Nna Anyị Na-adọ Aka Na Ntị: Gbanarịnụ Jerusalem
Jeremaya na-ele ka nnọchibido ahụ na-abịaru nso, na-anụkwa ndị ndú ka ha na-ekwe nkwa udo n'elu ọnya ha na-agwọghị. Nna anyị na-enye otu ụzọ mgbapụ: kwụsịnụ n'okporo ụzọ ndị gbara agbala, jụọnụ maka ụzọ ochie ahụ, jeekwanụ ije na ya. Ndị mmadụ zara na ha agaghị eje. Ọ kpọrọ ha ọlaọcha a jụrụ ajụ.
6 1“Gbaanụ ọsọ ndụ, unu ụmụ Benjamin, sitenụ na Jerusalem pụọ! Fụọnụ opi nʼTekoa, welienụ ihe ịrịba ama nʼelu Bet-hakerem, nʼihi na mbibi na-esite nʼugwu na-abịa, oke ịla nʼiyi. 2Ada Zayọn, onye mara mma ma dị nro—aga m ebibi ya. 3Ndị ọzụzụ atụrụ na igwe ewu na atụrụ ha ga-abịakwute ya; ha ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ya, onye ọbụla na-azụ anụ ụlọ ya nʼoke nke ya.”
4Jikerenụ ibu agha megide ya! Bịanụ, ka anyị buso ya agha nʼetiti ehihie! Ma ahụhụ dịịrị anyị, nʼihi na ụbọchị na-agafe, ndò nke mgbede na-etokwa ogologo. 5Bịanụ, ka anyị buso ya agha nʼabalị ma bibie ebe ya niile e wusiri ike!
6Nʼihi na Nna nke usuu ndị agha eluigwe na-ekwu, sị: Gbutuonụ osisi ya ma wuo mbudo ala e ji agba Jerusalem gburugburu. A ghaghị ịta obodo a ahụhụ; o nweghị ihe ọzọ dị nʼime ya ma ọ bụghị mmegbu. 7“Dịka olulu mmiri si edebe mmiri ya ọhụrụ, otu a ka o si edebe ajọ omume ya ọhụrụ. Ime ihe ike na mbibi na-ada ụda nʼime ya; ọrịa na mmerụ ahụ na-adịgide nʼihu m mgbe niile. 8Nara ịdọ aka na ntị, Jerusalem, ma ọ bụghị ya aga m esite nʼebe ị nọ chigharịa nʼọsọ nʼihi ịsọ oyi, meekwa gị ka ị tọgbọrọ nʼefu, ala ebe ọ dịghị onye bi.”
9Nna nke usuu ndị agha eluigwe na-ekwu, sị: Ha ga-atụtụcha ndị fọdụrụ nʼIzrel dịka e si atụtụcha osisi vaịn. Fefeekwa aka gị nʼalaka ya ọzọ, dịka onye na-atụtụ mkpụrụ vaịn.
10“Onye ka m ga-agwa okwu ma dọọ ya aka na ntị, ka ọ ga-ege ntị? Ntị ha mechiri emechi, ha enweghịkwa ike ịnụ ihe. Okwu Nna anyị bụụrụ ha ihe arụ; ha adịghịkwa aṅụrị ọṅụ nʼime ya.
11Ma iwe ọkụ Nna anyị jupụtara nʼime m; ike agwụla m ijide ya. Wụsa ya nʼahụ ụmụntakịrị nọ nʼokporo ụzọ, na nʼahụ ụmụ okorobịa gbakọrọ ọnụ; a ga-ejidekwa ma di ma nwunye, ndị meworo agadi na ndị kara nka.” 12A ga-enyefe ndị ọzọ ụlọ ha, ubi ha na nwunye ha nʼotu mgbe, nʼihi na aga m esetịpụ aka m megide ndị bi nʼala ahụ, ka Nna anyị kwubiri. 13Nʼihi na site nʼonye dịkarịsịrị ala ruo nʼonye dịkarịsịrị elu, ha niile bụ ndị anyaukwu nʼinweta uru nʼụzọ na-ezighị ezi; site nʼonye amụma ruo nʼonye nchụaja, ha niile na-eme aghụghọ. 14Ha na-ekechi ọnya ndị m dịka a ga-asị na ọ dịghị njọ. Ha na-asị, “Udo, udo,” mgbe udo na-adịghị. 15Ihere o mere ha maka omume rụrụ arụ ha? Mba, ihere emeghị ha ma ọlị; ha amaghịdị otu e si eme ihere. Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada; a ga-akwada ha mgbe m ga-ata ha ahụhụ, ka Nna anyị na-ekwu.
