Agaghị m Agba Nkịtị
Otu onye jụrụ ịgbachi nkịtị ruo mgbe a ga-ahụ nzọpụta Jerusalem, o tinyekwara ndị nche ka ha na-esogbu Nna anyị ehihie na abalị. A na-agbanwe aha ya: ọ bụghị Onye A Gbahapụrụ na Onye Tọgbọrọ n'Efu, kama Obi Ụtọ M Dị n'Ime Ya, na Onye Alụrụ Alụ. Nna ya na-aṅụrị ọṅụ n'ihi ya dị ka onye na-alụ nwunye ọhụrụ.
62 1Nʼihi Zayọn, agaghị m agba nkịtị, nʼihi Jerusalem, agaghị m ezu ike, ruo mgbe ezi omume ya ga-enwupụta dịka chị ọbụbọ, na nzọpụta ya dịka ọwa ọkụ na-enwu enwu. 2Mba niile ga-ahụ ezi omume gị, ndị eze niile ga-ahụkwa ebube gị; a ga-akpọkwa gị aha ọhụrụ nke Nna anyị nʼonwe ya ga-enye gị. 3Ị ga-abụ okpueze mara mma nʼaka Nna anyị, okpueze alaeze nʼaka Nna anyị. 4A gaghịzi akpọ gị Onye A Gbahapụrụ, a gaghịzi akpọ ala gị Ebe Tọgbọrọ Nʼefu; kama a ga-akpọ gị Hefziba—Obi M Na-atọ Ụtọ Nʼime Ya—na ala gị Biula—Onye A Lụrụ Alụ; nʼihi na obi Nna anyị na-atọ ụtọ nʼime gị, a ga-alụkwa ala gị. 5Nʼihi na dịka nwokorobịa si alụ agbọghọbịa, otu a ka ụmụ gị ndị ikom ga-esi lụọ gị; dịka nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ si aṅụrị ọṅụ nʼihi nwunye ya, otu a ka Nna gị ga-esi ṅụrịa ọṅụ nʼihi gị.
6Nʼelu mgbidi gị, Jerusalem, edebela m ndị nche; ogologo ụbọchị niile na abalị niile ha agaghị agba nkịtị. Unu ndị na-echetara Nna anyị, unu ezuzula ike, 7unu enyekwala ya ohere izu ike ruo mgbe o guzobere Jerusalem ma mee ka a na-eto ya nʼụwa niile.
8Site nʼaka nri ya ka Nna anyị ṅụrụ iyi, sitekwa nʼogwe aka ike ya: “Agaghị m enyezi ndị iro gị ọka gị ka ọ bụrụ nri, ndị ala ọzọ agaghịkwa aṅụ mmanya ọhụrụ nke ị dọgburu onwe gị nʼọrụ maka ya; 9kama ndị na-ewe ya ga-eri ya ma too Nna anyị, ndị na-achịkọta ya ga-aṅụ ya nʼogige ụlọnsọ m.”
10Gafee, gafee nʼọnụ ụzọ ama niile! Dozie ụzọ maka ndị ahụ. Wuo, wuo okporo ụzọ ukwu ahụ; kpochapụ nkume niile; welie ọkọlọtọ nʼelu mba niile.
11Lee, Nna anyị ekwusaala ruo na nsọtụ ụwa niile: Gwa ada Zayọn, sị, “Lee, nzọpụta gị na-abịa; lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka, na ihe nkwụghachi ya dị nʼihu ya.” a a v11 Mkpughe 22:12 kpọrọ aha Onye a na-abịa — Jisọs sịrị, “Lee, ana m abịa ngwa ngwa, na-ebutere ụgwọ ọrụ m.”
12A ga-akpọkwa ha Ndị Dị Nsọ, Ndị Nna anyị Gbapụtara; a ga-akpọkwa gị Onye A Chọsiri Ike, Obodo A Na-agbahapụghị.