Ọ dị ugbu a dị ka akwụkwọ e biri ebi

Jemis 4 FHB Father's Heart Bible™

NnaJisọsMmụọ
Mbelata 15% nʼihe mbụ ị zụrụ →
Akwụkwọ

Esemokwu Si Nʼọchịchọ Pụta

Ọgụ na-esite n'agụụ ọjọọ na-alụ agha n'ime; ha enweghị n'ihi na ha anaghị arịọ, ma ha na-arịọ n'ụzọ na-ezighị ezi mgbe ha rịọrọ. Ịbụ enyi ụwa bụ iro megide Nna anyị, ma ọ na-enye amara karịa. Bịaruonụ ya nso, kwụsịkwanụ ịhazi echi dị ka a ga-asị na ndụ abụghị alụlụ.

Isi 4.

Ebee ka agha na ọgụ dị nʼetiti unu si abịa? Ọ bụghị site nʼọchịchọ unu nke na-alụ agha nʼime unu? Unu na-achọ ihe ma unu enweghị ya, unu na-egbu mmadụ. Unu na-enwe oke ọchịchọ ma unu enweghị ike inweta ya, unu na-ese okwu na-alụkwa ọgụ. Unu enweghị nʼihi na unu adịghị arịọ. Unu na-arịọ ma unu adịghị anata, nʼihi na unu na-arịọ nʼụzọ na-ezighị ezi, ka unu were ya mefuo nʼihe ụtọ nke anụ ahụ unu. Unu ndị na-akwa iko! Ọ bụ na unu amaghị na ịbụ enyi ụwa bụ ịkpọ Nna anyị asị? Onye ọbụla họọrọ ịbụ enyi ụwa na-aghọ onye iro Nna anyị. Ka ọ bụ na Akwụkwọ Nsọ na-ekwu okwu nʼefu, mgbe ọ na-asị na mmụọ ahụ o tinyere nʼime anyị na-achọsi ike nʼekworo? Ma ọ na-enye amara karịa. Ọ bụ ya mere Akwụkwọ Nsọ ji sị, “Nna anyị na-eguzogide ndị mpako ma na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”

Ya mere, nyefeenụ onwe unu nʼaka Nna anyị. Guzogidenụ ekwensu, ọ ga-agbakwa unu ọsọ. Bịarutenụ Nna anyị nso, ọ ga-abịarutekwa unu nso. Sachaanụ aka unu, unu ndị mmehie; meenụ ka obi unu dị ọcha, unu ndị nwere obi abụọ. Nweenụ mwute, ruonụ ụjụ, bekwaanụ ákwá. Tụgharịanụ ọchị unu ka ọ ghọọ iru ụjụ, na ọṅụ unu ka ọ ghọọ oke mwute. Wedaanụ onwe unu ala nʼihu Nna anyị, ọ ga-ebulikwa unu elu.

Unu ekwujọla ibe unu, ụmụnna m. Onye ọbụla na-ekwujọ nwanne ya, maọbụ na-ekpe ya ikpe, na-ekwujọ iwu ma na-ekpekwa ya ikpe. Ma ọ bụrụ na ị na-ekpe iwu ikpe, ị naghị edebe ya, kama ị na-ekpe ya ikpe. Ọ bụ naanị otu onye na-enye iwu ma na-ekpe ikpe—onye nwere ike ịzọpụta na ibibi. Gịnị ka ị bụ nke ị ga-eji kpee onye agbata obi gị ikpe?

Unu Anyala Isi Maka Echi

Geenụ ntị ugbu a, unu ndị na-asị, “Taa maọbụ echi anyị ga-aga nʼobodo a maọbụ nke ọzọ, nọrọ otu afọ, zụọ ahịa ma rite uru.” Unu amaghị ihe echi ga-eweta. Gịnị ka ndụ unu bụ? Nʼihi na unu bụ naanị alụlụ, nke a na-ahụ anya nwa oge nta, emesịa na-apụ apụ. Kama ihe unu kwesịrị ịsị bụ, “Ọ bụrụ na Nna anyị chọọ, anyị ga-adị ndụ meekwa nke a maọbụ nke ọzọ.” Ma dịka ọ dị ugbu a, unu na-anya isi nʼime mpako unu. Ịnya isi ọbụla dị otu a bụ ihe ọjọọ. Ya mere, onye ọbụla maara ezi ihe ọ ga-eme ma hapụ ime ya, ọ bụụrụ ya mmehie.