Nna anyị Na-agwa Ugwu Okwu Olileanya
Ezikiel na-agwa ala ahụ n'onwe ya okwu: ugwu ndị mba dị iche iche kwara emo ga-abụ ebe a na-akọ ugbo, ndị mmadụ ga-ejupụtakwa ya ọzọ. Nna anyị kwuru n'ụzọ doro anya na ọ na-eme ihe n'ihi aha nke ya, ọ bụghị n'ihi na ha kwesịrị ya, site na mmiri dị ọcha, obi anụ ahụ n'ọnọdụ obi nkume, na Mmụọ ya n'ime ha.
36 1Ma gị, nwa nke mmadụ, buoro ugwu Izrel amụma sị: Ugwu Izrel, nụrụnụ okwu Nna anyị. 2Nna anyị, Onye kachasị ihe niile sịrị: Nʼihi na onye iro ekwuola banyere unu sị, “Ahaa! Ebe niile dị elu nke oge ochie aghọwọrọ nke anyị ugbu a,” 3nʼihi ya, buo amụma sị: Nna anyị, Onye kachasị ihe niile sịrị: Nʼihi na ha mere ka unu tọgbọrọ nʼefu ma zọgbuo unu site nʼakụkụ niile, si otú a unu ghọrọ ihe nketa nke mba ndị fọdụrụ, ghọọkwa ihe asịrị na nkwutọ nke ndị mmadụ,
4nʼihi ya, ugwu Izrel, nụrụnụ okwu Nna anyị, Onye kachasị ihe niile. Ihe ndị a ka Nna anyị, Onye kachasị ihe niile na-agwa ugwu na ugwu nta, ọwa mmiri na ndagwurugwu, mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu na obodo ndị a gbahapụrụ, bụ ndị ghọrọ ihe nkwakọrọ na ihe ọchị nye mba ndị fọdụrụ gbara gburugburu:
5nʼihi ya, Nna anyị, Onye kachasị ihe niile sịrị: Nʼekworo m na-ere ọkụ, ekwuola m okwu megide mba ndị fọdụrụ na Edọm niile, bụ ndị jiri obi ọṅụ zuru oke na nlelị dị ukwuu kwuo na ala m bụ nke ha, ka ha kwakọrọ ebe ịta nri ya. 6Ya mere, buo amụma banyere ala Izrel; gwa ugwu na ugwu nta, ọwa mmiri na ndagwurugwu, sị: Nna anyị, Onye kachasị ihe niile sịrị: Ekwuola m okwu nʼekworo m na nʼọnụma m, nʼihi na unu ebuola nkọcha nke mba ndị ọzọ. 7Ya mere, Nna anyị, Onye kachasị ihe niile sịrị: Eweliela m aka m elu ṅụọ iyi—mba ndị gbara unu gburugburu ga-ebu nkọcha nke aka ha.
8Ma unu, ugwu Izrel, ga-epupụta alaka ma mịa mkpụrụ nye ndị m bụ Izrel, nʼihi na ha na-abịa nso ịlọta nʼụlọ. 9Nʼihi na anọnyeere m unu; aga m echigharị chee unu ihu, a ga-akọkwa unu ma ghaa unu mkpụrụ. 10Aga m eme ka ndị mmadụ baa ụba nʼelu unu—ụlọ Izrel niile dum. A ga-ebikwa nʼobodo ndị ahụ, wughachikwa mkpọmkpọ ebe ndị ahụ. 11Aga m eme ka mmadụ na anụmanụ baa ụba nʼelu unu; ha ga-amụ ọmụmụ ma baa ụba. Aga m eme ka e biri nʼelu unu dịka ọ dị nʼoge gara aga, mesoo unu mma karịa ka ọ dị na mbụ. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Nna unu. 12Aga m eme ka ndị mmadụ jee ije nʼelu unu—ụmụ m bụ Izrel; ha ga-enweta unu, unu ga-abụkwara ha ihe nketa, unu agaghịkwa eme ka ha ghara inwe ụmụ ọzọ.
13Nna anyị, Onye kachasị ihe niile sịrị: Nʼihi na ha na-agwa unu sị, “Unu na-eri ndị mmadụ, na-anapụkwa mba unu ụmụ ya,” 14nʼihi ya, unu agaghịkwa eri ndị mmadụ ọzọ, maọbụ napụ mba unu ụmụ ha, ka Nna anyị, Onye kachasị ihe niile kwupụtara. 15Agaghịkwa m ekwe ka unu nụ nkọcha nke mba ndị ọzọ ọzọ; unu agaghịkwa ebu ihere nke ndị mmadụ maọbụ mee ka mba unu sụọ ngọngọ, ka Nna anyị, Onye kachasị ihe niile kwupụtara.
