Nna Dupụrụ Devid Site nʼAgha
Ndị isi agha Filistia jụrụ iso Devid jee agha ka ọ nọ n'azụ ha, na-enyo enyo na ọ ga-atụgharịkwasị ha n'etiti agha iji nwetaghachi ihu ọma onyenwe ya mbụ. Akish, onye tụkwasịrị ya obi kpamkpam, zighachiri ya n'ụlọ, na-arịọ mgbaghara. Devid mere mkpesa, Nna anyị wee chebe ya ka ọ ghara ibuso Izrel agha.
29 1Ndị Filistia chịkọtara usuu ndị agha ha niile nʼAfek, mgbe ndị Izrel mara ikwu ha nʼakụkụ isi iyi nke dị na Jezril. 2Mgbe ndị ọchịchị Filistia ji narị narị na puku puku na-apụ nʼihu, Devid na ndị ikom ya so Akish na-aga nʼazụ.
3Ndị ọchịagha Filistia jụrụ sị, “Gịnị ka ndị Hibru a na-eme nʼebe a?” Akish gwara ha sị, “Onye a bụ Devid, ohu Sọl eze Izrel. Ọ nọnyeerela m ụbọchị ndị a—mba, afọ ndị a—site nʼụbọchị ọ gbapụrụ bịakwute m ruo ugbu a, achọtaghị m ihe ọjọọ ọbụla nʼime ya.”
4Ma ndị ọchịagha Filistia were iwe megide ya ma sị, “Zilaga nwoke ahụ nʼebe ahụ i nyere ya. Ọ gaghị eso anyị gaa agha, ma ọ bụ na ọ ga-atụgharị megide anyị nʼoge ọgụ ahụ. Olee otú ọ ga-esi nwetaghachi ihuọma nna ya ukwu karịa iji isi ndị ikom nke anyị? 5Ọ bụghị Devid a ka ha ji abụ too mgbe ha na-agba egwu, sị: ‘Sọl tigburu puku puku ndị ya, Devid tigburu iri puku kwụrụ puku ndị ya’?”
6Ya mere, Akish kpọrọ Devid ma sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, ị bụ onye na-ekwu eziokwu, ọ ga-atọkwa m ụtọ ka gị na m na-apụ na-abata nʼebe ndị agha mara ikwu. Achọtaghị m ihe ọjọọ ọbụla nʼahụ gị site nʼụbọchị ị bịakwutere m ruo ugbu a. Ma ndị ọchịchị anabataghị gị. 7Ugbu a, tụgharịa laghachi nʼudo, ka ị ghara ime ihe ọbụla ga-ewute ndị ọchịchị Filistia.”
8“Ma gịnị ka m mere?” ka Devid tụrụ mkpesa sị. “Gịnị ka ị chọtara megide ohu gị site nʼoge m bịakwutere gị ruo ugbu a, nke mere na m agaghị eje buso ndị iro onyenwe m bụ eze agha?”
9Akish gwara Devid sị, “Amaara m na ị dị mma nʼebe m nọ dịka mmụọ ozi Chineke. Ma otu ọ dị, ndị ọchịagha Filistia ekwuola sị, ‘Ọ gaghị eso anyị rigoo gaa agha.’” 10“Ya mere, bilie nʼisi ụtụtụ, gị na ndị ohu nna gị ukwu bịara soro gị; bilie nʼisi ụtụtụ ma pụọ mgbe chi bọrọ.”
11Ya mere, Devid na ndị ya biliri nʼisi ụtụtụ ịlaghachi nʼala Filistia mgbe chi bọrọ, mgbe ndị Filistia rigoro gaa Jezril.