Ndị Ọchịchị Ajọ Omume
Nye onyeisi ndị na-abụ abụ: dịka ọ bụ nʼolu “Ebibila.” Nke Devid. Abụ ọlaedo.
Ebubo megide ndị ikpe na-ekesa ime ihe ike site nʼoche ikpe. A na-akpọ ha ndị nwere nsị, ndị ntị chiri dịka agwọ kobra jụrụ ige egwu onye na-achị agwọ. Ekpere ahụ na-arịọ ka a gbajie ezé ha, ka ndị mmadụ wee kwuo nʼụzọ doro anya na Nna anyị na-ekpe ụwa ikpe.
58 1Unu ndị ọchịchị, ọ bụ eziokwu na unu na-ekpebi ihe ziri ezi? Unu ọ na-ekpe ụmụ mmadụ ikpe ziri ezi? a a v1 “Ebibila” bụ aha olu abụ ahụ e ji bụọ abụ a. 2Mba, nʼobi unu ka unu na-echepụta ajọ ihe; aka unu na-ekesa ihe ike nʼala dum. 3Ndị ajọ omume kpafuru site nʼafọ nne ha; ha na-akpafu site nʼọmụmụ ha, na-ekwu okwu ụgha. 4Elo ha dị ka elo agwọ, dị ka agwọ ntị chịrị nke na-emechi ntị ya, 5ka ọ ghara ịnụ olu ndị na-akpọ agwọ maọbụ nke onye mgbaasị nwere nkà. 6O Nna anyị, gbajie eze dị nʼọnụ ha; dọpụ eze ụmụ ọdụm, Nna anyị! 7Ka ha laa nʼiyi dị ka mmiri na-asọ asọ; mgbe Nna anyị na-agba àkụ ya, ka ha bụrụ ndị a gbudara agbuda. 8Dị ka ejula nke na-agbaze ka ọ na-aga, dị ka nwa a mụrụ nwụrụ anwụ nke na-ahụghị anyanwụ ma ọlị. 9Tupu ite unu anụ ọkụ ogwu, ma ha dị ndụ ma ha na-ere ọkụ, ọ ga-ezuchapụ ha. 10Ndị ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ mgbe ha hụrụ ka e kpere ikpe ziri ezi; ha ga-asa ụkwụ ha nʼọbara ndị ajọ omume. 11Ndị mmadụ ga-ekwukwa sị, “Nʼeziokwu, ụgwọ ọrụ dịịrị ndị ezi omume; nʼeziokwu, Nna anyị na-ekpe ụwa ikpe.”