Ikpe Ziri Ezi nʼỌnụ Ụzọ Ama
Ịpị ihe nwere oke iri itiri anọ ka a ghara imenye nwanne gị ihere nʼihu gị. A naghị ekechi ehi ọnụ mgbe ọ na-azọcha ọka. Nwanne di nwanyị di ya nwụrụ na-echekwa aha nwanne ya nwụrụ anwụ, ma ọ bụghị ya, a na-emenye nwanne ahụ ihere nʼọnụ ụzọ ama. Ihe ọtụtụ na ihe nleta ga-abụrịrị nke eziokwu.
25 1Ọ bụrụ na ndị ikom esee okwu ma gaa nʼụlọ ikpe, ndị ikpe na-ekpe ikpe nʼetiti ha ga-agụ onye aka ya dị ọcha na onye ikpe mara, 2ọ bụrụ na onye ahụ ikpe mara kwesịrị ịta ihe otiti, onye ọkaikpe ga-eme ka o dinaa ala, tiekwa ya ihe nʼihu ya, na-agụ ọnụ otiti kwesịrị njọ o mere. 3Iri otiti anọ, ọ gaghị akarị; ọ bụrụ na o tie ya ihe karịa nke a, nwanne gị ga-ewetara onwe ya ihere nʼihu gị.
4Ị gaghị eke ehi ọnụ mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka.
5Ọ bụrụ na ụmụnne ibe ha ebikọọ ọnụ, otu nʼime ha anwụọ nʼamụtaghị nwa nwoke, nwunye onye nwụrụ anwụ agaghị alụ onye ọbịa nʼezi. Nwanne di ya ga-alụ ya, dinakwuru ya, meekwa ya ọrụ nwanne di kwesịrị. 6Nwa mbụ ọ ga-amụ ga-ewere aha nwanne ahụ nwụrụ anwụ, ka a ghara ihichapụ aha ya nʼIzrel.
7Ọ bụrụ na nwoke ahụ achọghị ịlụ nwunye nwanne ya, nwunye ahụ ga-agbagoro ndị okenye nọ nʼọnụ ụzọ ama sị, “Nwanne di m jụrụ iwelite aha nwanne ya nʼIzrel; ọ chọghị ime ọrụ nwanne di nʼebe m nọ.” 8Mgbe ahụ ndị okenye obodo ya ga-akpọ ya gwa ya okwu. Ọ bụrụ na o guzosie ike na-asị, “Achọghị m ịlụ ya,” 9nwunye nwanne ya ga-abịakwute ya nʼihu ndị okenye, dọpụ akpụkpọ ụkwụ ya nʼụkwụ ya, gbụsa ya ọnụ mmiri nʼihu, sịkwa, “Otu a ka a na-eme nwoke jụrụ iwuli ụlọ nwanne ya.” 10A ga-akpọkwa ikwu ya nʼIzrel “Ụlọ onye a dọpụrụ akpụkpọ ụkwụ ya.”
11Ọ bụrụ na ndị ikom abụọ alụọ ọgụ, nwunye otu nʼime ha abịa ịnapụta di ya nʼaka onye na-eti ya ihe, o setịpụ aka ya jide ya nʼihe nzuzo ya, 12mgbe ahụ ị ga-egbupụ aka ya. Emekwala ya ebere.
13Ị gaghị enwe nʼakpa gị ụdị ihe ọtụtụ abụọ dị iche iche, nke buru ibu na nke ntakịrị. 14Ị gaghị enwe nʼụlọ gị ụdị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ abụọ dị iche iche, nke buru ibu na nke ntakịrị. 15Nwee ihe ọtụtụ zuru ezu, nke ziri ezi; nwee ihe ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu, nke ziri ezi, ka ụbọchị gị wee dị ogologo nʼala ahụ Nna gị na-enye gị. 16Nʼihi na onye ọbụla na-eme ụdị ihe ndị a, onye ọbụla na-eme ihe nʼụzọ aghụghọ, bụ ihe arụ nʼebe Nna gị nọ.
17Cheta ihe Amalek mere gị nʼụzọ mgbe ị si nʼIjipt na-apụta, 18otu o si zute gị nʼụzọ, bipụ ndị niile dara nʼazụ gị mgbe ike gwụrụ gị, ị daakwara mba, o nwekwaghị egwu Nna anyị nʼobi. 19“Mgbe Nna gị ga-eme ka i zuru ike nʼaka ndị iro gị niile gbara gị gburugburu, nʼala ahụ Nna gị na-enye gị ka ọ bụrụ ihe nketa ị ga-enweta, hichapụ ncheta Amalek nʼokpuru eluigwe. Echefukwala.”