Ka Na-eto Eto nʼime Nna
Ndị Kọrịnt na-ekewa nʼòtù ndị na-eso otu onye — mụ na-eso Pọl, mụ na-eso Apọlọs — Pọl kpọrọ ya ịbụ nwa ọhụrụ. Onye na-akụ mkpụrụ na onye na-agba mmiri abụghị ihe ọbụla; ọ bụ Nna anyị na-eme ka ihe too. Ihe onye ọbụla na-ewu nʼelu otu ntọala ahụ ka ọkụ ga-egosipụta.
3 1Ụmụnna m, enweghị m ike ịgwa unu okwu dịka ndị nke Mmụọ, kama dịka ndị nke anụ ahụ—ụmụntakịrị nʼime Kraịst. 2Enyere m unu mmiri ara, ọ bụghị nri siri ike, nʼihi na unu adịbeghị njikere. Ọ bụladị ugbu a, unu adịbeghị njikere. 3Unu ka bụ ndị anụ ahụ. Ebe ọ bụ na ekworo na esemokwu dị nʼetiti unu, unu abụghị ndị anụ ahụ, na-ebi ndụ dịka ụkpụrụ mmadụ si dị? 4Nʼihi na mgbe otu onye na-asị, “Ana m eso Pọl,” onye ọzọ na-asị, “Ana m eso Apọlọs,” unu anaghị eme dịka naanị mmadụ efu?
5Gịnị kwanụ ka Apọlọs bụ? Gịnị ka Pọl bụ? Ha bụ ndị odibo unu sitere nʼaka ha kwere ekwe, onye ọbụla dịka Onyenwe anyị nyere ya. 6Akụrụ m mkpụrụ, Apọlọs gbakwara ya mmiri, ma Nna anyị mere ka o too. 7Ya mere, onye na-akụ ihe abụghị ihe ọbụla, onye na-agba ya mmiri abụghịkwa ihe ọbụla—kama ọ bụ naanị Nna anyị, onye na-eme ka o too. 8Onye na-akụ ihe na onye na-agba ya mmiri bụ otu; onye ọbụla ga-anata ụgwọ ọrụ nke ya maka ọrụ nke aka ya. 9Nʼihi na anyị bụ ndị anyị na Nna anyị na-arụkọ ọrụ; unu bụ ubi ya, na ụlọ ya.
10Site nʼamara Nna anyị nyere m, atọrọ m ntọala dịka onye ọka ǹka mara ihe, onye ọzọ na-ewukwasị ya. Ka onye ọbụla lezie anya otú ọ na-esi ewukwasị ya. 11Nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịtọ ntọala ọzọ karịa nke a tọọlarị, nke bụ Jisọs Kraịst. 12Ugbu a, ọ bụrụ na onye ọbụla ewukwasị na ntọala ahụ ọlaedo, ọlaọcha, nkume dị oké ọnụ ahịa, osisi, ahịhịa, maọbụ okporo ọka, 13ọrụ onye ọbụla ga-apụta ìhè, nʼihi na Ụbọchị ahụ ga-ekpughe ya, nʼihi na ọ bụ nʼime ọkụ ka a ga-ekpughe ya, ọkụ ahụ ga-anwalekwa ụdị ọrụ onye ọbụla rụrụ. 14Ọ bụrụ na ọrụ onye ọbụla wuru ga-anọgide, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ. 15Ọ bụrụ na ọrụ onye ọbụla gbaa ọkụ, ọ ga-ata ọghọm—ma a ga-azọpụta ya onwe ya, mana naanị dịka onye si nʼime ọkụ gafee.
16Ọ bụ na unu amaghị na unu bụ ụlọnsọ Nna anyị, nakwa na Mmụọ nke Nna anyị bi nʼime unu? 17Ọ bụrụ na onye ọbụla ebibie ụlọnsọ Nna anyị, Nna anyị ga-ebibi ya. Nʼihi na ụlọnsọ Nna anyị dị nsọ, ụlọnsọ ahụ bụkwa unu.
18Ka onye ọbụla ghara ịghọgbu onwe ya. Ọ bụrụ na onye ọbụla nʼetiti unu na-eche na ya maara ihe nʼoge a, ka ọ ghọọ onye nzuzu, ka o wee bụrụ onye maara ihe. 19Nʼihi na amamihe nke ụwa a bụ nzuzu nʼanya Nna anyị. Nʼihi na Akwụkwọ Nsọ na-asị, “Ọ na-ejide ndị maara ihe site nʼaghụghọ ha,” 20ọzọkwa, “Nna anyị maara echiche niile nke ndị maara ihe, na ha bụ ihe efu.” 21Ya mere, ka onye ọbụla ghara ịnya isi nʼihi mmadụ. Nʼihi na ihe niile bụ nke unu, 22maọbụ Pọl maọbụ Apọlọs maọbụ Sefas, maọbụ ụwa maọbụ ndụ maọbụ ọnwụ, maọbụ ihe dị ugbu a maọbụ ihe gaje ịbịa—ha niile bụ nke unu, 23unu bụkwa nke Kraịst, Kraịst bụkwa nke Nna anyị.