Amamihe Na-eme Ka Ihu Na-amụ
Amamihe na-adụ ọdụ ka mmadụ kpachara anya nʼihu eze na-eme ihe masịrị ya. Ọ dịghị onye na-achị ifufe maọbụ ụbọchị ọnwụ. Ikpe a na-egbu oge ime na-enye ajọ omume obi ike, ọtụtụ mgbe kwa ndị ezi omume na-anata ihe kwesịrị ndị ajọ omume. Onye Nkuzi na-eto iri ihe ụtọ, ma kwere na mmadụ apụghị ịchọpụta ọrụ Chineke.
8 1Onye yiri onye maara ihe? Onye maara ihe ihe pụtara? Amamihe mmadụ na-eme ka ihu ya na-amụ amụ, ọ na-emekwa ka ihu ya siri ike gbanwee.
2Ana m asị, debe iwu eze, nʼihi iyi ị ṅụrụ nʼihu Chineke.
Otú Ị Ga-esi Nagide Ike Eze
3Emela ngwa ngwa ịhapụ ihu ya, emekwala ka i guzosie ike nʼọrụ ọjọọ, nʼihi na eze na-eme ihe ọbụla masịrị ya. 4Nʼihi na okwu eze nwere ikike kachasị, onye kwanụ pụrụ ịsị ya, “Gịnị ka ị na-eme?” 5Onye ọbụla na-edebe iwu agaghị amata ihe ọjọọ ọbụla, obi maara ihe maara oge na ụzọ. 6Ihe ọbụla nwere oge ya na ụzọ ya, ọ bụ ezie na nsogbu mmadụ dị arọ nʼahụ ya. 7Nʼihi na ọ dịghị onye maara ihe ga-eme, onye kwanụ ga-agwa ya otú ọ ga-esi dịrị? 8Ọ dịghị onye na-achị ikuku iji jide ya, ọ dịghịkwa onye na-achị ụbọchị ọnwụ. Ọ dịghị onye a na-ahapụ nʼagha ahụ, ajọ omume agaghịkwa anapụta ndị na-eme ya. 9Ahụrụ m ihe ndị a niile, mgbe m tụkwasịrị obi m nʼọrụ ọbụla a na-arụ nʼokpuru anyanwụ—oge mmadụ na-achị ibe ya nke na-emerụ ya ahụ.
Mgbe O Yiri Ka Ikpe Ziri Ezi Na-egbu Oge
10Mgbe ahụ, ahụrụ m ka e liri ndị ajọ omume, ka ha zukwara ike; ha na-abịa ma na-apụ nʼebe nsọ ahụ, a na-etokwa ha nʼobodo ebe ha mere otú ahụ. Nke a bụkwa ihe efu. a a v10 Ebe nsọ ahụ na-ezo aka nʼụlọnsọ ukwu Jerusalem. 11Nʼihi na a naghị ebu ọsọ kpee ikpe maka ajọ omume, obi ụmụ mmadụ jupụtara nʼichepụta ime ihe ọjọọ. 12Ọ bụ ezie na onye mmehie na-eme ihe ọjọọ otu narị ugboro ma dịrịkwa ndụ ogologo oge, ma amaara m na ihe ga-agara ndị na-atụ egwu Chineke nke ọma, bụ ndị na-atụ egwu nʼihu ya. 13Ihe agaghị agara ndị ajọ omume nke ọma, ha agaghịkwa eme ka ụbọchị ha dị ogologo dịka onyinyo, ebe ọ bụ na ha anaghị atụ egwu Chineke.
14Ihe efu na-eme nʼụwa: ndị ezi omume na-anata ihe kwesịrị ndị ajọ omume, ndị ajọ omume na-anatakwa ihe kwesịrị ndị ezi omume. Asịrị m na nke a bụkwa ihe efu. 15Ya mere, etoro m iṅụrị ọṅụ: ọ dịghị ihe dị mma nye mmadụ nʼokpuru anyanwụ karịa iri nri, ịṅụ ihe ọṅụṅụ na inwe obi ụtọ. Nke a na-eso ya nʼime ndọgbu ọrụ ya niile, nʼụbọchị ndụ ya niile Chineke nyere ya nʼokpuru anyanwụ.
16Mgbe m tụkwasịrị obi m ịmata amamihe na ịhụ ọrụ a na-arụ nʼụwa, bụ ihe mere na anya mmadụ anaghị ahụ ụra ehihie maọbụ abalị. 17Mgbe ahụ, ahụrụ m ọrụ Chineke niile: ọ dịghị onye pụrụ ịchọpụta ọrụ a na-arụ nʼokpuru anyanwụ. Nʼagbanyeghị otú mmadụ si gbalịsie ike ịchọ ya, ọ gaghị achọta ya; ọ bụrụgodị na ndị maara ihe sị na ha maara ya, ha apụghị ịchọpụta ya.