Nna na-agwọ ọrịa site nʼaka Pita
Otu nwoke na-arịọ arịrịọ n'ọnụ ụzọ ama ụlọ nsọ ka a na-ebuga ebe ahụ kwa ụbọchị ná ndụ ya niile. Pita enweghị ego, kama o jidere ya n'aka, nwoke ahụ wee na-awụli elu baa n'ime. Pita siri ọnwụ gwa igwe mmadụ ahụ ibobo nwụrụ n'ahụ na ike ahụ abụghị nke ya kama ọ bụ nke Nna anyị.
3 1Pita na Jọn nọ na-arịgo nʼụlọnsọ ukwu ahụ nʼihe dịka elekere atọ nʼehihie, bụ oge ekpere. 2A na-ebu otu nwoke bụ onye ngwụrọ site nʼọmụmụ ya, na-edebe ya kwa ụbọchị nʼọnụ ụzọ ama ụlọnsọ ukwu ahụ a na-akpọ Mara Mma, ka ọ rịọọ ndị na-abanye nʼụlọnsọ ukwu ahụ arịrịọ. 3Mgbe ọ hụrụ Pita na Jọn ka ha na-achọ ịbanye nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ọ rịọrọ ha ego. 4Pita, na-elegidesi ya anya ike, ya na Jọn, sịrị, “Lee anyị anya.” 5O lekwasịrị ha anya, na-atụ anya inweta ihe site nʼaka ha. 6Pita sịrị, “Enweghị m ọlaọcha maọbụ ọlaedo, ma ana m enye gị ihe m nwere: nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret, bilie jee ije.” 7O jidere ya nʼaka nri, welie ya elu; ngwa ngwa, ụkwụ ya na nkwonkwo ụkwụ ya siri ike. 8O wuliri elu, guzoro ọtọ, malite ije ije, ya na ha banye nʼụlọnsọ ukwu ahụ, na-eje ije, na-awụli elu, na-etokwa Nna anyị. 9Ndị niile hụrụ ya ka ọ na-eje ije na-etokwa Nna anyị. 10Ha matara na ọ bụ onye arịrịọ ahụ nke na-anọdụ ala nʼỌnụ Ụzọ Ama Mara Mma nke ụlọnsọ ukwu ahụ, obi ha jupụtakwara nʼịtụnanya na nʼịju anya nʼihi ihe mere ya.
Pita na-ekwusa Odibo Nna anyị
11Ka ọ na-ejidesi Pita na Jọn ike, ndị niile gbakwuru ha nʼọlàlà ahụ a na-akpọ nke Sọlọmọn, na-atụ oké anya. 12Mgbe Pita hụrụ nke a, ọ sịrị ndị ahụ, “Ụmụ Izrel, gịnị mere nke a ji na-eju unu anya? Gịnị mere unu ji na-elegide anyị anya, dịka a ga-asị na ọ bụ site nʼike nke anyị onwe anyị maọbụ nʼịsọpụrụ Chineke ka anyị mere ka ọ jee ije? 13Chineke nke Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, Chineke nke nna nna anyị ha, enyela Odibo ya bụ Jisọs otuto, bụ onye unu raara nye ma gọnarị nʼihu Paịlet, mgbe Paịlet kpebiri ịhapụ ya. 14Ma unu gọnarịrị Onye Nsọ na Onye Ezi Omume ahụ, na-arịọ ka e nye unu otu ogbu mmadụ. 15Unu gburu Onye Mmalite nke ndụ; Nna anyị mere ka o si nʼọnwụ bilie. Anyị bụ ndị akaebe nke ihe a. 16Aha ya, site nʼokwukwe nʼaha ya, emeela ka nwoke a sie ike—bụ otu nwoke ahụ unu na-ahụ ma mara. Okwukwe nke dị na Jisọs enyekwala ya ahụ ike zuru oke a nʼihu unu niile.
17“Ugbu a, ụmụnna m, amaara m na unu mere ya nʼamaghị ama, dịka ndị ọchịchị unu meekwara. 18Ma Nna anyị mezuru ihe ọ buru nʼamụma site nʼọnụ ndị amụma niile: na Kraịst ya ga-ata ahụhụ. 19Ya mere, chegharịanụ, ma tụgharịa, ka e hichapụ mmehie unu, 20ka oge nke ume ọhụrụ wee si nʼihu Nna anyị bịa, na ka o wee zite Kraịst ahụ a họpụtaara unu, bụ Jisọs, 21onye eluigwe aghaghị ịnabata ruo mgbe a ga-eweghachi ihe niile, bụ nke Nna anyị kwuru site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ site na mgbe ochie. 22Mosis sịrị, ‘Nna unu ga-emeliteere unu onye amụma dịka m, site nʼetiti ụmụnna unu. Geenụ ya ntị nʼihe niile ọ ga-agwa unu.’ 23Onye ọbụla na-adịghị ege onye amụma ahụ ntị ka a ga-ebichapụ kpamkpam site nʼetiti ndị ahụ.’ 24Ndị amụma niile kwuru okwu, site na Samuel gaa nʼihu, kwusakwara banyere ụbọchị ndị a. 25Unu bụ ụmụ ndị amụma na ụmụ ọgbụgba ndụ ahụ Nna anyị na nna nna unu ha gbara, mgbe ọ gwara Ebraham, ‘Site na mkpụrụ gị ka a ga-agọzi ezinụlọ niile nke ụwa.’ 26Nna anyị meliteere Odibo ya ma zitere unu ya na mbụ, ka ọ gọzie unu site nʼime ka onye ọbụla nʼime unu si nʼajọ omume ya chegharịa.”