Raba Daa, Devid Ekpukwasịkwa Okpueze nʼIsi
Joab na-alụ agha na Raba ebe Devid nọdụrụ nʼụlọ, ọ bụ ezie na nʼebe a eze ahụ bịarutere iwere okpueze ahụ. Mgbe ahụ ọgụ nta atọ megide ndị dike Filistia buru ibu, tinyere nwoke nwere mkpịsị aka isii, onye kwara Izrel emo, nke nwa nwanne Devid gburu.
20 1Nʼoge afọ ọhụrụ, bụ mgbe ndị eze na-apụ ibu agha, Joab duuru ndị agha pụọ, bibie ala ndị Amọn, mgbe ahụ ọ bịara gba Raba gburugburu, ma Devid nọdụrụ na Jerusalem. Joab tiri Raba ihe, kwatuokwa ya. 2Devid wepụrụ okpueze ahụ nʼisi eze ha. Ọ dị ihe dịka pọụnd ọlaedo iri asaa na ise nʼarọ, e jikwa nkume dị oke ọnụ ahịa chọọ ya mma, e kpukwasịrị ya nʼisi Devid. O bukwara ọtụtụ ihe nkwata nʼagha site nʼobodo ahụ pụọ. 3O kpọpụtara ndị bi nʼime ya, mee ka ha jiri nkwọ, na ihe igwe e ji egwu ala, na anyụike rụọ ọrụ. Devid mesokwara obodo niile nke ndị Amọn otu ahụ. Mgbe ahụ, Devid na ndị agha ya niile laghachiri na Jerusalem.
Ndị Dike Ahụ Dara nʼAka Izrel
4Mgbe nke a gasịrị, agha dapụtara nʼetiti ha na ndị Filistia na Geza. Nʼoge ahụ, Sibekai onye Husha gburu Sipai, onye so nʼụmụ ụmụ Rafa, e wedakwara ndị Filistia nʼala.
5Agha dapụtakwara ọzọ nʼetiti ha na ndị Filistia. Elhanan nwa Jaịa gburu Lahmi, nwanne Golaịat onye Gat, onye osisi ùbè ya buru ibu dịka osisi a na-akpa akwa. 6Ọzọkwa, agha dapụtara na Gat, ebe otu nwoke buru ibu nọ, onye nwere mkpịsị aka isii nʼaka ọbụla na mkpịsị ụkwụ isii nʼụkwụ ọbụla, nke dị iri abụọ na anọ nʼọnụ ọgụgụ, ya onwe ya bụkwa onye a mụụrụ Rafa. 7Mgbe ọ kwara ndị Izrel emo, Jonatan nwa Shimea, nwanne Devid, gburu ya. 8Ndị a bụ ndị a mụụrụ Rafa na Gat, ha dakwara nʼaka Devid na nʼaka ndị ohu ya.