Pita Na-Edegara Ndị Gbasasịrị Akwụkwọ
Agbamume nye ndị Kraịst na-ata ahụhụ n'ihi okwukwe ha, na-echetara ha olileanya dị ndụ ha na onye ha bụ dịka ndị Nna anyị họọrọ.
1 1Pita, onye ozi Jisọs Kraịst, na-edegara ndị a họpụtara họpụta, bụ ndị bi nʼala ọzọ, ndị gbasasịrị agbasasị na Pọntus, Galeshia, Kapadoshia, Eshia, na Bitinia akwụkwọ. 2Ndị a họpụtara dịka Nna anyị si mara ha na mbụ, ndị e mere nsọ site nʼaka Mmụọ Nsọ, ka ha rube isi nye Jisọs Kraịst, ka e werekwa ọbara ya fesa ha: ka amara na udo baara unu ụba.
A Mụ Baa nʼOlileanya Dị Ndụ
3Ngọzi dịrị Nna anyị, Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst: site nʼoke ọmịiko ya, o mere ka a mụọ anyị ọhụrụ baa nʼolileanya dị ndụ, site na mbilite nʼọnwụ nke Jisọs Kraịst, 4baa nʼihe nketa nke na-apụghị ire ure, maọbụ merụọ, maọbụ kpọnwụọ, nke e debeere unu nʼeluigwe, 5bụ ndị a na-echekwa site nʼokwukwe, site nʼike Nna anyị, ruo mgbe a ga-ekpughe nzọpụta ahụ nke dị njikere nʼoge ikpeazụ. 6Nʼime nke a ka unu na-aṅụrị ọṅụ dị ukwuu, ọ bụ ezie na ugbu a, nwa oge nta, ọ dị mkpa ka obi jọọ unu njọ site nʼọnwụnwa dị iche iche. 7Ihe ndị a bịara ka okwukwe unu—nke a nwalere ma chọpụta na ọ bụ eziokwu, nke dị oke ọnụ ahịa karịa ọlaedo nke a nụchara nʼọkụ ma nke na-ala nʼiyi—wetara otuto, ebube, na nsọpụrụ mgbe Jisọs Kraịst ga-apụta. 8Ọ bụ ezie na unu ahụtụbeghị ya anya, unu hụrụ ya nʼanya; ọ bụ ezie na unu anaghị ahụ ya ugbu a, unu na-atụkwasị ya obi, na-aṅụrị ọṅụ nke okwu na-apụghị ịkọwa, ọṅụ jupụtara nʼebube, 9nʼihi na unu na-anata ihe okwukwe unu bu nʼisi, bụ nzọpụta nke mkpụrụobi unu.
10Ndị amụma bụ ndị kwuru banyere amara ahụ a kwadooro unu nyochara ma chọsie nzọpụta a ike, 11na-achọpụta oge na ọnọdụ nke Mmụọ nke Kraịst nọ nʼime ha gosiri, mgbe o buru amụma banyere ahụhụ Kraịst ga-ata na ebube ndị ga-eso ha. 12E kpughere ha ya: ọ bụghị onwe ha ka ha na-ejere ozi, kama ọ bụ unu, mgbe ha kwuru banyere ihe ndị a nke a kọọrọ unu ugbu a site nʼaka ndị zisaara unu oziọma site na Mmụọ Nsọ nke esi nʼeluigwe zite. Ọ bụladị ndị mmụọ ozi na-achọsi ike ileba anya nʼihe ndị a.
A Kpọrọ Unu Ka Unu Dị Nsọ
13Ya mere, jikerenụ uche unu maka ọrụ, nọrọkwanụ nʼuche zuru oke, tụkwasịnụ olileanya unu kpamkpam nʼamara ahụ a ga-ewetara unu mgbe a ga-ekpughe Jisọs Kraịst. 14Dịka ụmụ na-erube isi, ekwenụla ka agụụ ọjọọ ndị unu gbasoro na mbụ nʼoge amaghị ihe unu kpụọ unu. 15Kama dịka onye ahụ kpọrọ unu si dị nsọ, dịnụ nsọ nʼihe niile unu na-eme;
16nʼihi na e dere ya, sị, “Dịrịnụ nsọ, nʼihi na mụ onwe m dị nsọ.”
17Ebe ọ bụ na unu na-akpọku Nna onye na-ekpe onye ọbụla ikpe dịka ọrụ ya si dị, na-eleghị mmadụ anya nʼihu, biri oge mbịa unu nʼụwa a nʼegwu na nsọpụrụ. 18Unu maara na ọ bụghị ọlaọcha na ọlaedo—bụ ihe na-emebi emebi—gbapụtara unu site na ndụ efu ahụ nke e si nʼaka nna nna unu nyefee unu, 19kama ọ bụ ọbara Kraịst dị oke ọnụ ahịa, dịka nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ maọbụ nkọ. 20A họpụtara ya tupu a tọọ ntọala ụwa, e kpughekwara ya nʼoge ikpeazụ ndị a nʼihi unu. 21Site nʼaka ya ka unu ji kwere na Nna anyị, onye mere ka o si nʼọnwụ bilie ma nye ya ebube, ka okwukwe unu na olileanya unu wee dịrị na Nna anyị.
22Ebe unu site nʼirube isi nye eziokwu ahụ mee ka mkpụrụobi unu dị ọcha, nke wetara ịhụnanya ụmụnna nke na-enweghị aghụghọ, hụrịtanụ ibe unu nʼanya nke ukwuu site nʼobi dị ọcha. 23Nʼihi na a mụghachịrị unu ọzọ—ọ bụghị site na mkpụrụ na-emebi emebi kama site na nke na-adịghị emebi emebi—site nʼokwu Nna anyị nke dị ndụ ma na-adịgide. 24Nʼihi na, “Mmadụ niile dịka ahịhịa, ebube ha niile dịkwa ka okoko osisi nke ọhịa; ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-adakwa, 25ma okwu Nna anyị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” Nke a bụkwa okwu ahụ e kwusaara unu.