Ọkụ Ahụ Ọ Dịghị Onye Pụrụ Ịzụ
Ndị nkuzi ga-enweta ikpe siri ike karị, ihe kpatara ya bụ ire: ihe ntụzi ụgbọ, ọkụ nta, nsi ọ dịghị onye na-eme ka ọ dị nwayọọ. Otu ọnụ ahụ na-agọzi Nna anyị ma na-akọcha ndị mmadụ e kere n'oyiyi ya. Ezi amamihe na-egosi onwe ya n'omume udo na nke ebere, ọ bụghị n'ọchịchọ ilu ilu.
3 1Ụmụnna m, ka ọtụtụ nʼime unu ghara ịbụ ndị nkuzi, ebe anyị bụ ndị nkuzi ga-anata ikpe siri ike karịa. 2Nʼihi na anyị niile na-asọ ngọngọ nʼọtụtụ ụzọ. Onye ọ bụla na-adịghị asọ ngọngọ nʼokwu ọnụ ya bụ onye tozuru oke, onye pụrụkwa ịchịkwa ahụ ya niile. 3Ọ bụrụ na anyị etinye igwe nʼọnụ ịnyịnya ka ha rube isi nye anyị, anyị na-eduzikwa ahụ ha niile. 4Tulee ụgbọ mmiri kwa: ọ bụ ezie na ha buru ibu, ọ bụkwa oke ifufe na-akwaga ha, ma otu obere ihe nduzi na-achị ha gaa ebe ọ bụla onye na-anya ụgbọ chọrọ. 5Otu a kwa, ire bụ obere akụkụ ahụ, ma ọ na-anya isi banyere ihe ukwu ukwu. Lee ka obere ọkụ si amụnye oke ọhịa ọkụ! 6Ire bụ ọkụ, ọ bụ ụwa nke ajọ omume etinyere nʼetiti akụkụ ahụ anyị. Ọ na-emerụ ahụ niile, na-amụnye usoro ndụ niile ọkụ, ọ bụkwa ala mmụọ na-amụnye ya onwe ya ọkụ. a a v6 Gehena bụ Ndagwurugwu Hinọm nke dị nʼèzí Jerusalem, ebe a na-akpọ mkpofu ọkụ, nke ghọrọ ihe atụ nke ikpe ikpeazụ — nʼebe a, bụ ala mmụọ nʼonwe ya. 7Ụdị anụ ọ bụla, nnụnụ, anụ na-akpụ akpụ, na anụmanụ nke oké osimiri, ka ụmụ mmadụ na-azụ, zụkwaala, 8ma ọ dịghị mmadụ ọ bụla nwere ike ịzụ ire. Ọ bụ ihe ọjọọ na-adịghị anọ jụụ, nke jupụtara na nsi na-egbu egbu. 9Anyị na-eji ya eto Nna anyị; anyị na-ejikwa ya na-abụ ụmụ mmadụ ọnụ, bụ ndị e kere nʼoyiyi Nna anyị. 10Site nʼotu ọnụ ahụ ka otuto na ịbụ ọnụ si apụta. Ụmụnna m, nke a ekwesịghị ịdị otu a. 11Isi iyi ọ na-asọpụta mmiri dị ụtọ na mmiri dị ilu site nʼotu ebe ọ na-asọpụta? 12Ụmụnna m, osisi fig ọ pụrụ ịmị mkpụrụ oliv, ka ọ bụ osisi vaịnị ịmị mkpụrụ fig? Otu a kwa, isi iyi nnu apụghị inye mmiri dị ụtọ.
Amamihe Si Nʼelu
13Onye nʼime unu maara ihe ma nwee nghọta? Ya were ezi akparamagwa gosi ọrụ ya niile, nʼobi umeala nke amamihe na-eweta. 14Ma ọ bụrụ na ekworo dị ilu na ọchịchọ nkeonwe jupụtara nʼobi unu, unu anyala isi, unu aghakwala ụgha megide eziokwu. 15Nke a abụghị amamihe ahụ nke si nʼelu na-arịdata, kama ọ bụ nke ụwa, nke na-abụghị nke mmụọ, nke mmụọ ọjọọ. 16Nʼihi na ebe ekworo na ọchịchọ nkeonwe dị, ọgba aghara na ụdị ajọ omume rụrụ arụ niile ga-adịkwa. 17Amamihe nke si nʼelu dị otu a: nke mbụ, ọ dị ọcha, mgbe ahụ ọ na-ahụ udo nʼanya, dị nwayọọ, na-ege ntị, jupụtara nʼebere na ezi mkpụrụ, na-adịghị ekpe ikpe na-ezighị ezi, na-enweghị ihu abụọ. 18Owuwe ihe ubi nke ezi omume bụ nke a na-akụ nʼudo site nʼaka ndị na-eme udo.