Olileanya A Na-atụfe, Ọchịchọ Emezuru
Ego na agụụ ọchịchọ gbagara nʼime ya, site nʼime ka à ga-asị na ị bụ ọgaranya mgbe ị na-enweghị ihe ọbụla ruo nʼaghụghọ na-ebelata ebe ịchekọ ego nwayọọ nwayọọ na-amụba. Ọ kpọkwara mgbu nke ichere aha, nʼihi na olileanya a na-egbu oge na-eme ka obi ria ọrịa. Ndị ị na-eso na-akpa mkpa: soro ndị maara ihe jee ije, ị ga-amakwa ihe.
13 1Nwa maara ihe na-aṅa ntị na ndụmọdụ nna ya, ma onye nleli adịghị aṅa ntị na ịba mba. 2Site na mkpụrụ ọnụ ya, mmadụ na-erite ezi ihe nʼuru, ma ọchịchọ ndị aghụghọ bụ ime ihe ike. 3Onye na-eche ọnụ ya nche na-echebe ndụ ya, ma onye na-asaghe egbugbere ọnụ ya nke ukwuu ga-ala nʼiyi. 4Onye umengwụ na-achọsi ike ma ọ dịghị ihe ọ na-enweta, ma ọchịchọ ndị na-arụsi ọrụ ike ka a na-emeju nke ọma. 5Onye ezi omume na-akpọ okwu ụgha asị, ma onye ajọ omume na-eweta ihere na nkọcha. 6Ezi omume na-echebe onye ụzọ ya zuru okè, ma ajọ omume na-akwatu onye mmehie. 7Otu onye na-eme ka ọ bụ ọgaranya, ma o nweghị ihe ọ bụla; onye ọzọ na-eme ka ọ bụ ogbenye, ma o nwere nnukwu akụ. 8Akụ mmadụ pụrụ ịgbapụta ndụ ya, ma ogbenye adịghị anụ okwu iyi egwu. 9Ìhè ndị ezi omume na-enwu nʼọṅụ, ma oriọna ndị ajọ omume ka a ga-emenyụ. 10Nganga na-emepụta naanị esemokwu, ma amamihe dị nʼebe ndị na-achọ ndụmọdụ nọ. 11Akụ e nwetara site nʼaghụghọ na-agwụ agwụ, ma onye na-achịkọta ya ntakịrị ntakịrị na-eme ka ọ baa ụba. 12Olileanya a na-atụfe na-eme ka obi daa mba, ma ọchịchọ emezuru bụ osisi ndụ. 13Onye na-eleda okwu anya na-ewetara onwe ya mbibi, ma onye na-atụ egwu iwu ahụ ka a ga-akwụ ụgwọ. 14Ozizi nke onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ, nke na-eme ka mmadụ si nʼọnya ọnwụ wezuga onwe ya. 15Ezi nghọta na-enweta ihuọma, ma ụzọ ndị aghụghọ bụ mbibi ha. 16Onye ọ bụla nwere uche na-eji ihe ọmụma eme ihe, ma onye nzuzu na-egosipụta enweghị uche ya. 17Onyeozi ajọ omume na-adaba na nsogbu, ma onyeozi kwesịrị ntụkwasị obi na-eweta ọgwụgwọ. 18Ịda ogbenye na ihere na-abịakwute onye na-eleghara ịdọ aka na ntị anya, ma onye na-aṅa ntị na ndozi ka a na-asọpụrụ. 19Ọchịchọ emezuru na-atọ mkpụrụobi ụtọ, ma ịhapụ ihe ọjọọ bụ ihe ndị nzuzu kpọrọ asị. 20Onye ya na ndị maara ihe na-ejegharị ga-amaba ihe, ma enyi ndị nzuzu ga-ata ahụhụ. 21Ọdachi na-achụ ndị mmehie, ma ihe ọma bụ ụgwọ ọrụ ndị ezi omume. 22Ezigbo mmadụ na-ahapụrụ ụmụ ụmụ ya ihe nketa, ma akụ onye mmehie ka a na-akpakọbara ndị ezi omume. 23Ala ubi ndị ogbenye nke a na-akọghị akọ pụrụ ịmịpụta nri hiri nne, ma a na-azachapụ ya nʼihi enweghị ikpe ziri ezi. 24Onye na-egbochi mkpara na-akpọ nwa ya asị, ma onye hụrụ ya nʼanya anaghị egbu oge ịdọ ya aka na ntị. 25Onye ezi omume na-eri ihe ruo mgbe afọ ju ya, ma afọ ndị ajọ omume na-agụ agụụ.