Amazaya Na-achị Juda
Amazaya gburu ndị gburu nna ya, ma hapụ ụmụ ha, dịka iwu Nna anyị kwuru. Ebe obi ya dị elu nʼihi imeri Edọm, ọ kpaliri Izrel ka ha lụọ agha, ma nweta akụkọ ifo banyere osisi ogwu dịka azịza, wee merie ya; e tiwara mgbidi Jerusalem. Emesịa ndị nke ya gbukwara ya.
14 1Nʼafọ nke abụọ nke Joash nwa Jehoahaz, eze Izrel, Amazaya nwa Joash ghọrọ eze Juda. 2Ọ ghọrọ eze mgbe ọ dị afọ iri abụọ na ise, chịakwa afọ iri abụọ na itoolu na Jerusalem. Aha nne ya bụ Jehoadin, onye Jerusalem. 3O mere ihe ziri ezi nʼanya Nna anyị—ma ọ bụghị dịka nna ya Devid; o mere ihe niile nna ya Joash mere. 4Naanị ebe dị elu ka e wezugaghị; ndị mmadụ ka na-achụ àjà ma na-esure ihe na-esi ísì ụtọ nʼebe ahụ. 5Mgbe alaeze ahụ guzosiri ike nʼaka ya, o gburu ndị ohu ahụ gburu eze, bụ nna ya.
6Ma o gbughị ụmụ ndị ogbu mmadụ ahụ, dịka e dere nʼakwụkwọ Iwu Mosis, ebe Nna anyị nyere iwu sị, “Ndị bụ nna agaghị anwụ nʼihi ụmụ ha, ụmụ agaghịkwa anwụ nʼihi nna ha; onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke ya.”
7O gburu puku mmadụ iri nʼime ndị Edọm na Ndagwurugwu Nnu, were agha dọta Sela, gụọ ya Joktel, nke bụ aha ya ruo taa.
8Amazaya zigaara Jehoash nwa Jehoahaz, nwa Jehu, eze Izrel, ndị ozi sị, “Bịa, ka anyị chee onwe anyị ihu na ihu.”
9Ma Jehoash eze Izrel zaghachiri Amazaya eze Juda okwu sị, “Ogwu dị na Lebanọn zigaara osisi sida dị na Lebanọn ozi sị, ‘Nye nwa m nwoke nwa gị nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.’ Ma otu anụ ọhịa dị na Lebanọn gafere zọtọọ ogwu ahụ. 10Ị tigburu Edọm, obi gị ejupụtakwala na mpako. Ṅụrịa ọṅụ nʼihe ahụ, ma nọrọ nʼụlọ gị. Gịnị mere ị ga-eji kpasuo nsogbu, nke ga-eme ka ị daa, gị na Juda so gị?”
11Ma Amazaya jụrụ ige ntị, ya mere Jehoash eze Izrel biliri gawa, ya na Amazaya eze Juda chere onwe ha ihu na ihu na Bet-shemesh nke dị na Juda. 12Izrel meriri Juda, onye ọbụla gbalagara nʼụlọ nke ya. 13Jehoash eze Izrel jidere Amazaya eze Juda, nwa Jehoash nwa Ahazaya, na Bet-shemesh, bịa na Jerusalem, kwatuo ihe ruru narị ụkwụ isii nke mgbidi ya, site nʼỌnụ Ụzọ Ámá Ifrem ruo nʼỌnụ Ụzọ Ámá Nkuku. 14O weere ọlaedo niile, ọlaọcha niile, na ngwongwo niile dị nʼụlọ Nna anyị na nʼụlọ akụ nke eze, tinyere ndị a dọọrọ nʼagha, laghachi na Sameria.
15Ọ bụ na e deghị ihe ndị ọzọ niile Jehoash mere, na ihe o mere, na ike ya, na otú o si lụso Amazaya eze Juda ọgụ, nʼakwụkwọ Akụkọ Ihe Mere Nʼoge Ndị Eze Izrel? 16Jehoash soro nna nna ya ha dinaa nʼọnwụ, e lie ya na Sameria nʼebe ndị eze Izrel nọ; Jeroboam nwa ya nọchiri anya ya chịa.
17Amazaya nwa Joash, eze Juda, dịrị ndụ afọ iri na ise mgbe Jehoash nwa Jehoahaz, eze Izrel, nwụsịrị. 18Ihe ndị ọzọ niile Amazaya mere—ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ Akụkọ Ihe Mere Nʼoge Ndị Eze Juda? 19Ha gbara izu nzuzo megide ya na Jerusalem; ọ gbalagara Lakish, ma ha zipụrụ ndị mmadụ ịchụso ya ruo Lakish gbuo ya nʼebe ahụ. 20Ha bu ya nʼelu ịnyịnya; e lie ya na Jerusalem nʼebe nna nna ya ha nọ, nʼObodo Devid.
21Ndị Juda niile weere Azaraya, onye gbara afọ iri na isii, mee ya eze nʼọnọdụ nna ya Amazaya. 22Ọ bụ ya wughachiri Elat, weghachikwara ya nye Juda mgbe eze ahụ soro nna nna ya ha dinaa nʼọnwụ.
Obi Ebere Nna nʼebe Izrel Nọ
23Nʼafọ nke iri na ise nke Amazaya nwa Joash eze Juda, Jeroboam nwa Joash eze Izrel malitere ịchị na Sameria, chịa afọ iri anọ na otu. 24O mere ihe ọjọọ nʼanya Nna anyị, ọ gbakụtaghị azụ nʼihe mmehie niile nke Jeroboam nwa Nebat, onye mere ka Izrel mehie. 25O weghachiri oke ala Izrel site na Lebo-hamat ruo nʼOsimiri Araba, dịka Nna anyị, bụ Chineke Izrel, si kwuo okwu site nʼaka ohu ya Jona nwa Amitai, onye amụma ahụ si na Gat-hefa. 26Nʼihi na Nna anyị hụrụ na nhụjuanya Izrel dị oke ilu, ọ dịghị onye fọdụrụ, ma ohu ma onye nweere onwe ya, ọ dịghịkwa onye ga-enyere Izrel aka. 27Ma Nna anyị ekwubeghị na ọ ga-ehichapụ aha Izrel site nʼokpuru eluigwe, ya mere o sitere nʼaka Jeroboam nwa Joash zọpụta ha. 28Ihe ndị ọzọ niile Jeroboam mere na ọrụ ya niile, na ike ya, na otú o si lụọ ọgụ, na otú o si weghachita Damaskọs na Hamat nye Juda nʼime Izrel—ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ Akụkọ Ihe Mere Nʼoge Ndị Eze Izrel? 29Jeroboam soro nna nna ya ha, bụ ndị eze Izrel, dinaa nʼọnwụ; Zekaraya nwa ya nọchiri anya ya chịa.