Mkpu akwa Devid nʼime ọchịchịrị
Nye onyeisi ndị ọbụ abụ; jiri ụbọ eriri, dịka sheminit si dị. Abụ Devid.
Devid na-arịa ọrịa, egwu na-emekwa ka ọ maa jijiji, ike agwụla ya nʼiji anya mmiri na-emezu akwa ya abalị niile, ọ na-ajụkwa ruo mgbe ole. Ọ na-arụ ụka na ndị nwụrụ anwụ apụghị ito. Mgbe ahụ, ekpere ahụ tụgharịrị: Nna ya anụla ákwá ya, ọ chụpụkwa ndị iro ya.
6 1Nna m, abarala m mba nʼiwe gị, adọkwala m aka na ntị nʼọnụma gị. 2Meere m ebere, Nna m, nʼihi na adịghị m ike; gwọọ m ọrịa, Nna m, nʼihi na ọkpụkpụ m niile na-ama jijiji nʼoke egwu.
3Mkpụrụ obi m na-ama jijiji nʼoke egwu. Ma gị, Nna m—ruo ole mgbe? 4Tụghachikwute m, Nna m; napụta ndụ m. Zọpụta m nʼihi ịhụnanya ọgbụgba ndụ gị.
5Nʼihi na nʼime ọnwụ ọ dịghị ncheta gị; nʼili, onye ga-eto gị?
6Ike agwụla m nʼihi ịsụ ude m. Nʼogologo abalị niile, ana m eji anya mmiri eme ka ihe ndina m jupụta; eji m ịkwa akwa m na-ede ya mmiri.
7Anya m abụọ na-ada mba nʼihi iru ụjụ; ha na-ara ata nʼihi ndị iro m niile. 8Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu niile na-eme ihe ọjọọ, nʼihi na Nna m anụla ụda ịkwa akwa m. 9Nna m anụla arịrịọ ebere m; Nna m na-anabata ekpere m. 10Ndị iro m niile ga-eme ihere, ha ga-amakwa jijiji nʼoke egwu; ha ga-alaghachi azụ, a ga-emekwa ka ihere mee ha na mberede.