Aka Nna Anyị Megidere Ndị Filistia
Ndị Filistia doro igbe Nna anyị ha dọọrọ n'agha n'akụkụ Dagọn, ugboro abụọ ha hụkwara chi ha ka ọ dara n'ihu ya n'ala; nke ugboro abụọ, isi ya na aka ya abụọ gbajiri n'ọnụ ụzọ. Etuto na ụjọ na-eso igbe ahụ site n'Ashdọd ruo Gat ruo Ekrọn, ruo mgbe obodo ọ bụla rịọrọ ka a napụ ha ya.
5 1Ndị Filistia adọtala igbe Nna anyị, ha sitekwara nʼEbenịza buru ya bịa Ashdọd. 2Ndị Filistia weere igbe Nna anyị, bubata ya nʼime ụlọnsọ Dagọn, dọba ya nʼakụkụ Dagọn. 3Mgbe ndị Ashdọd biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, lee Dagọn ka ọ dara kpuo ihu nʼala nʼihu igbe Nna anyị. Ha weere Dagọn kwụghachi ya nʼọnọdụ ya. 4Mgbe ha biliri nʼisi ụtụtụ echi ya ọzọ, lee Dagọn ka ọ dakwara ọzọ kpuo ihu nʼala nʼihu igbe Nna anyị. Nʼoge a, isi ya na aka ya abụọ gbajiri tọgbọ nʼọnụ ụzọ; ọ bụ naanị ahụ ya fọdụrụ. 5Ọ bụ ya mere, ruo taa, ndị nchụaja Dagọn na ndị niile na-abanye nʼụlọnsọ Dagọn dị nʼAshdọd anaghị azọnye ụkwụ nʼọnụ ụzọ Dagọn. 6Aka Nna anyị dakwasịrị ndị Ashdọd ike. O mebiri ha, tiekwa ha ihe otiti nke etuto—Ashdọd na mpaghara gbara ya gburugburu. 7Mgbe ndị ikom Ashdọd hụrụ nke a, ha sịrị, “Igbe Chineke nke Izrel agaghị anọnyere anyị; aka ya dị arọ nʼahụ anyị na nʼahụ Dagọn chi anyị.” 8Ha kpọkọtara ndị ọchịchị Filistia niile jụọ sị, “Gịnị ka anyị ga-eme igbe Chineke nke Izrel?” Ha zara sị, “Bufenụ igbe Chineke nke Izrel gaa Gat.” Ya mere ha buuru igbe Chineke nke Izrel gaa ebe ahụ.
9Mgbe ha buuru ya gaa, aka Nna anyị megidekwara obodo ahụ, na-akpata oke ọgbaaghara. O tiri ndị obodo ahụ ihe, ma ndị nta ma ndị ukwu, etuto wapụtakwara ha nʼahụ. 10Ya mere ha zigara igbe Nna anyị na Ekrọn. Ma mgbe ọ na-erute, ndị Ekrọn tiri mkpu sị, “Ha ebutere anyị igbe Chineke nke Izrel iji gbuo anyị na ndị anyị!”
11Ya mere ha kpọkọtara ndị ọchịchị Filistia niile sị, “Zilaganụ igbe Chineke nke Izrel; ka ọ laghachi nʼọnọdụ ya, ka ọ ghara igbu anyị na ndị anyị.” Nʼihi na oke ọgbaaghara na-eweta ọnwụ ejidela obodo ahụ niile; aka Nna anyị dịkwara arọ nke ukwuu nʼebe ahụ. 12Ndị na-anwụghị anwụ ka etuto tiri, mkpu enyemaka nke obodo ahụ rịgooro ruo nʼeluigwe.