Mkpụrụobi m, Too Nna anyị
Abụ Devid.
Ndepụta obiọma Nna anyị nke a na-agaghị echefu — mmehie a gbaghara, ọrịa a gwọrọ, ndụ a gbapụtara n'olulu. N'etiti ya bụ ihe ntụnyere: dị ka obi nna si agakwuru ụmụ ya, otú ahụ ka obi ya si agakwuru anyị. Ọ na-echeta na anyị bụ ájá.
103 1Mkpụrụobi m, too Nna anyị; ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya!
2Mkpụrụobi m, too Nna anyị, echefula mmeso ọma ya niile, 3Onye na-agbaghara mmehie gị niile, onye na-agwọ ọrịa gị niile, 4Onye na-agbapụta ndụ gị site nʼili, onye jiri ịhụnanya na-adịgide na ọmịiko na-ekpube gị okpu, 5Onye na-eji ezigbo ihe na-eju gị afọ ogologo ndụ gị niile, nke mere na okorobịa gị na-adị ọhụrụ dịka nke ugo.
6Nna anyị na-arụ ọrụ ezi omume na ikpe ziri ezi nye ndị niile a na-emegbu.
7O gosiri Mosis ụzọ ya niile, gosikwa ụmụ Izrel ọrụ ya niile. 8Nna anyị bụ onye ọmịiko na onye amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọọsọ, onye ịhụnanya na-adịgide ya bara ụba. 9Ọ gaghị ebo ebubo mgbe niile, ọ gaghịkwa ejide iwe ya ruo mgbe ebighị ebi. 10Ọ naghị emeso anyị dịka mmehie anyị si dị, ọ naghịkwa akwụ anyị ụgwọ dịka njehie anyị si dị. 11Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ịhụnanya na-adịgide ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ; 12dịka ọwụwa anyanwụ si anya na ọdịda anyanwụ, otu a ka Nna anyị si wepụ mmehie anyị nʼebe anyị nọ.
13Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ, otu a ka Nna anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ. 14Nʼihi na ọ maara otu e si kee anyị; o na-echeta na anyị bụ aja. 15Ụbọchị mmadụ dị ka ahịhịa; ọ na-etopụta dịka ifuru nke ọhịa; 16nʼihi na ifufe na-afekwasị ya, ọ dịghịzi adị, ebe ọ nọ anaghịzi echeta ya ọzọ. 17Ma ịhụnanya na-adịgide nke Nna anyị na-adị site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, ezi omume ya na-adịkwara ụmụ ụmụ ha, 18nye ndị na-edebe ọgbụgba ndụ ya, na-echetakwa idebe iwu ya niile.
19Nna anyị emeela ka ocheeze ya guzosie ike nʼeluigwe, alaeze ya na-achịkwa ihe niile.
20Toonu Nna anyị, unu ndị mmụọ ozi ya, unu ndị dị ike na-eme okwu ya, na-erube isi nʼokwu ya niile! 21Toonu Nna anyị, unu usuu ndị agha ya niile, unu ndị ohu ya na-eme uche ya! 22Toonu Nna anyị, ọrụ aka ya niile, nʼebe niile nke alaeze ya. Mkpụrụobi m, too Nna anyị!