Ụmụ Kora
Nye onyeisi ndị ọbụ abụ. Abụ Ọma nke ụmụ Kora.
Nna anyị agbagharala ndị a na mbụ, ha na-arịọkwa ya ka o mee ya ọzọ kama ịnọgide na-ewe iwe ruo ọtụtụ ọgbọ. Azịza ha nụrụ bụ udo, na otu ihe oyiyi: ịhụnanya na ikwesị ntụkwasị obi na-ezute, ezi omume na udo na-esusu ọnụ, ala na-amịpụta ihe ubi ya.
85 1I gosiri ala gị ihuọma, Nna anyị; i weghachitere ọ̀gànìrù Jekọb. 2I gbaghaara ndị gị ikpe ọmụma ha; i kpuchiri mmehie ha niile. 3I wepụrụ iwe gị niile; i chigharịrị site nʼoke iwe gị nke dị ọkụ.
4Weghachite anyị, Nna anyị, bụ nzọpụta anyị; wepụ iwe gị megide anyị. 5Ị ga-ewe anyị iwe ruo mgbe ebighị ebi? Ị ga-eme ka iwe gị dịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ? 6Ị gaghị emeghachi anyị ndụ ọzọ, ka ndị gị wee ṅụrịa ọṅụ nʼime gị? 7Gosi anyị ịhụnanya ọgbụgba ndụ gị, Nna anyị, ma nye anyị nzọpụta gị.
8Ka m nụrụ ihe Nna anyị ga-ekwu, nʼihi na ọ ga-ekwuru ndị ya okwu udo, bụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ya; ma ka ha ghara ịlaghachi nʼụzọ nzuzu ha. 9Nʼezie, nzọpụta ya dị nso nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, ka ebube wee biri nʼala anyị. 10Ịhụnanya ọgbụgba ndụ na ikwesị ntụkwasị obi ezukọtala; ezi omume na udo esutula ọnụ. 11Ikwesị ntụkwasị obi na-epupụta site nʼala, ezi omume na-esikwa nʼeluigwe eledata anya. 12Ee, Nna anyị ga-enye ihe dị mma, ala anyị ga-amịpụtakwa ihe ubi ya. 13Ezi omume ga-aga nʼihu ya ma dozie ụzọ maka nzọụkwụ ya.