Ọ dị ugbu a dị ka akwụkwọ e biri ebi

Esta 6 FHB Father's Heart Bible™

NnaJisọsMmụọ
Mbelata 15% nʼihe mbụ ị zụrụ →
Akwụkwọ

Eze Sọpụrụ Mọdekaị

Ụra adịghị eze, o mere ka a gụọ akwụkwọ ndekọ, wee mata na a kwụghị Mọdekaị ụgwọ ọrụ ọ bụla. Heman, onye bịara ịrịọ ka e gbuo ya, ka a jụrụ otú a ga-esi sọpụrụ otu nwoke — ọ kọwara nrọ nke ya, mgbe ahụ ọ ghaghị iduga Mọdekaị nʼokporo ụzọ na-ekwusa ya. Ndị ụlọ ya hụrụ na ọdịda ya na-abịa.

Isi 6.

Nʼabalị ahụ, eze enweghị ike ịrahụ ụra; o nyere iwu ka e weta akwụkwọ ndekọ ahụ, nke bụ akụkọ ihe mere eme, ka a gụọra ya ya. A chọpụtara na e dere ya na Mọdekaị kpughere banyere Bigtana na Teresh, mmadụ abụọ nʼime ndị onozi eze na-eche ọnụ ụzọ, bụ ndị chọrọ igbu Eze Zerksis. Eze jụrụ sị, “Olee nsọpụrụ na ịdị ukwuu Mọdekaị nwetara maka nke a?” Ndị na-ejere ya ozi zara sị, “O nweghị ihe e meere ya.”

Eze jụrụ sị, “Onye nọ nʼogige ahụ?” Heman abatala nʼogige ezi nke ụlọeze ịrịọ ya ka o kwụba Mọdekaị nʼelu osisi nkwụgbu ahụ ọ kwadoro.

Ndị na-ejere eze ozi gwara ya sị, “Heman guzo nʼogige ahụ.” Eze sịrị, “Kpọbatanụ ya.”

Heman batara. Eze jụrụ sị, “Gịnị ka e kwesịrị imere nwoke eze nwere mmasị ịsọpụrụ?” Heman chere nʼobi ya sị, “Onye ka eze ga-enwe mmasị ịsọpụrụ karịa m?”

Ya mere, Heman gwara eze sị, “Maka nwoke eze nwere mmasị ịsọpụrụ, ka ha weta uwe eze nke eze yiworo, ịnyịnya ọ gbatụworo, na okpueze eze maka isi ya. Nye otu nʼime ndị isi ọkwa a na-asọpụrụ nke eze uwe ahụ na ịnyịnya ahụ. Ka ha yikwasị nwoke ahụ eze nwere mmasị ịsọpụrụ uwe ahụ, duru ya nʼelu ịnyịnya gafee ama obodo, kpọsaa nʼihu ya sị, ‘Otú a ka e si emere nwoke eze nwere mmasị ịsọpụrụ!’”

“Mee ngwa ngwa,” eze gwara Heman sị, “were uwe ahụ na ịnyịnya ahụ dịka ị kwuru, meere Mọdekaị onye Juu nke nọ ọdụ nʼọnụ ụzọ ama eze otú ahụ. Ewepụla ihe ọbụla nʼime ihe i kwuru.”

Heman weere uwe ahụ na ịnyịnya ahụ, yikwasị Mọdekaị uwe ahụ, duru ya nʼelu ịnyịnya gafee ama obodo, na-akpọsa nʼihu ya sị, “Otú a ka e si emere nwoke eze nwere mmasị ịsọpụrụ.”

Emesịa, Mọdekaị laghachiri nʼọnụ ụzọ ama eze, ma Heman jiri ọsọ laa nʼụlọ ya, were iru ụjụ, kpuchie isi ya. Heman kọọrọ Zeresh nwunye ya na ndị enyi ya niile ihe niile mere. Ndị ndụmọdụ ya na Zeresh nwunye ya sịrị ya, “Ebe ọ bụ na Mọdekaị, onye ị malitela ịda nʼihu ya, bụ onye Juu, ị gaghị emeri ya—nʼezie, ị ga-ada nʼihu ya.” Mgbe ha ka na-agwa ya okwu, ndị onozi eze rutere, mee ngwa ngwa duru Heman gaa oriri Esta kwadebere.