16Ihe a ka Nna anyị na-ekwu: Guzonụ nʼebe okporo ụzọ zukọrọ ma lee anya; jụọnụ maka ụzọ ochie ahụ, ebe ezi ụzọ dị, ma na-agawa nʼime ya, unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike. Ma ha sịrị, “Anyị agaghị aga nʼime ya.” 17Ahọpụtaara m unu ndị nche ma sị, “Geenụ ntị nʼụda opi ahụ!” Ma ha sịrị, “Anyị agaghị ege ntị.” 18“Nʼihi ya, geenụ ntị, unu mba niile; matakwanụ, unu ndị akaebe, ihe ga-adakwasị ha. 19Gee ntị, gị ụwa: ana m eweta mbibi nʼahụ ndị a, mkpụrụ nke atụmatụ nke aka ha, nʼihi na ha egeghị ntị nʼokwu m, jụkwara ozizi m. 20Gịnị bụ uru ụda na-esi ísì ụtọ nke si Sheba dịịrị m, maọbụ ahịhịa achara dị ụtọ nke si nʼala dị anya? Aja nsure ọkụ unu abụghị ihe a nabatara; aja unu na-achụ anaghịkwa atọ m ụtọ.”
21Nʼihi ya, ihe a ka Nna anyị na-ekwu: Aga m etinye ihe ịsọ ngọngọ nʼihu ndị a. Nne na nna na ụmụ ha ga-asọ ngọngọ nʼelu ha; ndị agbata obi na ndị enyi ga-ala nʼiyi.
22Ihe a ka Nna anyị na-ekwu: Lee, otu usuu ndị agha na-esite nʼala dị nʼugwu na-abịa; mba dị ukwuu na-esite na nsọtụ ụwa ebili. 23Ha ji ụta na ùbè nʼaka; ha dị obi ọjọọ, ha anaghịkwa egosi obi ebere. Ụda ha na-ebigbọ dịka oke osimiri mgbe ha na-agba ịnyịnya, ndị a haziri nʼusoro ibu agha megide gị, gị ada Zayọn.
24Anyị anụla akụkọ banyere ha, aka anyị adakwaala mba. Oke ihe mgbu ejidela anyị, ihe mgbu dịka nke nwanyị ime na-eme. 25Apụkwala gaa nʼubi maọbụ jee ije nʼokporo ụzọ, nʼihi na onye iro ji mma agha, ụjọ dịkwa nʼakụkụ niile. 26Ada ndị m, yikwasị uwe iru uju ma tụrụ onwe gị na ntụ; ruo ụjụ jiri oke iti mkpu ákwá, dịka nke e ji eru otu nwa nwoke, nʼihi na na mberede onye mbibi ahụ ga-abịakwasị anyị.
27“Emeela m gị onye na-anwale ọla nʼetiti ndị m, ka ị wee na-elebara ma na-anwale ụzọ ha. 28Ha niile bụ ndị nnupụisi obi tara mmiri, na-agagharị na-agbasa okwu nkwutọ. Ha bụ bronz na ígwè; ha niile na-eme ihe rụrụ arụ. 29Mkpịrịsị na-afụsi ọkụ ike iji jiri ọkụ repịa opu, ma nnụcha ahụ abaghị uru; e wezụgaghị ndị ajọ omume. 30A na-akpọ ha ọlaọcha a jụrụ ajụ, nʼihi na Nna anyị ajụla ha.”