Ọ Dịghị Onye Na-eme Ezi Ihe
Nye onyeisi abụ. Nke e ji ụda Mahalat. Abụ amamihe nke Devid.
Ọ fọrọ obere ka ọ dị ka Abụ Ọma 14. Nna anyị na-elegharị anya nʼụmụ mmadụ niile ịchọ otu onye ghọtara ihe, ma ọ hụghị onye ọ bụla. Ndị na-eripịa ndị ya ka egwu jidere ebe ihe egwu na-adịghị. Ọ na-ejedebe na-agụ agụụ maka nzọpụta si na Zaịọn.
53 1Onye nzuzu na-asị nʼobi ya, “Chineke adịghị.” Ha rụrụ arụ, na-eme ajọ ihe rụrụ arụ; ọ dịghị onye na-eme ezi ihe.
2Nna anyị sitere nʼeluigwe ledata anya nʼebe ụmụ mmadụ niile nọ, ịhụ ma ọ dị onye nwere nghọta, onye ọbụla na-achọ ya. 3Ha niile akpafuola; ha niile aghọọla ndị rụrụ arụ; ọ dịghị onye na-eme ezi ihe, ọbụladị otu onye.
4Ndị na-eme ihe ọjọọ ọ maghị ihe ọbụla—bụ ndị na-eri ndị m dịka ha si eri achịcha, ndị na-adịghịkwa akpọku Nna anyị? 5Nʼebe ahụ ka egwu dị ukwuu tụrụ ha, nʼebe ọ dịghị ihe ọbụla a ga-atụ egwu ya; nʼihi na Nna anyị fesasịrị ọkpụkpụ nke onye ahụ mara ụlọikwuu imegide gị; i wetara ha ihere, nʼihi na Nna anyị ajụla ha.
6Ee, ka nzọpụta nke Izrel si na Zayọn pụta! Mgbe Nna anyị ga-eweghachite ọdịmma ndị ya, ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwee obi ụtọ.