Ịdị Arọ nke Mmehie M
Abụ Ọma Devid, maka icheta ihe.
Ọ na-arịa ọrịa, ọnya ya na-ere ure, ndị enyi ya hapụrụ ya mgbe ndị iro na-agba izu, Devid na-ahụ na ọnọdụ ya si na mmehie nke ya, ọ gaghịkwa aza ndị na-ebo ya ebubo. Ọ gbachiri nkịtị dịka onye ntị chiri, na-echere Nna ya, naanị onye ọ na-atụ anya na ọ ga-aza ya.
38 1Nna m, abarala m mba nʼiwe gị, atakwala m ahụhụ nʼọnụma gị. 2Nʼihi na àkụ gị amabanyela m nʼime omimi, aka gị adakwasịkwala m ike. 3Ọ dịghị ahụ ike nʼime anụ ahụ m nʼihi iwe gị; ọ dịghị izuoke nʼime ọkpụkpụ m nʼihi mmehie m.
4Nʼihi na mmehie m agabigala isi m; dịka ibu dị arọ, ha dị arọ karịrị m. 5Ọnya m na-esi ìsì ma na-ere ure nʼihi nzuzu m. 6Ehulatala m, akpọọkwa m isi ala nke ukwuu; ogologo ụbọchị niile ka m na-ejegharị nʼiru ụjụ. 7Nʼihi na akụkụ ahụ m abụọ na-enwu ọkụ, ọ dịghịkwa izuoke nʼime anụ ahụ m.
8Ahụ adịla m nkịrị, egweriekwala m egwerie; ana m asụ ude nʼihi ọgbaghara nke obi m. 9Nna m, Onye na-achị achị, agụụ m niile dị nʼiru gị, ịsụ ude m ezokwaghị gị ezo. 10Obi m na-akụ ọsọ ọsọ, ike na-agwụ m; ọbụna ìhè nke anya m apụọla nʼebe m nọ. 11Ndị enyi m na ndị òtù m na-anọpụ iche site nʼahụhụ m, ndị ikwu m kacha nso na-eguzokwa nʼebe dị anya.
12Ndị na-achọ ndụ m na-esiri m ọnya; ndị na-achọ imerụ m ahụ na-ekwu okwu mbibi, na-atụkwa atụmatụ aghụghọ ogologo ụbọchị niile. 13Ma mụ onwe m dị ka onye ntị chiri nke na-apụghị ịnụ ihe, dị ka onye na-apụghị ikwu okwu, nke na-agaghị emeghe ọnụ ya. 14Aghọọla m dị ka mmadụ nke na-adịghị anụ ihe, onye na-enweghị ọsịsa nʼọnụ ya. 15Ma ọ bụ gị, Nna m, ka m na-echere; ọ bụ gị ga-aza, Nna m, Onye na-achị achị.
16Nʼihi na asịrị m, “Ka ha ghara ịchị m ọchị ma ọlị—bụ ndị na-anya isi megide m mgbe ụkwụ m na-agbuchapụ.” 17Nʼihi na adịla m njikere ịda, ihe mgbu m na-adịgidekwa nʼiru m mgbe niile. 18Ana m ekwupụta ikpe ọmụma m; mmehie m na-ewutekwa m. 19Ma ndị iro m dị ndụ ma sikwa ike, ndị na-akpọ m asị nʼefu dịkwa ọtụtụ.
20Ndị ji ihe ọjọọ na-akwụghachi m ụgwọ ezi ihe m mere na-ebo m ebubo nʼihi na ana m achụso ihe ọma. 21Ahapụla m, Nna m; anọrọla m nʼebe dị anya, Nna m. 22Mee ngwa inyere m aka, Nna m, Onye na-achị achị, nzọpụta m.