Ekpere Onye Aka Ya Dị Ọcha
Ekpere Devid.
Devid na-arịọ ka e gee ya ntị dịka onye aka ya dị ọcha, onye e nyochara obi ya n'abalị, ụkwụ ya adịghịkwa amị amị. Ebe ọdụm na-ezo onwe ya na-achụ ya, ọ na-arịọ ka e chebe ya dịka nwa anya, ọ na-elekwa anya gafere ndị iro ya ruo n'ịhụ ihu Nna ya.
17 1Nụrụ ikpe ziri ezi, Nna m; ṅaa ntị nʼakwa m; gee ntị nʼekpere m nke si nʼegbugbere ọnụ na-enweghị aghụghọ. 2Ka mkpebi ikpe m si nʼihu gị pụta; ka anya gị hụ ihe ziri ezi.
3I nyochaala obi m, i leruola m anya nʼabalị, ị nwaleela m ma ọ dịghị ihe ọjọọ ị chọtara; ekpebiela m na ọnụ m agaghị emehie. 4Banyere omume nke ụmụ mmadụ, site nʼokwu egbugbere ọnụ gị, edebeela m onwe m pụọ nʼụzọ ndị na-eme ihe ike. 5Nzọụkwụ m ejidesiela nʼụzọ gị ike; ụkwụ m adaghị ada.
6Ana m akpọku gị, nʼihi na ị ga-aza m, Nna m; gee m ntị; nụrụ okwu m. 7Gosi ọrụ ebube nke ịhụnanya ọgbụgba ndụ gị, gị onye na-eji aka nri gị zọpụta ndị na-agbaba nʼime gị izere ndị iro ha. 8Chebe m dịka mkpụrụ anya gị; zoo m nʼokpuru ndò nku gị, 9site nʼaka ndị ajọ omume na-awakpo m, ndị iro m na-achọ ndụ m, bụ ndị gbara m gburugburu.
10Ha emechiela obi ha siri ike; ọnụ ha na-ekwu okwu nganga. 11Ha achọpụtala anyị, ugbu a ha na-agba anyị gburugburu; ha na-elegide anya ịtụda anyị nʼala. 12Ọ dị ka ọdụm agụụ na-agụ ịdọwa anụ ya, dị ka nwa ọdụm makpuru nʼebe nzuzo.
13Bilie, Nna m! Chee ya ihu, tụda ya nʼala! Jiri mma agha gị napụta ndụ m nʼaka ndị ajọ omume, 14site nʼaka gị, Nna m, napụta m nʼaka ndị dị otú a—ndị ụwa nke a bụ ndị ụgwọ ọrụ ha dị na ndụ a. I ji ihe i chekwara mejupụta afọ ha; ụmụ ha nwere ọtụtụ ihe, ha na-ahapụkwara ụmụntakịrị ha ihe ha nwere hiri nne.
15Ma mụ onwe m, aga m ahụ ihu gị nʼezi omume; mgbe m tetara, afọ ga-eju m ịhụ oyiyi gị.