bụ nke unu na-atakwa ahụhụ nʼihi ya. 6Ebe ọ bụ na Nna anyị bụ onye ziri ezi, ọ ga-akwụghachi nsogbu ndị na-enye unu nsogbu, 7ma nye unu bụ ndị na-ata ahụhụ izu ike, anyị na unu, mgbe a ga-ekpughe Onyenwe anyị Jisọs site nʼeluigwe, ya na ndị mmụọ ozi ya dị ike, 8nʼime ọkụ na-enwu enwu, na-eweta ikpe ziri ezi nʼahụ ndị na-amaghị Nna anyị, nakwa nʼahụ ndị na-anaghị erube isi nʼozi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs. 9Ha ga-ata ahụhụ nke mbibi ebighị ebi, nke a ga-ewezuga ha site nʼihu Onyenwe anyị na site nʼike ya dị ebube, 10nʼụbọchị ahụ, mgbe ọ ga-abịa ka e nye ya otuto nʼime ndị nsọ ya ma ṅachaa ya anya nʼetiti ndị niile kweere—nʼihi na e kwenyere nʼ ama anyị gbaara unu.
11Nʼihi nke a, anyị na-ekpekwara unu ekpere mgbe niile, ka Nna anyị gụọ unu dị ka ndị kwesịrị ọkpụkpọ ya, meekwa ka ọchịchọ ọbụla maka ihe ọma na ọrụ ọbụla nke okwukwe zuo oke site nʼike ya, 12ka e were otuto nye aha Onyenwe anyị Jisọs nʼime unu, ka e werekwa unu nye ya otuto nʼime ya, site nʼamara nke Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.