Iwughachi Ụlọ Nna anyị
Hagai na Zekaraya kpaliri Zerubabel na Jeshua, ha wee malite iwu ọzọ. Gọvanọ Tatenai chọrọ ịma onye nyere ha ikike. Ma anya Nna ha dị n'ahụ ndị okenye, ya mere ọ dịghị onye kwụsịrị ha. N'akụkọ Tatenai degaara Darịọs, naanị ihe ọ rịọrọ bụ ka a chọgharịa n'akwụkwọ ochie eze.
5 1Mgbe ahụ, ndị amụma bụ Hagaị na Zekaraya nwa Ido buuru ndị Juu nọ na Juda na Jerusalem amụma, nʼaha Nna anyị, bụ Chineke Izrel, onye nọ nʼelu ha. 2Mgbe ahụ, Zerubabel nwa Shialtiel na Jeshua nwa Jozadak biliri malite iwughachi ụlọ Nna anyị nʼime Jerusalem, ndị amụma nke Nna anyị nọnyeere ha, na-akwado ha.
3Mgbe ahụ, Tatenaị, bụ gọvanọ nke Ofe Osimiri, na Sheta-bozenaị, na ndị otu ha, bịara jụọ sị, “Onye nyere unu ikike iwu ụlọ a na imecha ihe owuwu a?” 4Ha jụkwara sị, “Gịnị bụ aha ndị ikom ahụ na-ewu ụlọ a?” 5Ma anya Nna ha na-elekọta ndị okenye ndị Juu, ya mere ọ dịghị onye gbochiri ha ruo mgbe okwu ahụ ruru Daraịọs, azịza e dere ede wee lọghachi.
Akwụkwọ Ozi e degaara Eze Daraịọs
6Nke a bụ ihe edepụtara nʼakwụkwọ ozi ahụ Tatenaị, bụ gọvanọ nke Ofe Osimiri, na Sheta-bozenaị, na ndị ọrụ ibe ya nọ nʼOfe Osimiri, zigaara Eze Daraịọs. 7Ha zigaara ya akụkọ nke sị: Nye Eze Daraịọs, udo zuru ezu.
8Ka ọ mara gị, eze: anyị gara na mpaghara Juda, nʼụlọ Chineke ukwu ahụ. A na-eji nnukwu nkume ewu ya, a na-atụkwasịkwa osisi nʼahụ mgbidi ya. Ọrụ ahụ na-aga nʼihu site nʼịgbasi mbọ ike, na-agakwa nke ọma nʼaka ha. 9Ya mere, anyị jụrụ ndị okenye ahụ sị, “Onye nyere unu ikike iwu ụlọ a na imecha ihe owuwu a?” 10Anyị jụkwara aha ha, ka anyị mee ka ị mara, ka anyị dekwaa aha ndị ndu ha. 11Ha zara anyị sị, “Anyị bụ ndị ohu Nna anyị, bụ Chineke nke eluigwe na ụwa, anyị na-ewughachikwa ụlọ ahụ nke otu eze ukwu Izrel wuru ma wuchaa ọtụtụ afọ gara aga. 12Ma nʼihi na nna nna anyị ha kpasuru Nna anyị iwe, bụ Chineke nke eluigwe, o nyefere ha nʼaka Nebukadneza onye Babilọn, bụ eze Babilọn, onye bibiri ụlọ a ma dọkpụrụ ndị ahụ nʼagha gaa Babilọn. 13Ma nʼafọ mbụ nke Saịrọs eze Babilọn, Saịrọs bụ eze nyere iwu ka e wughachi ụlọ a nke Nna anyị. 14Saịrọs bụ eze sitekwara nʼụlọnsọ Babilọn weta ngwongwo ọlaedo na ọlaọcha nke ụlọ Nna anyị, nke Nebukadneza siri nʼụlọnsọ dị na Jerusalem wepụ bugaa nʼụlọnsọ Babilọn. O nyere ha otu onye aha ya bụ Sheshbaza, onye o mere gọvanọ, 15na-asị ya, ‘Were ngwongwo ndị a, gaa dọba ha nʼụlọnsọ Jerusalem, ka e wughachikwa ụlọ Chineke nʼọnọdụ ya.’ 16Mgbe ahụ, Sheshbaza a bịara tọọ ntọala ụlọ Nna anyị na Jerusalem; site na mgbe ahụ ruo ugbu a, a nọ na-ewu ya, ọ gwụbeghị emecha.”
17Ya mere, ọ bụrụ na ọ masịrị eze, ka e nyochaa nʼakwụkwọ ndekọ eze dị na Babilọn, ịhụ ma Eze Saịrọs ọ nyere iwu ka e wughachi ụlọ Chineke a dị na Jerusalem. Mgbe ahụ, ka eze zitere anyị mkpebi ya banyere okwu a.