Izuoke nʼime Ụlọ M
Abụ ọma Devid.
Iwu omume onye ọchịchị debere onwe ya. O kwere nkwa idebe ihe efu n'ebe anya ya na-adịghị, ime ka onye na-ekwu okwu ọjọọ na nzuzo mechie ọnụ, ịnara naanị ndị kwesịrị ntụkwasị obi n'ọrụ, ghara ikwe ka onye ụgha biri n'ụlọ ya — na kwa ụtụtụ isachapụ ndị na-eme ihe ọjọọ n'obodo.
101 1Ọ bụ ịhụnanya ọgbụgba ndụ na ikpe ziri ezi ka m ga-abụ abụ; nye gị, Nna m, ka m ga-akpọ egwu. 2Aga m akpachara anya soro ụzọ na-enweghị ntụpọ. Olee mgbe ị ga-abịakwute m? Aga m eji obi zuruoke jee ije nʼime ụlọ m. 3Agaghị m edobe ihe efu ọbụla nʼihu anya m. Akpọrọ m ọrụ ndị na-adahie asị; ọ gaghị arapara m ahụ. 4Obi gbagọrọ agbagọ ga-apụ nʼebe m nọ; agaghị m amata ihe ọjọọ ọbụla. 5Onye ọbụla nke na-ekwutọ onye agbata obi ya na nzuzo, ọ bụ ya ka m ga-eme ka ọ gba nkịtị; onye nwere anya dị elu na obi mpako, agaghị m anagide ya. 6Anya m dị nʼahụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi nʼala ahụ, ka ha wee soro m biri; onye na-aga ije nʼụzọ na-enweghị ntụpọ ga-ejere m ozi. 7Onye ọbụla na-eme aghụghọ agaghị ebi nʼime ụlọ m; onye ọbụla na-ekwu okwu ụgha agaghị eguzosi ike nʼihu anya m. 8Ụtụtụ ọbụla, aga m eme ka ndị ajọ omume niile nọ nʼala ahụ gba nkịtị, na-ebipụ onye ọbụla na-eme ihe ọjọọ site nʼobodo Nna anyị.