16Okwu Nna anyị rutere m ntị, sị:
17“Nwa nke mmadụ, mgbe ụlọ Izrel bi nʼala nke aka ha, ha ji ụzọ ha na omume ha merụọ ala ahụ. Ụzọ ha nʼihu m dị ka adịghị ọcha nke nwanyị nọ nʼoge nsọ ya. 18Ya mere, awụkwasịrị m ha ọnụma m nʼihi ọbara ha wụsịrị nʼala ahụ, na nʼihi na ha ji arụsị ha merụọ ya. 19Achụsasịrị m ha nʼetiti mba niile, fesasịa ha nʼala dị iche iche; ekpere m ha ikpe dịka ụzọ ha na omume ha si dị.’ 20Ma nʼetiti mba ndị ahụ ha gakwuru, ha merụrụ aha nsọ m, nʼihi na e kwuru banyere ha sị, ‘Ndị a bụ ndị Onyenwe anyị, ma ha hapụrụ ala ya.’ 21Ma aha nsọ m dị m oke mkpa, bụ nke ndị Izrel merụrụ nʼetiti mba ndị ahụ ha gakwuru.
22Ya mere, gwa ụlọ Izrel sị: Nna anyị, Onye kachasị ihe niile sịrị: “Ọ bụghị nʼihi unu ka m na-aga ime nke a, ụlọ Izrel, kama ọ bụ nʼihi aha nsọ m, bụ nke unu merụrụ nʼetiti mba ndị ahụ unu gakwuru. 23Aga m eme ka aha m dị ukwuu dị nsọ—aha e merụrụ nʼetiti mba niile, bụ nke unu merụrụ nʼetiti ha. Mgbe ahụ, mba niile ga-amata na mụ onwe m bụ Nna, ka Nna anyị, Onye kachasị ihe niile kwupụtara, mgbe m ga-egosipụta onwe m dị nsọ site nʼunu nʼihu ha.
24“Aga m esite na mba niile kpọpụta unu, chịkọta unu site nʼala niile, kpọbata unu nʼala nke aka unu. 25Aga m efesa unu mmiri dị ọcha, unu ga-adịkwa ọcha; aga m asachapụ unu site nʼadịghị ọcha unu niile na site nʼarụsị unu niile. 26Aga m enye unu obi ọhụrụ, tinyekwa mmụọ ọhụrụ nʼime unu. Aga m ewepụ obi nkume ahụ site nʼanụ ahụ unu ma nye unu obi anụ arụ. 27Aga m etinye Mmụọ m nʼime unu, mee ka unu na-agbaso ụkpụrụ m, unu ga-edebekwa iwu m ma na-eme ha. 28Unu ga-ebi nʼala ahụ m nyere nna nna unu ha; unu ga-abụ ụmụ m, mụ onwe m ga-abụkwa Nna unu. 29Aga m azọpụta unu site nʼadịghị ọcha unu niile. Aga m akpọ ọka ka ọ bịa, mee ka ọ baa ụba, agaghịkwa m eme ka ụnwụ dakwasị unu. 30Aga m eme ka mkpụrụ osisi na ihe ubi baa ụba, ka unu ghara ịta ahụhụ ihere nke ụnwụ nʼetiti mba niile ọzọ.
31“Mgbe ahụ, unu ga-echeta ụzọ ọjọọ unu na omume unu nke na-adịghị mma, unu ga-akpọkwa onwe unu asị nʼihi mmehie unu na ihe arụ unu niile.’ 32Ọ bụghị nʼihi unu ka m na-eme nke a, ka Nna anyị, Onye kachasị ihe niile kwupụtara—matanụ nke a. Ka ihere mee unu, mekwaa unu ihu ọjọọ nʼihi ụzọ unu, ụlọ Izrel.
33Nna anyị, Onye kachasị ihe niile sịrị: “Nʼụbọchị m ga-eme unu ka unu dị ọcha site na mmehie unu niile, aga m eme ka e biri nʼobodo ndị ahụ ọzọ, wughachikwa mkpọmkpọ ebe ndị ahụ. 34A ga-akọ ala ahụ tọgbọrọ nʼefu, kama ịtọgbọ nʼefu nʼihu ndị niile na-agafe agafe. 35Ha ga-asị, ‘Ala a tọgbọrọ nʼefu aghọọla dịka ogige Edin; obodo ndị ahụ dara mbibi, tọgbọrọ nʼefu, nke a kwaturu akwatu, bụzikwa ebe e wusiri ike, bụrụkwa ebe ndị mmadụ bi.’ 36Mgbe ahụ, mba ndị fọdụrụ gbara unu gburugburu ga-amata na mụ onwe m bụ Nna wughachiri ihe e tiwaara etiwa, kụọkwa ihe ọkụkụ nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu. Mụ onwe m bụ Nna unu ekwuola ya, aga m emekwa ya.’
37Nna anyị, Onye kachasị ihe niile sịrị: “Nke a kwa ka m ga-ekwe ka ụlọ Izrel rịọ m ka m mee ha: Aga m eme ka ndị ha baa ụba dịka igwe atụrụ. 38Dịka igwe atụrụ e ji achụ àjà, dịka igwe atụrụ nke Jerusalem nʼoge mmemme ya ndị a kara aka, otú ahụ ka obodo ndị ahụ dara mbibi ga-eju na igwe ndị mmadụ. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Nna unu.”