Ọ dị ugbu a dị ka akwụkwọ e biri ebi

Job 25 FHB Father's Heart Bible™

NnaJisọsMmụọ
Mbelata 15% nʼihe mbụ ị zụrụ →
Akwụkwọ

Bildad Kwukwara Okwu Ọzọ

Okwu ikpeazụ Bildad bụ amaokwu isii, o nweghịkwa ihe fọdụrụ n'ime ya karịa ịdị anya: ọchịchị bụ nke Chineke, ọbụna ọnwa na kpakpando adịghị ọcha n'anya ya, gịnịkwa ka mmadụ bụ? Ikpuru, okpukpu. Arụmụka ndị enyi ahụ agwụla okwu.

Isi 25.

Mgbe ahụ Bildad onye Shua zara sị: “Ọchịchị na egwu bụ nke ya; ọ na-eme ka udo dịrị nʼebe ya niile dị elu. Ọ dị onye pụrụ ịgụ ọnụ usuu ndị agha ya? Ìhè ya ọ naghị enwu nʼahụ mmadụ niile? Olee otú mmadụ nwụ anwụ ga-esi bụrụ onye ezi omume nʼihu Chineke? Olee otú onye nwanyị mụrụ ga-esi dị ọcha? Lee, ọ bụladị ọnwa adịghị enwu, kpakpando adịghịkwa ọcha nʼanya ya; ọ ga-esikwa aṅaa dịkwuo mmadụ, onye bụ ikpuru, na nwa mmadụ, onye bụ idide!”