Aja Ikpe Ọmụma
Ịghọgbu onye agbataobi gbasara ihe o nyere gị idebe maọbụ ihe ị chọtara bụ ekwesighị ntụkwasị obi nye Nna gị: kwụghachi ya nke ọma, gbakwunye otu ụzọ nʼụzọ ise, mgbe ahụ wete ebule ahụ. Ọkụ dị nʼelu ebe ịchụaja agaghị anyụ anyụ, e dokwara oke ndị nchụaja nʼonyinye ọka na nʼaja mmehie.
6 1Nna anyị gwara Mosis okwu, sị:
2“Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla emehie, ghara ikwesị ntụkwasị obi nye Nna unu, site nʼịghọgbu onye agbata obi ya banyere ihe e nyefere ya idebe, maọbụ ihe o buru nʼaka dịka nkwa, maọbụ ihe e zuru nʼohi, maọbụ site nʼịghọgbu ya, 3maọbụ ọ bụrụ na ọ chọta ihe furu efu ma ghaa ụgha banyere ya, na-aṅụ iyi ụgha—ihe ọbụla nke mmadụ ji emehie. 4Mgbe o mehiere ma bụrụ onye ikpe mara, ọ ga-eweghachi ihe ọ zuru nʼohi, maọbụ ihe ọ napụrụ site nʼike, maọbụ ihe e nyefere ya idebe, maọbụ ihe furu efu nke ọ chọtara, 5maọbụ ihe ọbụla ọ ṅụrụ iyi ụgha banyere ya, ọ ga-akwụghachi ya nʼuju, tụkwasị otu ụzọ nʼụzọ ise na ya, ma nye ya onye nwe ya nʼụbọchị ọ ga-ekwupụta ikpe ọmụma ya. 6Ọ ga-ewetara Nna unu aja ikpe ọmụma ya: ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ ụlọ, dịka ọnụahịa ị ga-eke, dịka aja ikpe ọmụma, nye onye nchụaja. 7Onye nchụaja ga-ekpuchiri ya mmehie nʼihu Nna unu, a ga-agbagharakwa ya ihe ọbụla o mere nke mere ka ikpe maa ya.”
Aja Nsure Ọkụ
8Mgbe ahụ, Nna anyị gwara Mosis okwu, sị:
9“Nye Erọn na ụmụ ya iwu, sị: Nke a bụ iwu metụtara aja nsure ọkụ. Ọ ga-anọ nʼelu ebe ịkwanye ọkụ nke ebe ịchụ aja ogologo abalị niile ruo ụtụtụ, ọkụ nke ebe ịchụ aja ga-anọgidekwa na-enwu nʼelu ya. 10Onye nchụaja ga-eyi uwe akwa ọcha ya, yirikwa uwe ime nke akwa ọcha nʼahụ ya, wezuga ntụ ọkụ fọdụrụ mgbe ọkụ repịachara aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja, ma dọba ha nʼakụkụ ebe ịchụ aja. 11Mgbe ahụ, ọ ga-eyipụ uwe ya, yiri uwe ọzọ, bufee ntụ ọkụ ahụ nʼazụ ogige ahụ, nʼebe dị ọcha. 12Ọkụ nke ebe ịchụ aja ga-anọgide na-enwu; ọ gaghị anyụ. Nʼụtụtụ niile, onye nchụaja ga-atụkwasị nkụ nʼelu ya, hazie aja nsure ọkụ nʼelu ya, surekwaa abụba nke aja udo nʼelu ya. 13A ga-eme ka ọkụ na-enwu nʼelu ebe ịchụ aja mgbe niile; ọ gaghị anyụ.
Aja Mkpụrụ Ọka
14“Nke a bụ iwu metụtara aja mkpụrụ ọka: Ụmụ Erọn ga-ewetara ya nʼihu Nna unu, nʼihu ebe ịchụ aja. 15Onye nchụaja ga-ekporo otu aka nke ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma na mmanụ nke aja mkpụrụ ọka ahụ, tinyere frankinsens ya niile, suree òkè ncheta a nʼelu ebe ịchụ aja ka ọ bụrụ isi na-esi ụtọ nye Nna unu. 16Erọn na ụmụ ya ga-eri ihe fọdụrụ; a ga-eri ya na-enweghị ihe na-eko achịcha nʼebe dị nsọ, e rie ya nʼogige nke ụlọikwuu nzukọ. 17Ejila ihe na-eko achịcha ghee ya. Enyela m ya dịka òkè ha nʼaja nri m, dịka aja mmehie na aja ikpe ọmụma; ọ bụ ihe kachasị nsọ. 18Nwoke ọbụla nʼụmụ ụmụ Erọn nwere ike iri ya—òkè na-adịgide ruo ọgbọ unu niile site nʼaja nri nke Nna unu. Ihe ọbụla metụrụ ha ga-aghọ ihe dị nsọ.”
19Nna anyị gwara Mosis, sị:
20“Nke a bụ aja Erọn na ụmụ ya ga-achụrụ Nna unu nʼụbọchị e tere ya mmanụ: ihe dị ka lita abụọ nke ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma dịka aja mkpụrụ ọka mgbe niile, ọkara nʼụtụtụ, ọkara nʼuhuruchi. 21Jiri mmanụ sie ya nʼelu efere ọkụ; wetara ya mgbe a gwekọtara ya nke ọma, chee aja mkpụrụ ọka ahụ nʼiberibe gbajiri agbaji—isi na-esi ụtọ nye Nna unu. 22Onye nchụaja ahụ e tere mmanụ, onye ga-anọchi anya ya site nʼetiti ụmụ ya, ga-esi ya—ụkpụrụ na-adịgide nʼihu Nna unu: a ga-akpọ ya ọkụ kpamkpam. 23Aja mkpụrụ ọka ọbụla nke onye nchụaja ka a ga-akpọ ọkụ kpamkpam; a gaghị eri ya.”
Aja Mmehie
24Ọzọkwa, Nna anyị gwara Mosis okwu, sị:
25“Gwa Erọn na ụmụ ya, sị: nke a bụ iwu metụtara aja mmehie: nʼihu Nna unu ka a ga-egbu ya, nʼebe a na-egbu aja nsure ọkụ; ọ bụ ihe kachasị nsọ. 26Onye nchụaja ahụ na-achụ ya maka mmehie ga-eri ya; a ga-eri ya nʼebe dị nsọ, nʼogige nke ụlọikwuu nzukọ. 27Ihe ọbụla metụrụ anụ ahụ ya ga-aghọ ihe dị nsọ. Ọ bụrụ na ọbara ya efesa nʼuwe, saa ebe ahụ ọ fesara nʼebe dị nsọ. 28Ite aja a ga-esi ya ka a ga-etiwa; ọ bụrụ na e siri ya nʼite ọla, a ga-ehichasị ya ma jiri mmiri kpọchaa ya. 29Nwoke ọbụla nʼetiti ndị nchụaja nwere ike iri ya; ọ bụ ihe kachasị nsọ. 30A gaghị eri aja mmehie ọbụla nke e wetara ọbara ya nʼime ụlọikwuu nzukọ iji kpuchie mmehie nʼEbe Nsọ ahụ; a ga-akpọ ya ọkụ.”