Ọlaọcha A Nụchara Ugboro Asaa
Nye onyeisi ndị ọbụ abụ. Dịka sheminith si dị. Abụ Devid.
Ndị kwesịrị ntụkwasị obi efuola, onye ọ bụla na-eji obi abụọ aja mmadụ mma nʼụzọ aghụghọ. Onye ọbụ abụ ọma ahụ rịọrọ ka e bipụ ire na-anya isi, ọ nwetakwara azịza: nʼihi na ndị nọ ná mkpa na-asụ ude, Nna anyị kwuru na ọ ga-ebili. Okwu ya bụ ọlaọcha a nụchara ugboro asaa.
12 1Nyere anyị aka, Nna anyị, nʼihi na ndị kwesịrị ntụkwasị obi agwụla; ndị na-eguzosi ike nʼeziokwu efuola nʼetiti ụmụ mmadụ. 2Onye ọbụla na-aghara onye agbata obi ya ụgha; ha ji egbugbere ọnụ na-aja mma na obi kewara abụọ na-ekwu okwu. 3Ka Nna anyị bipụ egbugbere ọnụ niile na-aja mma na ire ọbụla na-anya isi banyere ihe ukwu, 4bụ ndị na-asị, “Anyị ga-eji ire anyị merie; egbugbere ọnụ anyị bụ nke anyị—onye bụ onyenwe anyị?”
5“Nʼihi na a na-apụnara ndị ogbenye ihe ha, nʼihi na ndị nọ na mkpa na-asụ ude, aga m ebili ugbu a,” ka Nna anyị na-ekwu. “Aga m echekwa onye na-achọsi ya ike.”
6Okwu Nna anyị bụ okwu dị ọcha, ọlaọcha a nụchara nʼọkụ nke ite aja, nke a nụchara ọcha ugboro asaa. 7Gị, Nna anyị, ga-echekwa ndị nọ na mkpa; ị ga-echebe anyị site nʼọgbọ a ruo mgbe ebighị ebi. 8Ndị ajọ omume na-agagharị nʼakụkụ niile mgbe a na-ebuli ihe rụrụ arụ elu nʼetiti ụmụ mmadụ.