Devid Agbaba nʼEtiti Ndị Filistia
N'ịkwenye na Sọl ga-emesị jide ya, Devid gbapụrụ gakwuru Akish nke Gat, e nyekwa ya Ziklag. Ọ na-awakpo ndị bi na ndịda, gbuo onye akaebe ọ bụla, ma gwa Akish na ọ na-awakpo Juda. Akish kwere ya kpamkpam. Ọ dịghị ihe e kwesịrị ito ebe a, ihe edere edere na-akọ ya n'ụzọ doro anya.
27 1Devid chere nʼobi ya, sị, “Otu ụbọchị, aka Sọl ga-ala m nʼiyi. Ọ dịghị ihe dị mma nye m karịa ịgbanarị ozugbo gaa nʼala ndị Filistia. Mgbe ahụ, Sọl ga-akwụsị ịchọ m nʼebe ọbụla nʼoke ala Izrel, aga m esikwa nʼaka ya gbanarị.” 2Devid biliri gafee, ya na narị ndị ikom isii ya na ha nọ, gakwuru Akish nwa Maok, eze Gat. 3Devid na Akish binyere na Gat, ya na ndị ya, onye ọbụla na ezinụlọ ya—Devid na ndị nwunye ya abụọ, Ahinoam onye Jezril na Abigel onye Kamel, onye bụbu nwunye Nebal nwụrụ anwụ. 4Mgbe a gwara Sọl na Devid agbagaala Gat, ọ kwụsịrị ịchọ ya.
5Devid gwara Akish sị, “Ọ bụrụ na m natara ihuọma nʼaka gị, nye m ebe nʼotu nʼime obodo nta nke ime ala ka m biri na ya. Gịnị mere ohu gị ga-eji soro gị biri nʼobodo eze?” 6Nʼụbọchị ahụ, Akish nyere ya Ziklag; ya mere Ziklag ghọrọ nke ndị eze Juda ruo taa. 7Oge Devid biri nʼala ndị Filistia dị otu afọ na ọnwa anọ.
8Devid na ndị ya gbagoro bibie ala ndị Geshua, ndị Girzi, na ndị Amalek, nʼihi na ha ebiela nʼala ahụ site na mgbe ochie, ruo nʼakụkụ Shua ruo nʼala Ijipt. 9Mgbe ọbụla Devid busoro ala ahụ agha, ọ naghị ahapụ nwoke maọbụ nwaanyị ndụ, ọ na-ewere atụrụ, ehi, ịnyịnya ibu, ịnyịnya kamel, na uwe, ma laghachikwuru Akish.
10Akish na-ajụ ya, sị, “Ebee ka ị gara buso agha taa?” Devid na-asị, “Negev nke Juda,” “Negev nke ndị Jeramel,” maọbụ “Negev nke ndị Ken.”
11Devid anaghị ahapụ nwoke maọbụ nwaanyị ndụ nke ọ ga-akpọbata na Gat, nʼihi na ọ na-eche nʼobi ya, sị, “Ha nwere ike ịkọ banyere anyị, na-asị, ‘Nke a bụ ihe Devid mere.’” Nke a bụ omume ya oge niile ọ bịa nọ nʼala ndị Filistia.
12Akish tụkwasịrị Devid obi, na-eche nʼobi ya, sị, “O meela ka ndị ya, bụ ndị Izrel, kpọọ ya asị nke ukwuu; ọ ga-abụ ohu m ruo mgbe ebighị ebi.”