Ruo Ole Mgbe Ka Ị ga-ezo Onwe Gị?
Nye onyeisi ndị ọbụ abụ. Abụ Ọma Devid.
Ugboro anọ ka Devid jụrụ ruo mgbe ole — ruo mgbe ole ka a ga-echefu ya, ruo mgbe ole ka a ga-ezonarị ya ihu, ruo mgbe ole ka ọ ga-ebu iru újú, ruo mgbe ole ka onye iro ga-anọ ya nʼelu. Ọ dịghị ihe gbanwere nʼọnọdụ ya. Ma abụ ọma ahụ tụgharịrị nʼagbanyeghị ya nʼịhụnanya Nna ya, mechie na-abụ abụ banyere ịdị mma ọ natalarị.
13 1Ruo ole mgbe, Nna m, ka ị ga-echefu m? Ruo mgbe ebighị ebi? Ruo ole mgbe ka ị ga-ezonarị m ihu gị?
2Ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-alụ ọgụ na echiche m, na-ebukwa iru ụjụ nʼobi m ogologo ụbọchị niile? Ruo ole mgbe ka onye iro m ga-emeri m? 3Lekwasị m anya ma zaa m, Nna m; nye anya m ìhè, ma ọ bụghị otú a, m ga-arahụ ụra ọnwụ.
4Onye iro m ga-asị, “Emeriela m ya,” ndị iro m ga-aṅụrịkwa ọṅụ mgbe m dara. 5Ma mụ onwe m atụkwasịla obi nʼịhụnanya gị na-adịgide; obi m ga-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị. 6Aga m abụku Nna m abụ, nʼihi na o meela m nnọọ obiọma.