Nwa Atụrụ ahụ na Mmadụ 144,000
Nwa Atụrụ ahụ guzo nʼelu Zayọn ya na ndị 144,000 e ji aha Nna ya tinye akara, ndị maara abụ nke ọ dịghị onye ọzọ pụrụ ịmụta. Ndị mmụọ ozi atọ na-efe nʼelu: ozi ọma nye mba niile, ọdịda Babilọn, ịdọ aka na ntị nye ndị na-efe anụ ọhịa ahụ. Mgbe ahụ, a na-ewe ihe ubi ụwa, a na-azọchakwa mkpụrụ vaịn.
14 1Ahụrụ m Nwa Atụrụ ahụ, bụ Jisọs, ka o guzo nʼelu Ugwu Zayọn, ya na mmadụ 144,000 ndị e dere aha ya na aha Nna ya nʼegedege ihu ha. 2Anụrụ m olu si nʼeluigwe nke dị ka uzu ọtụtụ mmiri na-ebigbọ na dị ka oke egbe eluigwe, olu ahụ m nụkwara dị ka ndị na-akpọ ụbọ akwara na-akpọ ụbọ akwara ha. 3Ha bụrụ abụ ọhụrụ nʼihu ocheeze ahụ, na nʼihu anụ anọ ahụ dị ndụ, na nʼihu ndị okenye; ọ dịghị onye nwere ike ịmụta abụ ahụ karịa naanị mmadụ 144,000 ahụ a gbapụtara site nʼụwa. 4Ndị a bụ ndị na-emerụghị onwe ha site nʼiso ụmụ nwanyị, nʼihi na ha bụ ndị dị ọcha, ndị na-amabeghị nwanyị. Ha na-eso Jisọs, bụ Nwa Atụrụ ahụ, ebe ọbụla ọ na-aga; a zụpụtara ha site nʼetiti ụmụ mmadụ, ka ha bụrụ mkpụrụ mbụ nye Nna anyị na Nwa Atụrụ ahụ, 5ọ dịghịkwa okwu ụgha a chọtara nʼọnụ ha; ha bụ ndị na-enweghị ntụpọ.
Oziọma Ebighị Ebi Ahụ Na-apụ Pụọ
6Ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efe nʼetiti mbara igwe, o jikwa oziọma ebighị ebi nke ọ ga-ezisa nye ndị bi nʼụwa—mba ọbụla, na ebo ọbụla, na asụsụ ọbụla, na ndị ọbụla. 7O ji oke olu tie mkpu, sị, “Tụọnụ Nna anyị egwu, nyekwanụ ya otuto, nʼihi na awa ikpe ya eruola. Feenụ onye kere eluigwe, na ụwa, na oke osimiri, na isi iyi mmiri niile ofufe.”
8Mmụọ ozi nke abụọ sochiri ya, sị, “Ọ daala, Babilọn ukwu ahụ adaala, bụ onye mere ka mba niile ṅụọ mmanya nke agụụ mmehie ịkwa iko ya.”
9Mmụọ ozi nke atọ sochiri ha, na-eti mkpu, sị, “Onye ọbụla na-efe anụ ọhịa ahụ na onyinyo ya ofufe, ma na-anara akara nʼegedege ihu ya maọbụ nʼaka ya, 10ya onwe ya ga-aṅụkwa mmanya nke iwe Nna anyị, bụ nke a na-agwakọtaghị ihe ọbụla nʼime ya, nke a wụrụ nʼiko oke iwe ya, a ga-atakwa ya ahụhụ nʼọkụ na nʼihe na-enwu ọkụ bụ sọlfọ nʼihu mmụọ ozi nsọ ndị ahụ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. 11Anwụrụ ọkụ nke ahụhụ ha na-arịgo elu ruo mgbe ebighị ebi; ọ dịghị izuike ehihie maọbụ abalị nye ndị na-efe anụ ọhịa ahụ na onyinyo ya ofufe, maọbụ nye onye ọbụla na-anara akara aha ya.”
12Nke a bụ ntachi obi nke ndị nsọ: bụ ndị na-edebe iwu Nna anyị ma na-ejidesi okwukwe ha nʼime Jisọs ike.
13Anụrụ m olu si nʼeluigwe na-asị, “Dee ihe a: Ngọzi na-adịrị ndị nwụrụ anwụ, bụ ndị na-anwụ nʼime Onyenwe anyị site ugbu a gaa nʼihu.” Mmụọ Nsọ na-asị, “Ee,” “ha na-ezu ike site nʼọrụ ha niile, nʼihi na ọrụ ha na-eso ha.”
Onye Yiri Nwa nke Mmadụ
14Elere m anya, hụ igwe ojii na-acha ọcha, onye yiri Nwa nke Mmadụ—bụ Jisọs—nọkwasịrị nʼelu ya, o nwere okpueze ọlaedo nʼisi ya, na mma owuwe ihe ubi dị nkọ nʼaka ya. 15Mmụọ ozi ọzọ sitere nʼụlọnsọ ukwu ahụ pụta, were oke olu tikuo onye ahụ nọkwasịrị nʼelu igwe ojii, sị, “Tinye mma owuwe ihe ubi gị, wee ghọọ ihe ubi; nʼihi na awa iwe ihe ubi eruola, ihe ubi nke ụwa achaala nke ọma.” 16Ya mere, onye ahụ nọkwasịrị nʼelu igwe ojii feghariri mma owuwe ihe ubi ya nʼelu ụwa, a wee ghọọ ihe ubi nke ụwa.
17Mgbe ahụ, mmụọ ozi ọzọ sitere nʼụlọnsọ ukwu ahụ dị nʼeluigwe pụta, ya onwe ya nwekwara mma owuwe ihe ubi dị nkọ. 18Mmụọ ozi ọzọ, bụ onye nwere ikike nʼebe ọkụ dị, sitere nʼebe ịchụ àjà pụta, jiri oke olu tikuo onye ahụ jidere mma owuwe ihe ubi dị nkọ, sị, “Zipu mma owuwe ihe ubi gị dị nkọ, chịkọta ùkwù mkpụrụ si nʼosisi vaịn nke ụwa, nʼihi na mkpụrụ ya achaala.” 19Mmụọ ozi ahụ tụbara mma owuwe ihe ubi ya nʼụwa, ghọrọ mkpụrụ osisi vaịn nke ụwa, tụba ya nʼime nnukwu ebe ịzọcha mmanya nke iwe Nna anyị. 20A zọchara ihe nʼebe ịzọcha mmanya ahụ nʼazụ obodo ahụ, ọbara wee si nʼebe ịzọcha mmanya ahụ sọpụta, ruo nʼọnụ eriri ịnyịnya nʼịdị elu ya, gbasaa ihe dị ka narị maịl na iri asatọ.