Isi Iyi nke Anya Mmiri
Jeremaya chọrọ ka o nwee ike ikwa ákwá na-akwụsịghị, ma ọ bụ hapụ kpamkpam, n'ihi na ndị agbata obi na ụmụnne emeela ụgha ka ọ bụrụ nka. Nna anyị kwuru na a ga-eme ka obodo ahụ tọgbọ chakoo ma chụsasịa ya. Naanị ihe kwesịrị ịnya isi na ya bụ ịmara ya — ịhụnanya kwesịrị ntụkwasị obi, ikpe ziri ezi, ezi omume, ihe na-atọ ya ụtọ n'ezie.
9 1Ọ dị m ka isi m bụrụ isi iyi mmiri, anya m abụọ bụrụkwa isi iyi anya mmiri, ka m wee na-akwa ákwá ehihie na abalị nʼihi ndị e gburu egbu nʼime ada ndị m! 2Ọ dị m ka m nwere nʼime ọzara ebe obibi nke onye njem, ka m wee hapụ ndị m pụọ nʼebe ha nọ! Nʼihi na ha niile bụ ndị na-akwa iko, otu ìgwè ndị aghụghọ.
3Ha na-eji ire ha agba dịka ụta; ọ bụ okwu ụgha, ọ bụghị ikwesị ntụkwasị obi, ka e mere ka o sie ike nʼala ahụ. Ha na-esite nʼihe ọjọọ na-aga nʼihe ọjọọ ọzọ, ha amaghịkwa m, ka Nna anyị kwupụtara.
4Ka onye ọbụla kpachara anya nʼebe onye agbata obi ya nọ, ka ọ ghara ịtụkwasị nwanne ọbụla obi; nʼihi na nwanne ọbụla bụ onye aghụghọ, onye agbata obi ọbụla na-agagharịkwa na-ekwutọ ndị ọzọ.
5Onye ọbụla na-aghọgbu onye agbata obi ya, o nwekwaghị onye na-ekwu eziokwu; ha azụọla ire ha ịkwu okwu ụgha, na-eji ime ihe ọjọọ agwụ onwe ha ike. 6Ị bi nʼetiti aghụghọ; site nʼaghụghọ ha, ha jụrụ ịmara m, ka Nna anyị kwupụtara.
7Ya mere, otu a ka Nna nke usuu ndị agha eluigwe kwuru: Lee, ana m aga ịnụcha ha, nwaa ha, nʼihi na olee ụzọ ọzọ m ga-esi mee, nʼihi ada ndị m? 8Ire ha bụ àkụ na-egbu egbu; ọ na-ekwu okwu aghụghọ. Onye ọbụla na-eji ọnụ ya na-agwa onye agbata obi ya okwu udo, ma nʼime obi ya, ọ na-esiri ya ọnya. 9Ọ́ bụ na m agaghị ata ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a? ka Nna anyị kwupụtara. Ọ́ bụ na m agaghị eme ka ikpe ziri ezi bịakwasị mba dị otu a? 10“Aga m akwa ákwá ma tie mkpu nʼihi ugwu ukwu ndị ahụ, wee bulie abụ ákwá nʼihi ebe ịta nri anụ ụlọ nke ọzara, nʼihi na e tikpọọla ha, o nwekwaghị onye na-esi nʼebe ahụ agafe, a naghịkwa anụ ụda ehi na-ebe. Site nʼanụ ufe nke eluigwe ruo nʼanụ ọhịa, ha niile agbapụla wee pụọ. 11Aga m eme Jerusalem ka ọ ghọọ ebe mkpọmkpọ ebe, ọgba nkịta ọhịa; aga m emekwa ka obodo niile nke Juda ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu, nke mmadụ na-agaghị ebi.”
12Onye bụ onye maara ihe nke ga-aghọta nke a? Ọ bụ onye ka ọnụ Nna anyị gwara okwu, ka ọ kọwaa ihe mere ala ahụ jiri laa nʼiyi, repịa ọkụ dịka ọzara, nke mmadụ na-adịghị agafe?
13Nna anyị sịrị: Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara iwu m azụ, bụ nke m nyere ha, ha egeghịkwa olu m ntị, maọbụ jee ije nʼime ya, 14kama ha ji isiike soro ọchịchọ nke obi ha wee gbasoo Baal ndị ahụ, dịka nna nna ha si kuziere ha. 15Ya mere, Nna nke usuu ndị agha eluigwe, bụ Nna anyị nke Izrel, sịrị: Aga m enye ndị a nri na-elu ilu, nyekwa ha mmiri nsí ka ha ṅụọ. 16Aga m achụsa ha nʼetiti mba ndị ha na nna nna ha na-amaghị, zipụ mma agha ka ọ chụọ ha ruo mgbe m ga-ala ha nʼiyi.
17Otu a ka Nna nke usuu ndị agha eluigwe kwuru: Tuleenụ ihe a! Kpọọnụ ndị inyom maara nke ọma ịkwa ákwá; zigaara ndị nwere nka iti mkpu ákwá ozi ka ha bịa. 18Ka ha mee ngwangwa bulie mkpu ákwá nʼihi anyị, ka anya mmiri si nʼanya anyị na-asọ, ka mmiri gbapụtakwa site nʼọnụ mbubo anya anyị.
19Nʼihi na olu iti mkpu ákwá ka a na-anụ site na Zayọn: Lee ka e si laa anyị nʼiyi! Ihere emeela anyị nke ukwuu, nʼihi na anyị ahapụla ala anyị, nʼihi na ha akwatuola ebe obibi anyị. 20Ugbu a, nụrụnụ okwu Nna anyị, unu ndị inyom; ka ntị unu nabata okwu nke ọnụ ya. Kuzieere ụmụ unu ndị inyom iti mkpu ákwá, onye ọbụla kuzikwaara onye agbata obi ya abụ ákwá. 21Nʼihi na ọnwụ arịgoola site na windo anyị; ọ banyela nʼime obí anyị, na-egbupụ ụmụntakịrị site nʼokporo ụzọ na ụmụ okorobịa site nʼama.
22Kwuo, sị: Otu a ka Nna anyị kwupụtara: Ozu ndị mmadụ ga-ada dịka nsị anụ nʼelu ọhịa, dịka ùkwù ọka ndị a hapụrụ nʼazụ onye na-ewe ihe ubi, nke onye ọbụla na-adịghị achịkọta.
23Otu a ka Nna anyị kwuru: Ka onye maara ihe ghara ịnya isi nʼihi amamihe ya, ka onye dị ike ghara ịnya isi nʼihi ike ya, ka ọgaranya ghara ịnya isi nʼihi akụ ya; 24kama ka onye na-anya isi were nke a nya isi: na ọ ghọtara ma mara m—na mụ onwe m bụ Nna gị, onye na-eme ihe nʼịhụnanya na-adịgide, na ikpe ziri ezi, na ezi omume nʼelu ụwa; nʼihi na ọ bụ nʼihe ndị a ka obi m na-atọ ụtọ, ka Nna anyị kwupụtara.
25Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, ka Nna anyị kwupụtara, mgbe m ga-ata ndị niile e biri ugwu naanị nʼanụ ahụ ahụhụ. 26Ijipt, Juda, Edọm, ụmụ Amọn, Moab, na ndị niile na-akpụcha ntutu dị ha nʼakụkụ isi, bụ ndị bi nʼọzara. Nʼihi na mba ndị a niile bụ ndị a na-ebighị ugwu, ụlọ Izrel niile bụkwa ndị obi ha siri ike.