Ihe Niile Ọhụrụ
Usoro ochie ahụ agafeela, Nna anyị bịakwara biri nʼetiti mmadụ—ya onwe ya bụ Nna ha, na-ehichapụ anya mmiri dị ha nʼihu. Obodo ahụ na-arịdata, a tụọlarị ya, e ji nkume dị oke ọnụ chọọ ya mma, ọnụ ụzọ ámá dịkwa nʼakụkụ ya niile, ọ dịghị ụlọ nsọ nʼime ya nʼihi na ya na Nwa Atụrụ ahụ bụ ụlọ nsọ ya, ọ dịghịkwa abalị ga-eme ka a kpọchie ọnụ ụzọ ámá ya.
21 1Mgbe ahụ, ahụrụ m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nʼihi na eluigwe mbụ na ụwa mbụ agafeela, osimiri adịghịkwa. 2Ahụrụ m obodo nsọ ahụ, bụ Jerusalem ọhụrụ, ka ọ na-esi nʼeluigwe na-arịdata, site nʼebe Nna anyị nọ, dị njikere dịka nwaanyị a na-alụ ọhụrụ nke e jiri uwe chọọ mma maka di ya.
3Anụrụ m oke olu nke si nʼocheeze ahụ na-asị, “Lee, ebe obibi Nna anyị dị nʼetiti ụmụ mmadụ. Ọ ga-ebiri ha; ha ga-abụ ndị nke ya, ya onwe ya, bụ Nna ha, ga-anọnyere ha.
4Nna anyị ga-ehichapụ anya mmiri niile nʼanya ha, ọnwụ agaghịkwa adị, iru uju agaghịkwa adị, mkpu ákwá agaghịkwa adị, ihe mgbu agaghịkwa adịkwa, nʼihi na ihe mbụ ndị ahụ agafeela.”
5Onye ahụ nọ ọdụ nʼocheeze ahụ sịrị, “Lee, ana m eme ihe niile ka ọ dị ọhụrụ.” O kwukwara, sị, “Depụta nke a: okwu ndị a bụ ihe a pụrụ ịtụkwasị obi na nke bụ eziokwu.” 6Ọ gwara m, sị, “E mezuola ya. Abụ m Alfa na Omega, bụ mmalite na njedebe. Onye akpịrị na-akpọ nkụ ka m ga-enye nʼefu site nʼisi iyi nke mmiri nke ndụ. 7Onye ọbụla meriri ga-eketa ihe ndị a, aga m abụkwara Nna ya, ọ ga-abụkwa nwa m nwoke. 8Ma ndị ụjọ, ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi, ndị rụrụ arụ, ndị ogbu mmadụ, ndị na-akwa iko, ndị mgbaasị, ndị na-efe arụsị, na ndị ụgha niile—oke ha dị nʼọdọ mmiri nke na-ere ọkụ na sọlfọ, bụ ọnwụ nke abụọ.”
9Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ahụ, bụ ndị ji efere asaa ahụ nke jupụtara nʼihe otiti asaa ikpeazụ ahụ, bịara gwa m, sị, “Bịa, aga m egosi gị Nwaanyị a na-alụ ọhụrụ ahụ, bụ nwunye Jisọs, bụ Nwa Atụrụ ahụ.” 10O jiri Mmụọ ahụ buru m gaa nʼelu ugwu dị ukwuu ma dị elu, gosi m obodo nsọ ahụ, bụ Jerusalem, ka ọ na-esi nʼeluigwe na-arịdata site nʼebe Nna anyị nọ, 11na-egosipụta ebube Nna anyị, nke na-enwu enwu dịka nkume dị oké ọnụ ahịa karịa nke ọzọ, bụ jaspa, nke dị ọcha dịka kristal. 12O nwere mgbidi dị ukwuu ma dị elu nke nwere ọnụ ụzọ ama iri na abụọ, ndị mmụọ ozi iri na abụọ guzo nʼọnụ ụzọ ndị ahụ, e deturu aha ebo iri na abụọ nke ụmụ Izrel nʼebe ahụ, 13nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ọnụ ụzọ atọ, nʼakụkụ ugwu ọnụ ụzọ atọ, nʼakụkụ ndịda ọnụ ụzọ atọ, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ọnụ ụzọ atọ. 14Mgbidi obodo ahụ nwere ntọala iri na abụọ, nke bu aha iri na abụọ nke ndị ozi iri na abụọ nke Jisọs, bụ Nwa Atụrụ ahụ.
15Onye ahụ mụ na ya na-ekwurịta okwu ji osisi ọla edo e ji atụ ihe, ka o were tụọ obodo ahụ, na ọnụ ụzọ ya, na mgbidi ya. 16Obodo ahụ dị akụkụ anọ, ogologo ya ha nha na obosara ya. O jiri osisi ya tụọ ya: ihe dịka otu puku na narị anọ maịl—ogologo, obosara, na ịdị elu ya ha nha. 17Ọ tụkwara mgbidi ya—ihe dịka narị abụọ na iri fiit, dịka mmadụ si atụ ihe, nke bụkwa nke mmụọ ozi ahụ. 18E ji jaspa wuo mgbidi ahụ, ebe obodo ahụ bụ ọla edo a nụchara anụcha, nke dị ọcha dịka enyo. 19E ji ụdị nkume dị oké ọnụ ahịa niile chọọ ntọala mgbidi obodo ahụ mma: nke mbụ bụ jaspa, nke abụọ bụ safaịa, nke atọ bụ aget, nke anọ bụ emerald, 20nke ise bụ ọniks, nke isii bụ kanielian, nke asaa bụ krisolaịt, nke asatọ bụ beril, nke itoolu bụ topaz, nke iri bụ krisopres, nke iri na otu bụ jasint, na nke iri na abụọ bụ ametist. 21Ọnụ ụzọ ama iri na abụọ ahụ bụ nkume pel iri na abụọ, e ji otu nkume pel mee ọnụ ụzọ ọbụla. Okporo ụzọ obodo ahụ bụ ọla edo a nụchara anụcha, nke dị ọcha dịka enyo.
22Ahụghị m ụlọ nsọ ọbụla nʼime obodo ahụ, nʼihi na ụlọ nsọ ya bụ Nna ahụ bụ Onye kacha elu, Onye pụrụ ime ihe niile, na Jisọs, bụ Nwa Atụrụ ahụ. 23Obodo ahụ achọghị anyanwụ ma ọ bụ ọnwa ka ọ na-amụkwasị ya ìhè—ebube Nna anyị na-enye ya ìhè, oriọna ya bụkwa Jisọs, bụ Nwa Atụrụ ahụ. 24Mba niile ga-ejegharị site nʼìhè ya, ndị eze ụwa ga-ebubata ebube ha nʼime ya. 25Ọnụ ụzọ ya agaghị emechi mgbe ọbụla nʼehihie—abalị agaghịkwa adị nʼebe ahụ. 26Ha ga-ebubata nʼime ya ebube na nsọpụrụ nke mba niile. 27Ọ dịghị ihe rụrụ arụ ọbụla ga-abanye nʼime ya, ọ dịghịkwa onye na-eme ihe rụrụ arụ ma ọ bụ ihe ụgha—naanị ndị e dere aha ha nʼakwụkwọ nke ndụ nke Jisọs, bụ Nwa Atụrụ ahụ.