Lee Ka Aha Gị Si Dị Ebube
Nye onyeisi ndị ọbụ abụ: dịka usoro Gịtịt si dị. Abụ Devid.
Mgbe ọ na-ele mbara igwe nʼabalị, onye ọbụ abụ ọma ahụ jụrụ ihe mere Onye Kere ọnwa na kpakpando ga-eji hụ ụdị ihe e kere eke dị nta otú a. Azịza ya abụghị na ndị mmadụ dị ukwuu, kama na Nna anyị ji nsọpụrụ kpube ha okpueze ma nyefee ha ọrụ aka ya.
8 1O! Nna anyị, Onye na-achị achị, lee ka aha gị si dị ebube nʼụwa niile! I doola otuto gị nʼelu eluigwe. 2Site nʼọnụ ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara ka i guzobere ike, nʼihi ndị iro gị, iji mechie onye iro na onye na-abọ ọbọ ọnụ. 3Mgbe m na-ele eluigwe gị anya, bụ ọrụ mkpịsị aka gị, ọnwa na kpakpando bụ nke i doro nʼọnọdụ ha, 4gịnị ka mmadụ bụ na ị na-echeta ha, nwa nke mmadụ na ị na-elekọta ya? a a v4 Onye dere akwụkwọ Ndị Hibru jiri okwu ndị a kọwaa banyere Jisọs — Nwa nke Mmadụ ahụ onye e mere ka ọ dị ala karịa ndị mmụọ ozi nwa oge nta, mgbe ahụ e kpukwasịrị ya okpueze nke otuto na nsọpụrụ (Ndị Hibru 2:6-9). 5Ma i meela ka ọ dị ntakịrị ala karịa ndị bi nʼeluigwe, i kpukwasịkwala ya okpueze nke otuto na nsọpụrụ. 6I nyela ya ikike ọchịchị nʼelu ọrụ aka gị niile; i debela ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya: 7atụrụ na ehi niile, nakwa anụmanụ ọhịa, 8nnụnụ nke eluigwe, na azụ nke oké osimiri, ihe ọbụla na-agafe nʼụzọ nke oké osimiri. 9O! Nna anyị, Onye na-achị achị, lee ka aha gị si dị ebube nʼụwa niile!