Sọl Chọrọ Igbu Devid
Jonatan mere ka obi nna ya dajụọ otu mgbe, ọ dịkwa otú ahụ ruo ùbe nke ọzọ. Maịkal sitere na windo budata Devid ma tinye arụsị n'akwa ya iji nweta oge. Ndị ozi Sọl na-ezigara ya na-anata Mmụọ Nna anyị na-ebu amụma kama ijide ya, mgbe ahụ Sọl n'onwe ya mekwara otú ahụ.
19 1Sọl gwara Jonatan nwa ya na ndị ohu ya niile okwu banyere igbu Devid. Ma Jonatan nwa Sọl nwere nnọọ mmasị nʼebe Devid nọ. 2Jonatan gwara Devid sị, “Sọl bụ nna m chọrọ igbu gị, ya mere kpachara anya nʼụtụtụ—zoo onwe gị ka a ghara ịhụ gị. 3Aga m apụ, guzo nʼakụkụ nna m nʼọhịa ebe ị nọ, gwa nna m okwu banyere gị—mgbe ahụ, agwa m gị ihe ọbụla m chọpụtara.”
4Jonatan kwuru ezi okwu banyere Devid nye nna ya Sọl sị ya, “Ka eze ghara imehie megide Devid bụ ohu ya, nʼihi na o mehieghị megide gị. Kama, ihe niile o mere abaarala gị ezigbo uru. 5O tinyere ndụ ya nʼihe ize ndụ igbu onye Filistia ahụ, Nna anyị wetakwaara Izrel niile mmeri dị ukwuu. Ị hụrụ ya ṅụrịakwa ọṅụ. Gịnị mere ị ga-eji mehie megide ọbara aka ya dị ọcha, na-egbu Devid nʼefu?”
6Sọl gere Jonatan ntị ṅụọ iyi sị, “Dịka Nna anyị na-adị ndụ, a gaghị egbu Devid.”
7Jonatan kpọrọ Devid gwa ya ihe ndị a niile, mesịa kpọta ya nʼihu Sọl, Devid jeeretụkwara ya ozi dịka ọ dị na mbụ.
8Agha dapụtakwara ọzọ. Devid pụrụ lụso ndị Filistia agha, tie ha oke ihe otiti, ha agbapụ nʼihu ya.
9Ma mmụọ na-emerụ ahụ si nʼaka Nna anyị bịakwasịrị Sọl mgbe ọ nọ ọdụ nʼụlọ ya, jide ùbe nʼaka ya, Devid na-akpọkwa ụbọ akwara. 10Sọl gbalịrị iji ùbe ya kpọgide Devid nʼaja, ma Devid zeere ya, ùbe ahụ makwara nʼaja. Devid gbapụrụ gbanarị nʼabalị ahụ. 11Sọl zipụrụ ndị ikom ka ha chee ụlọ Devid nche gbuo ya nʼisi ụtụtụ. Maịkal nwunye Devid dọrọ ya aka na ntị sị, “Ọ bụrụ na ị gbapụghị nʼabalị a, ị ga-anwụ nʼụtụtụ.” 12Ya mere Maịkal sitere na windo wetuo Devid, ọ gbapụ gbanarị. 13Mgbe ahụ, Maịkal weere arụsị ụlọ ahụ tọgbọ ya nʼelu ihe ndina, were akwa ajị ewu tụkwasị nʼisi ya, jirikwa akwa kpuchie ya. 14Mgbe Sọl zipụrụ ndị ozi ka ha jide Devid, Maịkal sịrị, “Ọ na-arịa ọrịa.”
15Ya mere Sọl zighachiri ndị ozi ahụ ka ha hụ Devid, sị, “Buterenụ m ya nʼelu ihe ndina ya, ka m gbuo ya.” 16Mgbe ndị ozi ahụ batara, arụsị ụlọ ahụ dị nʼelu ihe ndina, akwa ajị ewu dịkwa nʼisi ya.
17Sọl sịrị Maịkal, “Gịnị mere i ji ghọgbuo m otu a, hapụ onye iro m ka ọ gbanarị?” Maịkal sịrị Sọl, “Ọ gwara m sị, ‘Hapụ m ka m laa, gịnị ka m ga-eji gbuo gị?’”
18Devid gbapụrụ gbanarị, bịakwute Samuel na Rema, kọọrọ ya ihe niile Sọl mere ya. Mgbe ahụ, ya na Samuel gara biri na Naiọt. 19A gwara Sọl sị, “Devid nọ na Naiọt dị na Rema.” 20Sọl zipụrụ ndị ozi ka ha jide Devid. Ma mgbe ha hụrụ ìgwè ndị amụma ka ha na-ebu amụma, Samuel guzoro dịka onyendu ha, Mmụọ nke Nna anyị bịakwasịrị ndị ozi Sọl, ha onwe ha buokwa amụma. 21A gwara Sọl; o zipụrụ ndị ozi ndị ọzọ, ha onwe ha buokwa amụma. Sọl zipụrụkwa ndị ozi ọzọ, nke ugboro atọ, ha onwe ha buokwa amụma. 22Nʼikpeazụ, Sọl nʼonwe ya gara Rema, rute nʼolulu mmiri ukwu ahụ dị na Seku. Ọ jụrụ sị, “Ebee ka Samuel na Devid nọ?” Otu onye zara sị, “Ha nọ na Naiọt dị na Rema.”
23Ọ gara Naiọt dị na Rema, ma Mmụọ nke Nna anyị bịakwasịrị ya onwe ya, ọ na-aga nʼihu na-ebu amụma, ruo mgbe o rutere na Naiọt dị na Rema. 24Ya onwe ya yipụkwara uwe ya, buo amụma nʼihu Samuel, dinaa ọtọ ụbọchị ahụ niile na abalị ahụ niile. Ya mere, ndị mmadụ na-asị, “Sọl ọ sokwa nʼetiti ndị amụma?”